Catholic Order of Mass in Igbo [Igbo Ordo Missae]
Here is the complete Catholic Order of Mass in Igbo language. It is used by the Catholic faithful during Holy Mass and other liturgical celebrations.
INTRODUCTORY RITES
V. N’aha Nna, na Nwa na Mmụọ Nsọ
R. Amen
V. Ka Ngọzi nke Onyenweanyị, Jesu Kristi, na ịhụnanya nke Chukwu Nna, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ na-enye, dịrị ụnụ nile.
R. Dịrịkwa mmụọ gị.
V. Ụmụnne, ka anyị kwado onwe anyị nke ọma maka nnukwu emume nke Eukarịstịa site n’ikwupụta njọ anyị.
V. & R. Ekwupụta m gwa Chineke ji ike nile, na ụnụ, ụmụnne m; na emehiela m nke ukwuu, site na echiche, na okwu na omume, na site n’ịhapụ ezi omume o kwesịrị na m ga-eme; site na mmehie m, site na mmehie m, site na mmehie m nke kacha ukwuu. Ya ka m ji arịọ Marịa dị ngọzi, Virgin ọkpụ, na ndị Mmụọma na ndị nsọ nile, na ụnụ, ụmụnne m ka ụnụ rịọrọ m Osebụrụwa Chukwu anyị arịrịọ.
V. Ka Chineke ji ike nile mere anyị ebere, gbaghara anyị njọ anyị, duruo anyị na ndụ ebebe.
R. Amen.
KYRIE
V. Onyenwanyị, mee ebere.
R. Onyenwanyị, mee ebere.
V. Kristi, mee ebere
R. Kristi, mee ebere
V. Onyenwanyị, mee ebere.
R. Onyenwanyị, mee ebere.
(OTITO) GLORIA
Otito dịrị Chineke n’elu kacha elu, n’ụwa, udo dịrị ndị mmadụ ndị ihe na-asọ Chukwu. Anyị etoo Gị, Anyị esekpuoro Gị, Anyị edoo gị ebube. Anyị ekele Gị n’ihi nnukwu ebube Gị, Osebụrụwa Chukwu, Eze nke eluigwe; Chukwu Nna ji ike nile. Onyenwanyị, Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ. Dinwenụ anyị, bụ Chukwu, Nwa-atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, mere anyị ebere, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị, Onye nọ n’aka nri Nna, mere anyị ebere. N’ihina sọ Gị dị asọ, Sọ Gị bụ Dinwenụ. Sọ Gị, O Jesu Kristi, kacha dị elu. Nyere Mmụọ Nsọ, n’ebube Chukwu nna. Amen.
LITURGY OF THE WORD
V. Okwunke Osebụrụwa
R. Ekele dịrị Chukwu
GOSPEL
BEFORE
V. Onyenwanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyerekwara mmụọ gị
V. Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị nsọ nke N. dere
R. Otito dịrị Gị, Dinwenụ anyị.
AFTER
V. Oziọma nke Osebụrụwa
R. Otito dịrị gị Kristi.
CREDO
Ekwe m n’otu Chineke, Nna ji ike nile, onye mere eligwe na ala, n’ihe dum a na-ahụ anya, na ndị anaghị ahụ anya. Ya na otu Onyenwanyị, Jesus Kristi sọ otu Nwa Chineke mụrụ: Nna mụrụ tupu ụwatụwa nile. Chukwu si na Chukwu, íhé si na íhé. Ezi Chukwu si na ezi Chukwu. A mụrụ ya amụ, emeghị eme Ya na Nna bụ otu ihe n’ihe ha ji bụrụ Chukwu, Onye esi na ya mee ihe dum. Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị. Siri n’eligwe gbadata O WERE AHỤ NA VIRGIN MARỊA SITE NA MMỤỌ NSỌ: Ọ BỤRỤ MMADỤ. A bịa kpọgbue Ya n’obe n’ihi anyị n’oge ọchịchị Pọntius Pilate. Ọ taa ahụhụ, ọ nwụọ, Elie Ya, Ma O bilitere n’ụbọchị nke atọ, ka akwụkwọ nsọ si kwu. Ọ rọgoro n’eligwe nọrọ n’aka nri Nna. Ma Ọ ga-abịaghachi ọzọ n’ebube Ya ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe; onye ọchịchị Ya enweghị njedebe. Ekwe m na Mmụọ Nsọ Onyenwanyị na-enye ndụ, onye a na-esekpuru, na-etokọdo, Ya na Nna na Nwa: Onye si na Ndị Amụma kwuo okwu. Ekwe m n’otu Nzukọ Nsọ Katọlik, na Apọstọlik. Ekwupụta m otu Baptism nke mgbaghara njọ. Ana m atụ anya mbilite n’ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa ga-abịanụ. Amen.
LITURGY OF THE EUCHARIST
V. Rịọwanụ, ụmụnne m, ka aja mụ na ụnụ bụrụ ihe ga-asọ Chukwu Nna ji ike nile ịnaranụ.
R. Onyenwanyị nara aja nke a n’aka gị maka otito na ebube aha Ya, ya na maka odịmma nke anyị, na nke ozugbo Nzukọ Ya dị asọ.
THE EUCHARISTIC PRAYER
V. Onyenwanyị nọnyere ụnụ
R. Nọnyerekwara mmụọ gị.
V. Welitenụ obi elu.
R. Anyị ewelite ha n’ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nyenụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele
R. Okwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
AFTER PREFACE
Nsọ, Nsọ, Nsọ, Osebụrụwa Chineke nke igwe ndị agha, Ebube Gị jupụtara eligwe na ala. Hosanna n’elu kacha elu. Ọ dị ngọzi bụ Onye bịara n’aha Onyenweanyị. Hosanna n’elu kacha elu.
AFTER CONSECRATION
V. Ka anyị kwupụtanụ ihe omimi nke okwukwe anyị na-eme ugbu a:
R. Anyị na-ekwupụta ọnwụ Gị, na-egosịkwa mbilite n’ọnwụ Gị, O Kristi, Wee ruo mgbe Ị ga-abịa ọzọ.
OR
R. Oge ọbụla anyị riri achịcha nke a, ñụọ iko nke a, anyị na-egosị ọnwụ Gị, O Dinwenụ ruo mgbe Ị ga-abịa ọzọ.
OR
R. Ọbụ site na obe gị na mbilite n’ọnwụ gị ka anyị ji nwere onwe anyị, O Kristi, onye Nzọpụta nke ụwa.
COMMUNION RITE
V. Ụmụnne ka anyị were ekpere nnụ Onye Nzọpụta anyị kuziri anyị were kpọkuo Chukwu Nna.
R. Nna anyị nọ n’eligwe ka otito dịrị aha Gị, ka ọchịchị Gịbiịa; ka e mee uche Gị n’ụwa ka e si eme ya n’eligwe, Nye anyị tata nri nke ụbọchị anyị. Gbaghara anyị mmehie anyịga dịka anyị si gbaghara ndị mehiere anyị, Ekwela ka anyị kwenye na nlanye ma zọpụta anyị n’ajọ ihe.
V. Zọpụta anyị, anyị na-arịọ Gi, O Osebụrụwa, n’ajọ ihe nile; were ebere nye udo n’oge nke anyị. Site na inye aka ebere Gị ka a zọpụta anyị na njọ oge nile anyị ewere gbalahụ nsogbu nile, were nchekwube dị nsọ na-atụ anya maka mbịaghachi nke Onye Nzọpụta anyị, Jesu Kristi.
R. N’ihi na ọchịchị bụ nke Gị, na ike, na otito, ebebe ebebe.
V. Onyenwanyị, Jesus Kristi, Onye gwara ndị Apostle Gị: udo ka m na-ahapụrụ ụnụ, udo nke M ka M na-enye ụnụ, elekwala anya na njọ anyị, kama lekwasị anya n’okwukwe nke Nzukọ Gị: nye ya udo na ịdịkọ n’otu mgbe nile ka uche Gị siri chọọ. Gị bụ onye dị ndụ, na-achị, ebebe, ebebe.
R. Amen.
V. Udo nke Osebụrụwa dịrị ụnụ mgbe nile.
R. Dịrịkwa mmụọ Gị.
V. Nyerịtanụ onwe ụnụ ekele nke udo
R. Udo na ịhụnanya Kristi.
AGNUS DEI
Nwa-atụrụ nke Chukwu, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, mere anyị ebere.
Nwa-atụrụ nke Chukwu, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, mere anyı ebere.
Nwa-atụrụ nke Chukwu, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, nye anyị udo.
V. Lee Nwa-atụrụ nke Chukwu! Lee Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa! Ha nwere isi ọma bụ ndị akpọrọ n’Oriri nke Nwa-atụrụ Chineke.
R. Dinwenụ m etosịghị m ka Ị bata n’ụlọ m ma kwuo sọ okwu, na mkpụrụobi m ga-adịrị.
CONCLUDING RITE
V. Onyenwanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyerekwara mmụọ gị.
V. Ka Chukwu ji ike nile gọzie ụnụ, Nna, na Nwa, na Mmụọ Nsọ.
R. Amen.
V. Missa agwụsịwo lawanụ n’udo
R. Ekele dịrị Chukwu.
RESPONSE AT THE END OF BISHOP’S
V. Ka Otito dịrị aha Osebụrụwa.
R. Site kịta dịrị gaba na ụwa ebebe.
V. Enyemaka anyị dị n’aha Dinwenụ anyị
R. Onye mere eligwe na ala
V. Ka Chukwu ji ike nile gọzie ụnụ, Nna, na Nwa, na Mmụọ Nsọ.
R. Amen.