Igbo Mass Readings for December 24 2024, Ụka Nche Etiti Abalị Krismas (Christmas Vigil) – Nke Etiti Abali.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 24 2024, Ụka Nche Etiti Abalị Krismas (Christmas Vigil) – Nke Etiti Abali .

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-7

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: E nyela anyị Nwa nwoke

Ndị na-aga n’ọchịchịịrị ahụla nnukwu ìhè. Ndị bi n’ala etiti onyinyo nke ọnwụ, anwụ achakwasala ha. Ị meela ka añụrị ha bawanye. Ị bawanyere obi ụtọ ha. Ha na-añụrị n’ihu Gị dịka ndị mmadụ si añụrị n’oge owuwe ihe ubi; na otu ndị mmadụ si añụrị n’oge ha na-eke ihe a lụtara n’agha. Dịka o siri dị n’ụbọchị Midian, Ị na-etipịasi oke ibu dagidere ya; nnukwu ibu o bu n’ubu ya; mkpara igwe ndị mmegbu bor ya.

N’ihi na akpụkpọ ụkwụ niile e ji alụ agha, na uwe nruala niile a tụrụrụ n’ọbara – ha niile abụrụla ihe a kpọrọ ọkụ. Maka na a mụtara anyị nwa; E nyere anyị Nwa nwoke. Onye e boro ike ọchịchị n’ubu. Ha a ga-akpọ Ya bụ: “Onye Ndụmọdụ dị ebube, Chineke ji ike niile, Nna dị ebighị ebi, Eze nke udo.” Ọgbọ ọchịchị Ya ebuka! Udo dị n’ime ya anaghị agwụ agwụ.

N’ihi na oche eze Devid, na ike O jiri bụrụ eze ga-akwụrụ chịm, bịakwa guzosie ike n’ezi omume na izuoke. Bido ugbu a ruo mgbe ebighị ebi, ịhụnanya dị ịtụnanya nke Onyenweanyị, Chineke nke igwe ndị agha ga-eme nke a.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 95:1-3, 11-13, Aịz. Luk 2:11

Azịza: Taa, a mụụrụ anyị Onye Nzọpụta: Aha ya bụ Kristi, Onyenweanyị.

1. Biko, kwewerenụ Dinwenụ ukwe ọhụrụ. Mba niile, kwewerenụ Dinwenụ ukwe. Bụwaranụ Ya abụ, gọzienụ aha Ya. Azịza.

2. Kwupụtanụ enyemaka Ya ụbọchị niile; Gwanụ mba niile otito Ya; Gwanụ mmadụ niile ọrụ ịtụnanya Ya. Azịza

3. Kai he niile nọ n’igwe na n’ụwa ñụrịwa; ka osisi niile na ihe nọ n’ime ya tiwe mkpu ọñụ. Azịza.

4. Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ were chịa ụwa. Ọ ga-eji ezi okwu na-ekpeziri ndị mmadụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:11-14.

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Taịtọs

Isi Okwu: E kpugheerela mba niile amara Chineke

N’ihi na Chineke egosila amara Ya  n’iwetara mmadụ niile nzọpụta. Amara ahụ na-adọ anyị aka na ntị ka anyị jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa; ka anyị na-ejide onwe anyị n’ibi ndụ anyị niile, na-adị ndụ nke eziomume, na nke ife Chineke n’ụwa nke a.

Otu a ka anyị ga-esi na-eche ụbọchị ngọzi ahụ nke anyị na-ele anya ya, nke ga-abịa mgbe ebube Chineke ahụ, nke bụkwa Onye Nzọpụta anyị Jesu Kristi, ga-apụta ìhè.

O nyere onwe Ya n’ihi anyi, ka O wee gbapụta anyị n’ajọ omume niile; meekwa anyị ndị dị ọcha, ka anyị wee bụrụ ndị nke Ya, bụrụkwa ndị ịrụ ezi ọrụ na-anụ ọkụ n’obi.

MBEKU – Luk 2:10 – 11

Alleluịa, Alleluịa:

Ewetara m ụnụ ozi nnukwu añụrị. Taa a mụụrụ anyị Onye Nzọpụta, Kristi Onyenweanyị.

Alleluịa.

OZIỌMA – 2:1-14

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Taa a mụụrụ anyị Onye Nzọpụta

N’oge ahụ, iwu si n’aka Eze ukwu bụ Siza Ọgọstọs, bịa, na a ga-agụ ụwa niile n’isi, n’isi. Nke a bụ ọgụgụ mmadụ mbụ a gụrụ, mgbe Kwịrịnọs bụ gọvanọ nke Siria. Onye ọ bụla gara deba aha ya n’akwụkwọ n’ala nna ya.

Ebe ọ bụ na Josef si n’agbụrụ na Obi Devid, ọ kpọọrọ Marịa dị ime ọmụmụ, bụ nwanyị o merela omenala n’isi ya; wee si na Nazaret nke Galili, bilie njem gawa Bethlehem nke Judia. O jere ka e dee aha ha n’ala nna ya.

Mgbe ha ruru ebe ahụ ka ime bidoro ime Marịa. O wee mụọ Nwa nwoke, nwa mbụ ya; fụọ Ya akwa ọmụgwọ; nyiwe Ya n’ulo anụmanụ, n’ihi na ụlọ eruteghị ha n’ụlọ ndị ije.

Ma ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa n’otu akụkụ ala ahụ, na-eche igwe atụrụ ha nche abalị. Mmụọọma nke Onyenweanyị pụtara wee guzo ha nso, ebube nke Onyenweanyị nwuru ha gburugburu ka ọkụ. Ụjọ wee tụọ ha.

Ma mmụọọma ahụ sịrị ha: “Ụjọ atụla ụnụ! Geenụ ntị! Ebuteere m ụnụ Oziọma nke oke ọnụ, ọnụ nke mmadụ niile ga-eketa n’ime ya. Taa, a mụụrụ ụnụ Onye Nzọpụta n’obodo Devid. Ọ bụ Kristi, Onyenweanyị. Lee akara ụnụ ga-ej amata Ya. Ụnụ ga-ahụ Nwa a fụrụ akwa ọmụgwọ, nyiwe n’ụlọ anụ.”

Na mberede igwe ndị mmụọọma nke eluigwe bịara, sonyere mmụọọma ahụ, na-eto Chineke n’ukwe, na-asị: “Otito dịrị Chineke n’elu kacha elu!

N’ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị ihe ha na-asọ Chukwu.”

Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ NA Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụtụtụ

Igbo Mass Readings for December 24 2024, Ụka Nche Etiti Abalị Krismas (Christmas Vigil) – Nke Etiti Abali.

Last Update: May 28, 2021