Connect with us
JUMIA TECH WEEK

Igbo Christmas Daily Readings

Igbo Mass Readings for December 24 2024, Ụka Nche Abalị Krismas (Nke Ụzọ Mgbede)

Published

on

Igbo Mass Readings for December 24 2024, Ụka Nche Abalị Krismas (Christmas Vigil) – Nke Ụzọ Mgbede.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 24 2024, Ụka Nche Abalị Krismas (Christmas Vigil) – Nke Ụzọ Mgbede .

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 62:1-5

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ihe Gị na-amasị Onyenweanyị

N’ihi Zayọn, agaghị m edowe ọnụ m duu. N’ihi Jerusalem, agaghị m anọ jụụ ruo mgbe ezi omume ya were anya ka chi ọbụbọ; na mgbe mmeri ya nwuru vam ka mpioọkụ.

Mba dị iche iche ga-ahụ na Jerusalem emeriela; ndị eze niile ahụkwa ebube gị. A ga-agụ gị aha ọhụrụ nke Onyenweanyị ga-eji ọnụ Ya akpọ. Ị ga-aghọ okpu eze dị ebube n’aka nke Onyenweanyị. Ị ga-abụkwa okpu eze mara oke mma n’ọba aka Chineke gị.

Advertisement

A gakwaghị akpọ gị: “Nwanyị di gbaketere azụ” ọzọ. A gaghịkwa akpọ gị: “Ala tọgbọrọ n’efu” ọzọ. Kama ihe a ga-akpọ ala gị bụ: “Obi di ya.” A ga-akpọ ala gị: “Nwanyị ya na di ya ji obi ụtọ biri” n’ihi na ihe gị masịrị Onyenweanyị. O meela ka ala gị bụrụ ala a lụrụ alụ ka nwunye.

Dịka nwokorobịa si alụrụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke, otu ahụ kwa, ka Onye ahụ na-ewulite gị elu ga-esi na-alụ gị ka nwunye. Dịka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ si añụrị ọñụ, otu ahụ kwa ka Chineke gị ga-esi añụrị na gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 88:4-5, 16-17, 27, 29. Aịz. 2.

Azịza: Onyenweanyị, aga m ekwe ukwe ịhụnanya Gị ruo mgbe ebighị ebi.

1. Mụ na onye M hụrụ n’anya a gbaala  ndụ.

Añụọrọla m nwodibo M Devid iyi sị:

Advertisement

Aga M eme ka ụmụ ụmụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

Aga M eme ka oche eze gị nọgide ruo na ndụdụgandụ niile. Azịza.

2. Onyenweanyị, ngọzi dịrị ndị maara ka e si eti mkpu ọñụ ahụ.

Ha ga na-aga ije n’ìhè nke ihu Gị.

Ha na-ebido n’ụtụtụ ñụrụ ọñụ n’aha Gị ruo n’abalị.

Advertisement

ọ bụkwa amara Gị ka ha jiri biri. Azịza.

3. Ọ ga-asị M: “Ị bụ Nna m. Chineke m,

Nkume m, na onye nzọpụta m”.

Aga m eme ka ịhụnanya M nwere n’ebe Ọ nọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ọgbụgbandụ M na ya ga-akwụrụ chịm. Azịza.

Advertisement

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 13:16-17, 22-25.

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Akaebe Pọl gbaara Kristi, Nwa Devid.

Pọl wee bilie, feere ha aka ka ha gee ntị, wee bido okwu sị: “Ndị Izrel ibe m, na ndị mba ọzọ, ndị na-atụ egwu Chineke nọ n’ebe a, geenụ m ntị! Ndewonụ O!

Chineke nke ndị nke a, bụ Izrel, họpụtara nna nna anyị ha, wee mee ka ha bụrụ oke mba ukwu mgbe ha nọ dịka ọbịa n’ala Ijipt. O werekwa ogwe aka dị ike duputa ha n’ala ahụ.

Mgbe Chineke wepụrụ Sọl n’ọchịchị, o weliri Devid ịbụ eze ha. Chineke n’onwe ya kwuru maka Devid sị: “Ahụla M n’ime Devid, nwa Jese, ụdị mmadụ obi M chọrọ, onye ga-eme ihe niile M na-achọ’.

Advertisement

Dịka Chineke si kwe nkwa na mbụ, ọ bụ site n’agbụrụ nwoke a bụ Devid ka Chineke wepụtara Jesu, ịbụrụ ndị Izrel niile Onye Nzọpụta.

Tupu Jesu amalite ọrụ Ya, Jọn Ome Mmirichukwu buru ụzọ kwusaara ndị Izrel maka mmirichukwu, nke nchegharị dị mkpa n’ime ya. Ma n’oge Jọn na-agbazu ọsọ ije ozi ya, ọ jụrụ ọha ndị Juu sị: “Onye ka ụnụ na-eche na m bụ?

Abụghị m onye ahụ ụnụ na-atụ anya Ya. Kama leenụ! Otu onye na-abịa n’azụ m, Onye m na-ekwesịghị ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya”!

MBEKU

Alleluịa, Alleluịa:

Echi ka a ga-emebi mmehie niile e mere n’ụwa. Onye nzọpụta nke ụwa ga-abụ eze anyị.

Advertisement

Alleluịa.

OZIỌMA – 1:1-25

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: “Akụkọ ndụdụgandụ nna nna Jesu Kristi, Nwa Devid.”

Nke a bụ usoro ọmụmụ nke Jesu Kristi, Nwa Devid, Nwa Ebraham.

Ebraham mụrụ Aịzik; Aịzik amụta Jekọb; Jekọb wee mụta Juda na ụmụnne ya. Juda mụtara Perez na Zera ndị nne ha bụ Tama, Perez mụtara Hezrọn; Hezrọn mụtara Ram; Ram mụtara Amịnadab; Amịnadab mụtara Nashọn; Nashọn mụtara Salmọn; Salmọn mụtara Boaz, onye nne ya bụ Rahab; Boaz mụtara Obed, onye nne ya bụ Rut; Obed mụtara Jese; Jese mụtara eze Devid.

Advertisement

Devid mụtara Solomon, onye nne ya bụ nwunye Uria; Solomon mụtara Rehoboam. Rehoboam mụtara Abiya; Abiya mụtara Joram; Joram mụtara Uzaya; Uzaya mụtara Jotam; Jotam mụtara Ahaz; Ahaz mụtara Hezekịa; Hezekịa mụtara Manase; Manase mụtara Amọn; Amọn mụtara Josaya; Josaya mụtara Jekonịa na ụmụnne ya, n’oge a dọtara ụmụ Izrel n’agha jee Babilọn.

Mgbe a dọtasịrị ụmụ Izrel n’agha jee Babilọn, Jekonịa mụtara Shealtiel; Shealtiel mụtara Zerubabel; Zerubabel mụtara Abiud; Abiud mụtara Eliakim; Eliakim wee mụta Azọ; Azọ mụtara Zedok; Zedok wee mụta Akim; Akim mụtara Eliud; Eliud mụtara Elieza; Elieza wee mụta Matan; Matan mụtara Jekọp; Jekọp wee mụta Josef di Marịa, bụ nne Jesu, onye a na-akpọ Kristi.

Ya mere, ndụdụgandụ niile nke ụmụ Izrel site n’Ebraham ruo na Devid dị ndụdụgandụ iri na anọ. Site n’oge Devid ruo oge a dọtara ụmụ Izrel n’agha jee Babịlọn, dị ndụdụgandụ iri na anọ. Site na mgbe a dọtara ụmụ Izrel n’agha jee Babịlọn ruo ọmụmụ Kristi dị ndụdụgandụ iri na anọ.

**Otu a ka e si mụọ Jesu Kristi: Mgbe ahụ ikwu na ibe ekwekọrịtala na Josef ga-alụ Marịa; nne Jesu. Ma mgbe ha na-ebikọbeghị, a hụrụ na Marịa dị ime site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ma ebe Josef dị ya, bụ onye eziomume, ọ chọghị ịkpọpụtara ya ọha; kama o zubere ịchụ ya na nzuzo.

Ma mgbe ọ na-atụgharị ihe ndị a n’obi ya, mmụọozi nke Onyenweanyị gosịrị ya onwe ya na nrọ, sị: “Josef, nwa Devid, a tụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị, n’ihina Nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụ Nwa nwoke. Ị ga-akpọ Ya Jesu, n’ihi na Ọ ga-azọpụta ndị nke Ya na mmehie ha niile”.

Advertisement

Ihe ndị a niile mere ka e wee mezuo okwu Onyenweanyị siri n’ọnụ onye amụma kwuo sị: “Lee, nwagbọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụta Nwa nwoke. A ga-akpọ Ya Ịmmanuel” nke isi ya bụ “Chineke nọnyere anyị”.

Ya mere, mgbe Josef tetara n’ụra, o mere dịka mmụọozi nke Onyenweanyị gwara ya, wee kpọrọ Marịa nwunye ya. Ma ọ bakwughị ya ruo mgbe ọ mụchara Nwa. Josef wee kpọọ aha Ya Jesu.**

Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ NA Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụtụtụ

Igbo Mass Readings for December 24 2024, Ụka Nche Abalị Krismas (Christmas Vigil) – Nke Ụzọ Mgbede.

Advertisement
Continue Reading
Advertisement

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.