Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ .
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ .
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 62:11-12
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: “Onye Nzọpụta ụnụ abịala.”
Lee ihe Onyenweanyị na-ekwusa n’akụkụ ụwa niile: Gwa ada Zayọn, lee, Onye Nzọpụta ụnụ abịala; O ji ụgwọ mmeri Ya n’aka, ọkwụkwụ ụgwọ Ya dịkwa n’aka Ya. A ga-akpọkwa ụnụ “Ndị Nsọ Chineke,” “Ndị Chineke Zọpụtara.” A ga-akpọkwa ụnụ “Ihe a na-achọ,” “Obodo a na-ajụghị ajụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 95:1-3, 11-13, Aịz. Luk 2:11
Azịza: Taa, ìhè ọhụrụ ga-achakwasị ụwa: a mụụrụ anyị Onyenweanyị.
1. Onyenweanyị bụ Eze, ka ụwa ñụrịa ọñụ; ka akụkụ osimiri niile sorokwa ñụrịa. Ka igwe nile kwupụta ikpe nkwụmọtọ Ya. Azịza
2. Ìhè na-achapụtara ndị eziomume. Ndị obi ha kwụ ọtọ enweela añụrị. Ụnụ ndị eziomume ñụrịwanụ n’Onyenweanyị: Nyenụ aha nsọ Ya otito. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:4-7
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Taịtọs
Isi Okwu: “Ọ bụ sọsọ n’ihi ebere Ya ka O ji zọpụta anyị, ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ.
Ma mgbe obi ọma na ịhụnanya nke Chineke, bụ Onye Nzọpụta anyị pụtara ìhè n’ebe mmadụ nọ, ọ zọpụtara anyị. Ọ bụghị n’ihi ezi ọrụ dị iche iche anyị rụrụ, kama Ọ zọpụtara anyị n’ihi ebere Ya; site na nsacha nke ọbara Ya, nke Mmụọ Nsọ ji amụ anyị ọzọ, na nke O ji enye anyị ndụ ọhụrụ.
Chineke sitere na Jesu Kristi, Onye Nzọpụta anyị, wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ ahụ n’uju. Chineke mere nke a ka O wee site n’amara Ya gụọ anyị na ndị eziomume, ka anyị wee ketakwa ndụ ebighị ebi ahụ anyị na-ele anya ya.
MBEKU – Luk 2:14
Alleluịa, Alleluịa:
Otito dịrị Chineke n’elu kacha elu. Udo dịrị ndị mmadụ ndị ihe ha na-asọ Chineke.
Alleluịa.
OZIỌMA – 2:15-20
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: “Ndị nche atụrụ hụrụ Marịa, na Josef na Nwata ahụ.”
Mgbe ndị mmụọọma ahụ si n’ebe ahụ laa n’eluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ wee gwarịta ibe ha, sị : “Ka anyị jeenụ Bethlehem ji anya anyị hụ ihe a merenụ, nke Onyenweanyị merela ka anyị mara.”
Ha wee gaa ngwa ngwa hụ Marịa na Josef na Nwa ọhụrụ ahụ ka O dina n’ụlọ anụ. Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ Nwa ahụ, ha kọọ ihe a kọọrọ ha maka Nwatakịrị ahụ.
Akụkọ ha kọrọ tụrụ ndị niile nụrụ ya n’anya. Ma Marịa chịịrị okwu ahụ wụnye n’obi ya, na-atụgharị ha n’obi.
Ndị ọzụzụ atụrụ wee laghachi na-eto Chineke, na-aja Yam ma, n’ihi na ihe niile ha nụrụ na nke ha hụrụ dakọtara n’ihe a gwara ha.
Igbo Mass Readings for December 26 2024, Emume Ncheta Stivin Dị asọ
Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ .