Devotion Prayers after Holy Communion in Igbo Language

Here are Devotion Prayers after Holy Communion in Igbo Language. These prayers are recommended to be said by Catholic faithful after reception of Holy Communion.

Omume Nke Okwukwe

O Jesu, ekwelụ m n’obi m nile n’ọbụ arụ na mme Gị ka m natalụ; maka na Ngị kwulu nnọfụ, okwu Gị bụ eziokwu.

Omume Nke Nsepulu

O Jesu, Chukwu nke m na onye okike nke m, esekpulu m Gị. N’aka Gị ka m si pụta, mak’onwe Gị azi k’iji kee m, ka m wee nọnyel’Gị n’añụlị ebebe.

Omume Nke Ume Anị

O Jesu, ekwupụtalụ m na-abụ m sọ aja na ntụ: ma Ngị bụ Chukwu: I si n’eluigwe bịakwute m na-enye m ike ikwunyelụ Gị okwu n’ime obi m.

Omume Nke Ịfụnanya

Ezigbo Jesu, afụlụ m Gị n’anya n’obi m nile, Gị amago na m fụlụ Ngị n’anya. Mee ka m fụwanye Gị n’anya nk’ọdị n’iru.

Inye Ekene

O Jesu, ewelụ m onwe nye Gị dịk’l si wel’onwe Gị nye m. Biko, nalụ m, nal’arụ m k’I doo ya nsọ; nalụ mkpụrụobi m k’I werub’ya na njọ, nal’obi m mee k’ọfụgide Gị n’anya. Ewelụ m onwe m na mbọsị nile nke ndụ m nye gị, ka na ndụ ka n’ọnwụ ka m bụlụ nke Gị na ndụ ebebe. Amen.

Ayịyọ Maka Onwe Gị

O Jesu welụ mme Gị dị ok’ọnụ wụchapụ njọ m nile. Arapụkwana m n’oge nnega, nye m grasịa Gị ka m wee dịba ndụ dị asọ, nwụrụ ọnwụ dị asọ, wee keta añụlị ebebe.

Ayịyọ Maka Ndị Ọzọ

O Jesu, lekwa Nzukọ Gị dị asọ bư, Nne anyị anya, Gọzie ụkọchukwu nke na-akpachapụlụ mkpụlụobi m anya. Lekwasị nna m na nne na ụmụnne m na ndị nile na-emelụ m afọ ọma anya. Gọzie fa nile n’arụ na mkpụl’obi, meere ndị ome njọ ebele zọpụta fa n’ọkụ-mmụọ.

Ka mkpụl’obi ndị nile kwelụnụ gal’aga si n’ebele Gị wee zul’ike na ndokwa.

Ayọ m Gị O Jesu duru m laba, K’I nyelụ m aka irubere ndị m nọ n’okpulu fa isi, ya n’idebe iwu Gị dị asọ ọfụma ghalụ ịdaba na njọ ogbugbu, ọ bụlụ na m adaba nyelụ m aka ka m si na njọ wee pụta na-afụwanye Gị n’anya. Amen.

Other Catholic Igbo Communion Prayers

Categorized in:

Catholic Prayers,