Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Ụka nke mbụ n’Oge Adventi

UKWE MBATA – Abụọma 24:1-3
Chineke m, ebulitere m Gị mmụọ m elu. Atụkwasara m Gị obi. E kwela ka ihere mee m. E kwela ka ndị iro m chịgbuo m n’ọchị, maka na enweghị onye na-eche Gị ihere na-emegbu.
A naghị ekpe “Otito dịrị Chineke…”
EKPERE MMEGHE
Ka anyị rịo arịrịọ
(Ka ọbịbịa Kristi na-anụ anyị ọkụ n’obi)
Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi
Chineke ji ike nile, biko mụbaa ike ezi omume nke ndị kwerenụ. Mgbe Kristi, Onye Nzọpụta anyị ga-abịa, ka anyị were obi na-anụ ọkụ na ezi ọrụ nabata Ya. Ka anyị bụ ndi I doro nsọ nweta ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’aka nri Kristi n’alaeze eluigwe. Site n’Onyenweanyị Jesu Kristi Nwa Gị; Onye Gị na Ya dị ndụ, na-achị n ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, Otu Chukwu, site n’ụwatụwa nile, Amen.
Ma ọ bụ
Ka anyị rịọ arịrịọ
(Ka Kristi anyị na-eche, na-agụ anyị agụụ n’obi)
Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.
Nna nke eluigwe, obi anyị na-achọ okpomọku nke ịhụnanya Gị. Echiche anyị na-achọ Ihè nke ezi okwu Gị. Biko mụbaa agụụ na-agụ anyị n’obi, maka Kristi Onye Nzọpụta anyị. Nye anyị ike nke ịbawanye n’ịhụnanya; ka chi ọbụbọ nke ọbịbịa Ya zute anyị, ebe anyị ji añurị na-eche Ya. Onye Gị na Ya dị ndụ na-achị, n’ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ, Otu Chukwu, site n’ụwatụwa nile, Amen.

Catholic Lector
Catholic Lector is the founder of Catholic Lectionary. He is a passionate Writer, a Web Developer, a Computer expert and a part-time Blogger who loves to write a lot of contents on Catholicism in his free time. He is also the co-founder of the price review website: https://jumiaprice.com; where he shares a lot of product price contents.
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.