EKPERE NHUNYE
Onyenweanyi, biko mee ka aja nke a anyi na-achu maka otito nke aha Gi sachaa anyi. Site n’ubochi ruo n’ubochi, ka omume anyi buru ihe na-ewetara anyi ndu nke eluigwe. Site na Kristi Onyenweanyi.
UKWU ORIRI NSO: Abuoma 33:9
Detu ire ka i hu ka Onyenweanyi si di mma! Anuri na-adiri onye gbabara n’Onyenweanyi.
Ma o bu:
Baikwutenu m unu niile ndi na-adogbu onwe unu n’oru na ndi e boro ibu di aro, aga m enye unu ezumike. (Matiu 11:28)
EKPERE A NATACHAA ORIRI NSO:
Ka anyi rio aririo:
Chetu ntakiri kpee ekpere n’ime obi.
Onyenweanyi, onyinye I nyere anyi n’oriri nke a ebuka. Biko anyi na-ario Gi, meek a anyi nara onyinye nzoputa nke a, were na-eto Gi mgbe niile akwusighi akwusi. Site na Kristi Dinwenu anyi.