Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ maka Ụka nke Mbụ n’oge Adventi

EKPERE NHUNYE
Onyenweanyị, biko nara onyinye ndị a, anyị sitere n’ihe ọma nile I nyere anyị were na-ebutere Gị. Otu I si eme ka ofufe anyị na-efe Gị n’elu ụwa a na-adị ire, meekwa ka anyị nweta ụgwọ nke nzọpụta ebighi ebi. Site na Kristi Dinwenụ anyị.
UKWE ORIRI NSỌ – Abụọma 84:13
Onyenweanyị ga-eme ka onyinye Ya zosa anyị dịka mmiri. Ala anyị e wee mịta mkpụrụ ya.
EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ
Ka anyị rịọ arịrịọ
Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.
Biko Onyenweanyị, anyị na-arịọ Gị, mee ka ihe omimi nke a anyị na-anata ugboro ugboro, nyere anyị aka n’ụwa a. Meekwa ka anyị bụ ndị bi n’ụwa a na agafe agafe, nwee ịhụnanya ugbu a maka ihe nke eluigwe, iji keta oke n’ụwa ọzọ. Site na Kristi Onyenweanyị.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?