Ekwem na Otu Chineke [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Ekwem na Otu Chineke‘ is one of the popular Igbo Catholic hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Holy Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Ekwem na Otu Chineke Lyrics
E-ekwe m n’otu Chukwu
N’otu Chukwu E-ekwe m n’otu Chukwu – Ref.
1) Nna ji ike nile — E-ekwe m’otu Chukwu
2) Onye mere igwe n’ala — E-ekwe m’otu Chukwu
3) Ma ihe dum a na-ahụ anya — E-ekwe m n’otu Chukwu
4) Na ndị anaghị ahụ anya — E-ekwe m n’otu Chukwu
5) Ya na otu Onyenweanyị Jesu Kristi sọ otu nwa Chineke amụrụ, Nna mụrụ, tupu ụwatụwa nile, (Ref) — E-ekwe n’otu Chukwu.
6) Chukwu si na Chukwu — E-ekwem n’otu Chukwu
7) Íhé si na íhé — E-ekwe m n’otu Chukwu
8) Ezi Chukwu si na Chukwu — E-ekwe m n’otu Chukwu
9) Amụrụ ya amụ emeghị ya eme — E-ekwe m n’otu Chukwu
10) Ya na Nna bụ otu ihe, n’ihe ha jiri bụrụ Chukwu, Onye si na ya, wee mee ihe dum (Ref).
11) Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị siri n’eligwe gbadata, o were ahụ na Virgin Marịa site na Mmụọ Nsọ ọ bụrụ mmadụ, Ekwe m n’otu Chukwu. N’otu Chukwu — E-ekwe m n’otu Chukwu
12) Ọ taa ahụhụ — E-ekwe m n’otu Chukwu
13) N’okpuru Pontius Pilate — E-ekwe m n’otu Chukwu.
14) A bịa kpọgbuo ya n’obe — E-ekwe m n’otu Chukwu
15) Ọ nwụọ elie ya — E-ekwe m n’otu Chukwu.
16) Ma O bilitere n’ụbọchị nke atọ ka akwụkwọ nsọ si kwu, Rọgoro n’eligwe nọrọ n’aka nri Nna — E-ekwe m n’otu Chukwu.
17) Ma-ọga-abịaghachi ọzọ n’ebube ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, onye ọchịchị ya n’enweghị njedebe, Ekwe m ekwe m na Mmụọ Nsọ — E-ekwem n’otu Chukwu.
Otu Chukwu — E-ekwem n’otu Chukwu.
18) Onyenweanyị n’enye ndụ — E-ekwe m n’otu Chukwu
19) Onye si na Nna na Nwa pụta — E-ekwe m n’otu Chukwu.
20) Onye a na-esekpuru — E-ekwe m n’otu Chukwu.
21) N’etokọdo ya na Nna na Nwa — Ekwe m n’otu Chukwu.
Si na ndị amụma kwuo okwu — Ekwe m n’otu Chukwu.
22) Ekwe m n’otu nzukọ nsọ Katọlik na Apọstọlic, ekwupụta m otu Baptisma nke mgbaghara njọ — E-ekwe m n’otu Chukwu.
N’otu Chukwu — E-ekwe m n’otu Chukwu.
23) Ana m atụ anya mbilite n’ọnwụ ndị nwụrụ anwụ na ndụ ụwa ga-abịanụ D.C. — E-ekwe m n’otu Chukwu.
N’otu Chukwu — E-ekwe m n’otu Chukwu.
24) A————men.
Other Catholic Igbo Common of the Mass Hymns
- Onyenweanyị mee Ebere
- Onyenwanyị mee Ebere
- Onyenweanyị mee Ebere
- Onyenweanyị biko mee Ebere
- Onyenwe m Chineke mee Ebere
- Otito dịrị Chineke na elu kasị elu
- Otito dịrị Chineke
- Ekwe m n’otu Chineke
- Ekwem na Otu Chineke
- Nsọ Nsọ Nsọ
- Nna Anyị nọ na Eligwe
- Nna Anyị nọ n’eluigwe
- Nna Anyị nọ na Eligwe
- Nwatụrụ nke Chukwu
- Nwatụrụ nke Chineke
- Nwatụrụ Chukwu
- Nwatụrụ Chineke Nwatụrụ Chukwu