Igbo Mass Readings for November 30 2026, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 30 2026, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:9-18

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom.

N’ihina ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwupụta na Jesu bụ Onyenweanyị, ọ bụrụkwa na ị ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka O si na n’ọnwụ bilie, a ga-azọpụta gị!

Ọ bụ site n’iji obi anyị kwere, ka Chineke ji gụnye anyị na ndị eziomume sitekwa n’iji ọnụ anyị kwupụta Kristi, ka e ji zọpụta anyị. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu sị, “Onye ọbụla nke kwere na ya, Chineke agaghị ekwe ka ihere mee ya.”

Nke a bụ maka mmadụ niile, maka n’ime Kristi, o nweghị ihe dị iche n’etiti ndị Juu na ndị Grik. Chineke bụ Dinwenụ nke mmadụ niile.

Ọ na-egosikwa afọma ya n’ebe ndị na-akpọku ya nọ. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Onye ọbụla nke na akpọku ya ga-enweta nzọpụta.”

Ma olee otu ụmụ mmadụ ga-esi akpọku onye ahụ nke ha na-ekweghị na ya? Ha ga-esi aghaa nụ ma ọ bụrụ na onye na-ezisa oziọma agwaghị ha okwu?

A ga-esi aghaa kwusa oziọma ahụ ma ọ bụrụ na e zipụghị ndịozi? Dịka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “Lee ka ha si maa mma nke ukwu, bụ ụkwụ nke ndị na-ezisa oziọma!”

Ọ bụghị mmadụ niile narala oziọma ahụ. Aịzaya n’onwe ya kwuru sị, “Onyenweanyị, onye kwerela ihe anyị kwuru? Ya bụ, okwukwe si n’ọnụnụ pụta.

Ọnụnụ ahụ sikwara n’ikwusa okwu Kristi. Ka m jụọ: Ọ bụ na ha anụbeghị okwu Chineke? N’ezie, ha anụla ya. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Ụdaolu ha agazuola ụwa niile, okwu ha eruola nsọtụ ụwa niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19:1-2, 3-4.

Azịza:  Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

1.Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,

Ụbọchị niile na-ekwupụta ya,

Abalị ọbụla na-egosịpụta amamiihe nke Chineke.

Azịza:  Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

2. Ha anaghị ekwu okwu nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ,

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

Azịza:  Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

MBEKU

Alleluịa, Alleluịa:

“Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ.

Alleluịa.

Oziọma – Matiu 4:18-22.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Ka Jesu na-aga n’akụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pịta na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri n’ihina ha bụ ndị ọkụ azụ.

Ọ sị ha, “Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ” Ozigbo ahụ, ha hapụ ụgbụ ha sobe ya. Mgbe Jesu si ebe ahụ na-aga, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ bụ Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ka ha na nna ha nọ n’ụgbọ mmiri na-emezi ụgbụ ha. Jesu kpọrọ ha. Ozigbo ahụ ha hapụrụ ụgbọmmiri ha na nna ha sobe ya.

Igbo Mass Readings for December 1 2026, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Igbo Mass Readings for November 30 2026, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl