Igbo Mass Readings for June 11 2024, Emume Barnabas dị Asọ – Nwaazụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 11 2024, Emume Barnabas dị Asọ – Nwaazụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:21-26; 13:1-3

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị ozi

Onyenweanyị nọnyekwaara ha, nke na ọtụtụ ndị kwerenụ chegharịrị. Akụkọ banyere nke a ruru nzukọ Kristi nke dị na Jerusalem ntị. Ha zigara Banabas n’Antiọk.

Mgbe ọ bịaruru hụ amara Chineke, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. Ọ rịọrọ ha niile ka ha were obi ha kwụsie ike n’okwukwe, nọgidesie ike n’ime Onyenweanyị.

Banabas bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe na Dinwenụ. Banabas pụrụ gaba Tasus ịchọ Sọl; oge ọ chọtara ya, ọ kpọọrọ ya laghachi Antiọk.

Ha abụọ nọrọ n’Antiọk ihe karịrị otu afọ na-akụziri igwe mmadụ ihe. Ọ bụkwa n’Antiọk ka e bu ụzọ kpọọ ndị na-eso ya ‘Ndị otu Kristi.’ N’ime nzukọ Kristi nke dị n’Antiọk, e nwere ọtụtụ ndị amụma na ndị nkuzi.

Ndị a bụ Banabas, Simiọn, onye a na-akpọ Nịga, Lushiọs onye Sairiin, Manen bụ otu onye n’ime ndị obi Herọd, bụ onye na-achịrị ndị Rom obodo anọ, na Sọl.

Otu ụbọchị, ka ha nọ na-ekpe ekpere, na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ gwara ha sị, ‘Wepụtaranụ m Banabas na Sọl iche, maka ịrụ ọrụ nke m kpọrọ ha ka ha rụọ.’ Oge ha kpechara ekpere, buchakwaa ọnụ, ha bikwasara ha aka n’isi zipụ ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4, 5-6

Azịza (V. 2): Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya

1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ

N’ihina Ọ rụrụ ọrụ ebube,

Aka nri Ya na aka Ya dị nsọ

e wetarala Ya mmeri. Azịza

2. Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya

O meela ka mba niile mata eziomume Ya

O chetala ịhụnaanya Ya na ịkwụdosiike Ya

N’ebe ezinụụlọ Israel nọ. Azịza

3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.

Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ

Werenụ ukwe na mkpu ọñụ too Ya,

Kweerenụ Onyenweanyị ukwe. Azịza

4. Werenụ ụbọ akwara na ihe egwu dị icheiche

Tierenụ Onyenweanyị egwu!

Werenụ opi igwe na mpi

Kwupụta na Onyenweanyị bụ eze. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Anyị na-eto Gị, Chineke; anyị na-ekwupụta Gị dịka Dinwenụ; igwe ndị ụmụazụ Gị dị otito na-ebuli Gị elu.

ALLEUIA.

OZIỌMA – 10:7-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ Ya sị: “Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, “Alaeze eluigwe adịla nso. Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụkwa ajọ mmụọ.

Ụnụ natara n’efu, nyekwanụ n’efu. Ụnụ etinyela ọlaedo, mọbụ ọlaọcha, mọbụ ego ọbụla n’akpa ụnụ. Ụnụ ejila akpa ọbụla maka njem ụnụ, mọbụ uwe abụọ, mọbụ akpụkpọụkwụ, mọbụ mkpọ; n’ihina onye ọrụ tosịrị ụgwọ ọrụ ya.

Mgbe ụnụ banyere obodo mọbụ ogbe ọbụla, chọpụtanụ ezi mmadụ bi na ya, nọrọnụ n’ụlọ ya ruo mgbe ụnụ ga-ahapụ ebe ahụ. Mgbe ụnụ na-aba n’ụlọ ọbụla, keleenụ ndị bi na ya sị, “Udo dịrị ụnụ.’

Ọ bụrụ na ndị bi n’ụlọ ahụ tosịrị etosị, ka udo ụnụ dịịrị ha; ma ọ bụrụ na ha etosịghị etosị, ka udo ụnụ laghachiri ụnụ.

Igbo Mass readings for June 12 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for June 11 2024, Emume Barnabas dị Asọ – Nwaazụ.

Last Update: December 10, 2022