Igbo Mass Readings for April 30 2024, Emume nke Ezenwaanyị, Nne nke Afrịka.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 30 2024, Emume nke Ezenwaanyị, Nne nke Afrịka.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:12-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọru Ndịozi

Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike n’ekpere. Mgbe Jesu rọgorochara n’eluigwe, ndịozi iri na otu ahụ siri n’ugwu a na-akpọ Olivet dị Jerusalem nso laghachi Jerusalem, ihe dịka njem otu ụbọchị izuike.

Mgbe ha batara Jerusalem, ha rịgooro n’ime ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu, ebe ha nọbu. Ndị ozi ndị a bụ Pita, Jọn, Jemis, Andru, Filip, Tọmọs, Batolomi na Matiu, Jemis nwa Alfeus, Saịmọn nke Zilọt na Judas nwa Jemis.

Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike n’ekpere ha na ụmụnwaanyị ụfọdụ na Meri nne Jesu na ụmụnne ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Lk. 1: 46-48, 49-50, 53-54

Azịza (V. 49): Onye dị ike e meerela m nnukwu ihe; Aha Ya dị nsọ.

1. Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m

Mụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m

Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya

Site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye dị ngọzi. Azịza

2. Maka na onye dị ike e meerela m nnukwu ihe

Aha ya dị nsọ

Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

Maka ndị na-atụrụ ya egwu. Azịza

3. Onyejuola ndị agụụ na-agụ afọ

Hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa.

O nyerela Izrel nwodibo ya aka,

Na ncheta ebere ya. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Ị dị ngọzi, Virgin Marịa dị nsọ, kwesịkwa otito niile. Ị bụ Nne nke Kristi, bụrụkwa Nne nke Nzukọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 2:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Nke a bụ ọrụ ebube nke mbụ n’ime ọrụ ebube ya niile. Ọ bụ na Kena nke Galili ka ọ rụrụ ya. N’ụbọchị nke atọ, e nwere oriri agbamakwụkwọ na Kena nke dị na Galili, nne Jesu gakwara ebe ahụ.

Ezikwara Jesu na ndị na-eso ụzọ ya n’oriri agbamakwụkwọ a. Mgbe mmanya gwụchara, nne Jesu sịrị ya, “Ha enweghịzi mmanya.” Jesu zara ya sị, “Nwaanyị, olee ụzọ nke a si gbasa mụ na gị?

Oge nke m erubeghị.” Nne ya gwara ndị na-eje ozi sị, “Meenụ ihe ọbụla ọ sị ụnụ mee.” Dịka omenaala ịsa ụkwụ na aka nke ndị Juu siri dị, ite mmiri nkume isii dọrọ n’ebe ahụ.

Nke ọbụla n’ime ha na-eri ihe dịka udu mmiri iri abụọ mọbụ iri atọ. Jesu gwara ha sị, “Gbajupụtanụ ha n’ọnụ.” Ha wee gbajupụta ha n’ọnụ. Jesu sịrị ha, “Ngwa, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oriri.”

Ha mere nke a. Mgbe onyeisi oriri detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ bụrụ mmanya ọnụ, ọ maghị ebe o si pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị gbapụtara mmiri ahụ, maara ebe o si), Ọ kpọrọ onye na-alụ nwaanyị, sị ya, “Onye ọbụla na-ele ọbịa, na-ebu ụzọ bupụta mmanya dị ụtọ.

Mgbe ndị mmadụ ñụjuchara afọ ha, o bupụtazie nke na-adịchaghị mma. Ma gị onwe gị hapụrụ ibute mmanya dị ụtọ ruo ugbu a.” Nke a bụ ọrụ ebube nke mbụ n’ime ọrụ ebube ya niile. Ọ bụ na Kena nke Galili ka ọ rụrụ ya. O gosipụtara ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwekwara na ya.

Igbo Mass readings for May 1 2024,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for April 30 2024, Emume nke Ezenwaanyị, Nne nke Afrịka.

Last Update: December 9, 2022