Igbo Mass Readings for December 29 2024, Emume Ezinụụlọ Dị Asọ nke Jesu, Marịa na Josef
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 29 2024, Emume Ezinụụlọ Dị Asọ nke Jesu, Marịa na Josef.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:2-6, 12-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Sirak
Isi Okwu: Onye na-atụrụ Dinwenụ egwu na-asọpụrụ nne na nna ya
Onyenweanyị na-esi n’ụmụ enye nna ha ugwu, na-ewelitekwa elu ikikere nne nwere n’ebe ụmụ ya nọ. Onye ọ bụla na-enye nna ya nsọpụrụ na-akwụ ụgwọ dịịrị njọ ya.
Onye na-enye nne ya ugwu dị ka onye na-ekpọkọba akụ na ụba. Onye ọ bụla na-asọpụrụ nna ya ga-enwe añụrị n’ụmụ nke ya. Oge ọ rịọrọ arịrịọ, a ga-aza ya.
Onye na-enye nna ya nsọpụrụ na-ebi ogologo ndụ. Onye na-eme ka obi dị nne ya jụụ, na-ehubere Onyenweanyị isi. Nwa m, nyere nna gị aka mgbe o mere okenye.
A kpasukwala ya iwe na ndụ ya. Asịgodị na echiche ya ezukwaghị oke site na nka, gosi ya ebere. E jila n’ihi ahụ ịdị ike na ikikere i nwere were eleda ya anya, maka na a dịghị echefu ihe ọma e meere nna echefu; kama, ọ ga-abụ ihe ị ga-eji akwụ ụgwọ dịịrị njọ gị.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 127:1-5. Az. 1
Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu na-eso ụzọ Ya.
1. Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.
Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri.
Añụrị na aga m n’ihu ga-abụ nke gị. Azịza.
2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị,
na-amị mmịmị n’ime ụlọ gị,
ụmụ gị ga-agarube oche nri gị,
dịka ome osisi olivu. Azịza.
3. Otu a ka a ga-esi gọzie onye na-atụ Chukwu egwu.
Ka Dinwenụ si na Zayọn gọzie gị,
ụbọchị ndụ gị niile. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:12-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosị
Isi Okwu: Ndụ ezi na ụlọ e biri n’ime Onyenweanyị.
N’ihi na ụnụ bụ agbụrụ Chineke họtara ahọta, na ndị dị nsọ, Ọ hụrụ n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị ume ala, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachị obi.
Na-edinụ ihe ibe ụnụ na-eme ụnụ. Ụnụ ebukwarala mmadụ ibe ụnụ ihe ọjọọ ọ bụla n’obi. Na-agbagharanụ ibe ụnụ mgbe ọ bụla ha mejọrọ ụnụ, dịka Onyenweanyị si agbaghara ụnụ mmehie nke ụnụ.
Ma nke kachasị nke n’ezi omume niile ndị a bụ: yikwasịnụ ịhụnanya nke bụ ihe nkekọta nke na-eme ka udo zuru oke dị n’etiti mmadụ na ibe ya. Kweenụ ka udo ahụ Kristi na-enye, bụrụ ihe na-achị obi ụnụ.
N’ihi na, ebe e mere ka ụnụ soro bụrụ akụkụ otu ahụ Ya ahụ, a kpọbatala ụnụ n’ime udo Ya ahụ. Na-ebinụ ndụ ekele! Ka okwu nke Kristi, were uju akụ na ụba ya niile biri n’ime ụnụ.
Werenụ amamihe zuru oke na-eziritanụ ibe ụnụ ihe, na-adụrịtakwanụ ibe ụnụ ọdụ. Werenụ abụọma, na ukwe, na abụ si n’ime mmụọ ụnụ pụta, na-enyenụ Chineke ekele.
N’ihi amara Ya, n’ihe ọ bụla ụnụ na-eme, ma ọ bụ okwu ma ọ bụ ọrụ, na-emenụ ha niile n’aha Onyenweanyị Jesu. Na-enyenụ Chineke Nna ekele site na Kristi.
Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe ụnụ n’okpuru di ụnụ. Ndị bụ di, hụnụ nwunye ụnụ n’anya. Ụnụ enwela obi ilu n’ebe ha nọ. Ndị bụ ụmụ, na-añanụ ntị n’olu ndị mụrụ ụnụ, otu o kwesịrị ndị Kristi.
N’ihi na ime otu ahụ na-atọ Chineke ụtọ. Ndị bụ nna, ụnụ akpasula ụmụ ụnụ iwe, ka ike ghara ịgwụ ha n’ịgba mbọ ime ihe dị mma.
ALELUYA – Kol. 3:15-16
Aleluya, aleluya!
Ka udo Kristi chịwa n’obi ụnụ; ka ozi ahụ Kristi ziri bịa n’uju biri n’ime ụnụ.
Aleluya!
OZIỌMA – 2:13-15, 19-23 – Afọ Nke Mbụ
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Duru Nwata na nne ya gbalaa n’Ijipt
Mgbe ndị amamihe ahụ laghachiri ala ha, mmụọ ozi nke Onyenweanyị gosiri Josef onwe ya na nrọ, sị: “Bilie, kpọrọ Nwa na nne ya gbaga n’ljipt. Nọrọ ebe ahụ, ruo mgbe m ga-agwa gị, n’ihi na Herọd ga-achọ Nwatakịrị ahụ ka o wepụ ndụ ya n’ike.”
Josef wee bilie, kpọrọ Nwa na nne n’ime abalị, gaa Ijipt. N’ebe ahụ ka ọ nọ ruo mgbe Herọd nwụrụ. E mere nke a, iji mezuo okwu Onyenweanyị sitere n’ọnụ onye amụma kwuo sị: “Esiri M n’Ijipt kpọpụta Nwa M.”
Ma mgbe Herọd nwụrụ, mụọ ozi nke Onyenweanyị gosiri Josef onwe ya na nrọ n’ljipt, wee gwa ya, sị: “Bilie, kpọrọ Nwa na nne laghachi n’ala Izrel, n’ihi na ndị chọrọ igbu ya anwụọla.”
Josef wee kulie kpọrọ nwa na nne, lagachi n’ala Izrel. Mgbe Josef nụrụ na Akelos anọchiela anya Herọd bụ nna ya dịka eze Judia, egwu tụrụ ya ịga n’ebe ahụ.
Ma Josef nwetara ịdọ aka na ntị na nrọ, nke mere o ji kwafee n’ọnụmara Galili. O jere biri n’obodo a na-akpọ Nazaret. Nke a abịa mezuo ihe ndị amụma kwuru, sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
OZIỌMA – 2:22-40 ma ọ bụ 2:22, 39-40 – Afọ Nke Abụọ
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Nwata ahụ tolitere jupụtakwa n’amamihe.
Mgbe oge zuru ime emume nghụcha, dịka iwu Mosis si kwuo, Josef na Marịa kuuru Jesu gbagoo Jerusalem, ka e wee chee Ya n’ihu nke Onyenweanyị.
N’ihi na e dere ya n’iwu nke Onyenweanyị sị: ‘Nwa mbụ ọ bụla, nke bụ oke, a ga-edo ya nsọ ji ya gọọrọ Onyenweanyị. Ha jikwara “nduru abụọ, ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ” chụọ aja, dịka e tiri ya n’iwu nke Onyenweanyị.
N’oge ahụ, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem. Aha ya bụ Simiọn. Nwoke a kwụbara aka ya ọtọ, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. O nwekwara olile anya, nọrọkwa na-eche nche mgbe a ga-abịa ịzọpụta Izrel.
Mmụọ Nsọ dakwasịrị ya. Mmụọ Nsọ mererịị ka ọ mata na ọnwụ agaghị eru ya aka, wee ruo mgbe ọ ga-eji anya ya hụ E Chiri Echi nke Onyenweanyị.
Site na nkwali na odudu nke Mmụọ Nsọ, nwoke a batara n’Ụlọ Nsọ. Mgbe nne na nna Nwatakịrị ahụ, bụ Jesu kubatara Ya n’Ụlọ Nsọ, ka e meere Ya omenala dị n’iwu, Simiọn kuuru Ya n’aka, wee kelee Chineke, sị: “Onyenwe m, ugbu a, I nweziri ike izila nwodibo Gị n’udo.
I mezuola nkwa I kwere m. N’ihi na anya m abụọ ahụla Onye Nzọpụta ahụ. I doziri, chee n’ihu mmadụ nile. Ọ bụ Ihe ndị ọgọmmụọ ji ahụ ụzọ. Na ebube ndị nke Gị bu Izrel.”
Ihe niile a Simiọn kwuru banyere Nwatakịrị ahụ, bụ Jesu, gbara nne na nna Ya gharịị. Simiọn gọziri ha, wee gwa Marịa nne Jesu, sị: “Lee anya! E doola Nwa nke a maka ọdịda na mbili ọtụtụ mmadụ n’Izrel.
Ọ ga-abụ ihe ịrịba ama nke a ga-ajụ ajụ, ka e wee kpughee echiche nzuzo dị ọtụtụ mmadụ n’obi. Ma mma agha ga-adụwa gị mkpụrụobi.” Ma e nwekwara otu nwanyị na-ebu amụma, onye aha ya bụ Ana.
Ana bụ ada Fanuel, onye si n’ebo Asha pụta. Nwanyị a aghọọla agadi. Mgbe o tochara agbọghọ, bịa lụọ di, ya na di biri nanị afọ asaa, tupu di ya anwụọ.
O wee bụrụ nwanyị isimkpe. Ugbu a, ọ gbaala iri afọ asatọ na anọ. Ọ naghị apụ apụ n’Ụlọ Nsọ, ebe o ji ekpere na ibu ọnụ na-efe Chineke ofufe, abalị na ehihie.
N’oge ahụ, mgbe nne na nna Jesu na-eche Ya n’ihu Chineke n’Ụlọ Nsọ, Nwanyị a batara, ikele Chineke; wee kọọrọ ndị niile na-ele anya mgbapụta Jerusalem, akụkọ banyere Nwatakịrị ahụ.
Mgbe di na nwanyị ahụ mezuru ihe Iwu Onyenweanyị kwuru na a ga-eme n’Ụlọ Nsọ, ha laghachiri Galili, ruo obodo nke ha, bụ Nazaret. Nwata ahụ wee na-eto, na-esikwa ike, bịakwa juputa n’amamihe; amara Chineke nọnyekwara Ya.
OZIỌMA – 2:41-52 – Afọ nke Atọ
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Nne na nna Jesu chọtara Ya n’etiti ndị ọka iwu.
N’afọ ọ bụla, nne na nna Jesu na-agbago Jerusalem maka Emume Ngafere. Mgbe Jesu gbara afọ iri na abụọ, ha jere Emume, dịka ha si eme. Oge e mesịrị emume, mgbe ha na-alaghachi, Nwokoro ahụ, bụ Jesu, nọdụrụ na Jerusalem, ma ndị mụrụ Ya amataghị.
Ha chere na O soro ndị bu ụzọ lawa. Ha agaala ije otu ụbọchị, tupu ha bido chọgharịwa Ya n’etiti ndị ikwu na ibe ha, na ndị ha maara. Ma mgbe ha na-ahụghị Ya, ha chọọrọ Ya, laghachi na Jerusalem, na-achọgharị Ya ebe niile.
Mgbe ha chọrọ Ya ụbọchị atọ, ha hụrụ Ya n’ime Ụlọ Nsọ, ka Ọ nọdụrụ n’etiti ndị oke mmụta, ebe Ọ na-ege ntị na nkụzi ha, na-ajụkwa ha ajụjụ. Nghọta na ọgụgụ isi O ji aza ajụjụ wee tụọ ndị nile nụrụ okwu Ya n’anya.
Mgbe nne na nna Ya hụrụ Ya, obi fepụrụ ha. Nne ya wee sị Ya, “Nwa m, gịnị kpatara I ji mee anyị ihe a? Lee ahụhụ mụ na nna Gị tara ebe anyị na-achọgharị Gị.”
O wee zaa sị: “Kedụ ihe ụnụ na-achọrọ M? Ọ bụ na ụnụ amaghị na aga M anọ n’ihe Nna M?” Mana ha aghọtaghị okwu Ọ gwara ha. O wee soro ha laghachi na Nazaret, bịakwa na-erubere ha isi.
Nne Ya chịịrị okwu niile ndị a wụnye n’obi ya. Jesu wee na-etolite, na-agba dimkpa, na-abawanyekwa n’amamihe na amara n’ihu Chineke na mmadụ.
Igbo Mass Readings for December 30 2024, Ụbọchị nke Isii N’Izuụka Krismas
Igbo Mass Readings for December 29 2024, Emume Ezinụụlọ Dị Asọ nke Jesu, Marịa na Josef