Igbo Mass Readings for May 3 2024, Emume Ncheta Filip na Jemis dị Asọ – Ụmụazụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 3 2024, Emume Ncheta Filip na Jemis dị Asọ – Ụmụazụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ma ugbu a, ụmụnnam, achọrọ m ichetara ụnụ maka oziọma ahụ nke m ziri ụnụ na mbụ, nke ụnụ natakwara, nke okwukwe ụnụ na-akwụdosikwa ike na ya.

Ya bụ okwu nke oziọma ahụ, nke m kwusaara ụnụ jisienụ ya ike. Ma ọ bụghị otu okwukwe ụnụ bụ ihe efu. Ahanyere m n’aka ụnụ na mbụ ozi ahụ m natara idobe, ozi nke dị oke mkpa: Na Kristi nwụrụ n’ihi mmehie anyị niile, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, na e liri ya, ma Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, na O mere ka Sefas (ya bụ Pita) hụ ya anya; O mekwara ka ndịozi iri na abụọ ahụ hụ ya anya.

E mechaa, O mere ka ihe kariri narị mmadụ ise ndị ụmụnne anyị; hụ ya anya n’otu mgbe. Ọtụtụ n’ime ha ka dị ndụ, mana ụfọdụ n’ime ha anwụọla. E mechaa ọ bịakwutere Jemis, bịakwutekwa ndị ụmụazụ niile. N’ikpeazụ, dịka nwa a mụkworo amụkwo, O mekwara ka mụ onwe m hụ ya anya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 19:1-2, 3-4.

Azịza: Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile

1. Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,

ụbọchị niile na-ekwupụta ya,

Abalị ọbụla na-egosipụta amamihe nke Chineke. Azịza

2. Ha anaghị ekwu okwu nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ,

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

“Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, Filip, Onye hụrụ m, ahụla Nna.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 14: 6-14.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’oziọma dị asọ nke Jọn dere

Jesu sịrị Tọmọs, “Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọbụghị site na m. A sị na ụnụ maara m, ụnụ ga-amakwa Nna m.

Site ugbu a, ụnụ amarala ya, ụnụ ahụkwala ya.” Filip asị ya, “Onyenweanyị, gosi anyị Nna ahụ, ọ ga-ezuru anyị.” Jesu ajụọ ya sị, “Mụ na ụnụ a nọọla ogologo oge ha otu a, ma ị mataghị m Filip?

Onye hụrụ m, ahụla Nna. Olee otu I si asị, ‘Gosi anyị Nna ahụ? Ọ bụ na I kweghị na m nọ n’ime Nna, na Nna nọkwa n’ime m? Okwu m na-agwa ụnụ abụghị site n’ike aka m, kama ọ bụ Nna nọ n’ime m na-arụ ọrụ ya.

Ya bụ, kwerenụ ihe m kwuru, na anọ m n’ime Nna, Nna nọrọkwa n’ime m. Ma ọ bụghị otu a kwerenụ n’ihe m na ekwu, n’ihi ọrụebube m na-arụ. N’ezie, n’ezie, agwa m ụnụ, onye ọbụla kwere na m ga arụ ọrụ ndị a m na-arụ.

Ọ ga-arụkwa karịa n’ihi ana m agakwuru Nna. Ihe ọbụla ụnụ rịọrọ n’aha m, aga m eme ya, ka e wee nye Nna otito site na nwa ya. Ọ bụrụ na ụnụ arịọ ihe ọbụla n’aha m, aga m eme ya.

Igbo Mass readings for May 4 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for May 3 2024, Emume Ncheta Filip na Jemis dị Asọ – Ụmụazụ.

Last Update: December 10, 2022