Igbo Mass Readings for December 28 2024, Emume Ncheta Holy Innocents

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 28 2024, Emume Ncheta Holy Innocents.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:5-10.2:1-2

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke mbụ

Nke a bụ ozi anị nụrụ n’ọnụ ya, na-ekwupụtakwara ụnụ na Chineke bụ ihe. Ọ dịghị ọchịchịrị ọbụla dị n’ime ya. Ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ n’ezi mmekọ ma na-ebi n’ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha.

Anyị anaghị ebi ndụ n’usoro eziokwu. Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi n’ihe ahụ, dịka ya onwe ya si nọrọ n’ihe, anyị nwere ezi mmekọ n’etiti onwe anyị. Ọbara Nwa ya bụ Jesu ga na-asachapụ njọ anyị niile.

Ọ bụrụ na anyị ekwuo na anyị emebeghị njọ, anyị na-aghọrị onwe anyị, eziokwu ahụ adịghịkwa n’ime anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwupụta njọ anyị niile. Chineke onye kwesịrị ntụkwasịobi na onye na-eme ihe ziri ezi, ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile.

Anyị kwuo na anyị emebeghị njọ, anyị na-eme ya onye ụgha. Okwu ya adịghịkwa n’ime anyị. Ụmụntakịrị m, ana m edere ụnụ akwụkwọ a ka ụnụ ghara imehie.

Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchitere anyị n’ebe Nna nọ, ya bụ Jesu Kristi onye eziomume. Ọ bụ onye e jiri medaa Chineke obi maka mmehie anyị. Ọ bụghị naanị maka njọ anyị kama ọ bụ maka njọ nke ụwa niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 124:2-3, 4-5, 7-8.

Azịza: Anyị gbanarịrị ọnya ndịiro anyị kwere dịka nnụnụ si agbapụ n’ọnya dinta.

1. A sị na Onyenweanyị anọnyereghị anyị,

mgbe ha lụsoro anyị ọgụ,

Ha gaara elo anyị na ndụ,

mụọ anyị ọkụ, mgbe iwe were ha. Azịza

2. Ide mmiri gaara eri anyị,

ebili mmiri gaara ekpudo anyị,

mmiri ahụ na-ekwo

gaara eri anyị. Azịza

3. Ọ gbajiri ọnya ha,

anyị wee nwee ike gbalaga.

Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị,

onye mere eluigwe na ala. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Anyị etoo gị, Chineke: Anyị na-ekwupụta gị dịka Onyenweanyị, igwe ndị egburuegbu n’ihi okwukwe n’etoo gị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 2:13-18.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ndị amamihe ahụ labara mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere Josef na nrọ sị ya, “Bilie, kpọrọ nwata aụu na nne ya gbaga ljipt. Nọrọ ebe ahụ, ruo mgbe m ga-agwa gị, n’ihina Herọd bu n’uche ịchọ nwatakịrị ahụ ka o gbuo ya.”

Josef biliri kpọrọ nwata ahụ na nne ya n’ime abalị gbaga ljipt. Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a bụ iji mejupụta ihe Dinwenụ kwuru site n’ọnụ onye amụma sị, “E siri m n’ljipt kpọpụta nwa m.”

Mgbe Herọd hụrụ na ndị amamihe ahụ aghọgbuole ya, ọnụma jupụtara ya obi. O nyere iwu ka e gbuo ụmụaka niile nọ na Betlehem na n’ala gbara ya gburugburu bido na ndị gbara afọ abụọ gbadataba, dịka oge ọ jụpụtara ndị amamihe ahụ siri gosi ihe onye amụma Jeremaya kwuru, sị, “A nụrụ olu na-eti mkpu ma Rama, Rachel na-ebere ụmụ ya akwa. Ọ jụla ị nara nkasịobi n’ihi na ha adịghịkwa.”

Igbo Mass Readings for December 29 2024, Emume Ezinụụlọ Dị Asọ

Igbo Mass Readings for December 28 2024, Emume Ncheta Holy Innocents

Last Update: May 30, 2021