Igbo Mass Readings for January 20 2024, Emume Ncheta Cyprian Michael Iwene Tansi Dị Ngọzi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 20 2024, Emume Ncheta Cyprian Michael Iwene Tansi Dị Ngọzi.

lHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ Pọl degaara ndị Filipi

Ọ bụrụ na e nwere agbamume n’ime Kristi, ihe na-akpalite ịhụnaanya, mmekọrịta n’ime mmụọ, obi ịhụnaanya na ime ebere, mejupụtanụ ọ nụ m site n’inwe otu obi, inwe otu ịhụnaanya, ịdịkọ n’otu, na inwe otu obi.

Ụnụ emela ihe ọbụla n’ụzọ ịchọ ọdịmma naanị ụnụ, mọbụ n’ụzọ ịchọ otito n’efu. Ma n’obi umeala, hụnụ ndịọzọ ka ha ka ụnụ mma. Ka onye ọbụla n’ime ụnụ ghara ịdị na-achọ sọ ọdịmma nke ya.

Kama na-achọkwanụ ọdịmma nke ndị ọzọ. Nweenụ ụdị obi ahụ dị n’ime Jesu Kristi n’etiti ụnụ. Onye agbanyeghị na ọ dị n’ụdị Chukwu, mana o weghị onwe ya na ya na Chukwu ha dịka ihe a ga-ejide aka.

O buturu onwe ya ala, were onwe ya n’ọnọdụ odibo, a mụọ ya n’ụdị mmadụ. A hụrụ ya n’ụdị nke mmadụ, o buturu onwe ya ala wee rube isi ruo n’ọnwụ, ọnwụ n’elu obe.

N’ihi nke a, Chineke buliri ya elu, nye ya aha kacha aha niile, ka o wee bụrụ na n’aha Jesu ka ikpere niile ga-egbu n’ala, ma n’eluigwe, ma n’ụwa ma n’okpuru ụwa, ire niile ga-ekwupụta na Jesu Kristi bụ Dinwenụ maka otito nke Chukwu Nna.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Isaiah 12:2-3, 4, 5-6

Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta

1. Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;

enwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m;

N’ihina Yahweh Chineke bụ ike m na ukwe m

ọ bụ onye nzọpụta m.

Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta. Azịza

2. “Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,

Meenụ ka a mata aka ọrụ ya n’ebe mba niile nọ,

kwupụtanụ na aha ya dị elu. Azịza

3. Bụọrọnụ Yahweh abụọma, n’ihina ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube,

meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile.

Tisienụ mkpu ike, kweenụ ukwe ọñụ, ụnụ ndị bi na Zayọn,

N’ihina onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel. Azịza

MBEKU – 2 Tim 1:10

Alleluia, Alleluia:

O mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụ anwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.

Alleluia

OZIỌMA – 13:31-32, 44-46

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ọ gwakwara ha okwu ọzọ n’ụkabụilu sị “Alaeze eluigwe dịka mkpụrụ osisi mọstad nke otu nwoke kụrụ n’ubi ya. Mkpụrụ ahụ dị nta karịa mkpụrụ osisi niile, ma mgbe o tochara ọ na-akacha osisi niile.

N’ihi nke a, ụmụnnụnụ nke eluigwe na-abịa, kụa akwụ ha n’alaka ya. Alaeze eluigwe dịka akụ e zoro n’ubi nke otu nwoke hụrụ wee kpuchie ya ihe; o were ọñụ laa, ree ihe niile o nwere, bịa zụrụ ala ubi ahụ.

“Ọzọ, alaeze eluigwe dịka onye na-azụ ahịa nke na-achọ ụlarị ọma. Mgbe ọ hụrụ otu ụlarị dị oke ọnụ, ọ lara, ree ihe niile o nwere, wee zụta ụlarị ọma ahụ.

Igbo Mass readings for January 21 2024, Ụka nke Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for January 20 2024, Emume Ncheta Cyprian Michael Iwene Tansi Dị Ngọzi

Last Update: December 9, 2022