Igbo Mass Readings for September 14 2024, Emume Mmeri nke Obe.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 14 2024, Emume Mmeri nke Obe.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 21:4-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ
Ndị Izrel siri n’ugwu Họọ bilie ije, si n’ụzọ osimiri Mediterenia gaa Edọm gburugburu. Ma mgbe ha na-aga n’ụzọ, ha nwere nkolopu obi. Ha tamuru megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji kpọpụta anyị n’ljipt, ka anyị nwụchaa n’ịkpa ebe a?
Ihe oriri adịghị na ya. Ihe ọñụñụ adịghịkwa. Otu ụdị nri nke a na-atọ bụrịbụrị agbụla anyị!” Ya mere Yahweh zitere n’etiti ha ọtụtụ agwọ na-acha ka ọkụ nke nwekwara elo ọjọọ. Agwọ ndị a tagburu ọtụtụ n’ime ha.
Ya mere, ụmụ Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela. N’ihina anyị kwutọrọ gị na Yahweh. Biko rịọrọ anyị Yahweh, ka o wepụrụ anyị agwọ ndị a.”
Mosis kpeere ndị Izrel ekpere. Yahweh gwara Mosis ka o were ọla, kpụọ agwọ na-acha ka ọkụ, kokwasa ya n’okporo osisi ọkọlọtọ, ka onye ọbụla agwọ ahụ tara lere anya na ya wee dị ndụ.
Ya mere, Mosis kpụrụ agwọ ọla ọkụ kokwasa ya n’okporo osisi ọkọlọtọ. Onye ọbụla agwọ ahụ tara, legidekwara agwọ ọla ọkụ ahụ anya, nwetakwara ahụ ike.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 78: 1-2, 34-35, 36-37, 38,
Azịza: Ụnụ echezọla ọrụ nke Dinwenụ
1. Geenụ ntị n’iwu nke a ndị nke m,
Geenụ ntị n’ihe m na-ekwu;
Aga m agwa ụnụ okwu n’ilu
were kọwapụta ihe omimi nke ndụ ụnụ gara aga. Azịza
2. Mgbe ọbụla o gbuwere ha, ha na-achọ ya;
ha na-echegharị were obi ha niile chọba Chineke.
Ha chetara na Chineke bụ okwute ji ndụ ha,
Chineke kacha elu, onye nzọpụta ha. Azịza
3. Mana ha ji egbugbere ọnụ ha efe ya;
okwu ha niile bụ okwu asị,
obi ha akwụsịghị ike n’ebe ọ nọ,
ha edebeghịkwa ọgbụgbandụ ya. Azịza
4. N’agbanyeghị nke a, n’ihina ọ dị obi ebere
ọ gbaghaara ha mmehie ha niile,
were ghara ịla ha n’iyi;
ọtụtụ oge ka ọ na-ejide iwe ya n’ekweghị ka ọ dị ọkụ. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:6-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Filipi
Jesu, Onye agbanyeghị na ọ dị na ụdị Chukwu, mana o weghị onwe ya na ya na Chukwu ha dịka ihe a ga ejide aka. O buturu onwe ya ala, were onwe ya n’ọnọdụ odibo, a mụọ ya n’ụdị mmadụ.
A hụrụ ya n’ụdị nke mmadụ, o buturu onwe ya ala wee rube isi ruo n’ọnwụ, ọnwụ n’elu obe. N’ihi nke a, Chineke buliri ya elu, nye ya aha kacha aha niile, ka o wee bụrụ na n’aha Jesu ka ikpere niile ga-egbu n’ala, ma n’eluigwe, ma n’ụwa ma n’okpuru ụwa, ire niile ga-ekwupụta na Jesu Kristi bụ Dinwenụ maka otito nke Chukwu Nna.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Anyị esekporo gị Jesu anyị enye gị ekele, maka na obe gị dị asọ ka I jiri gbapụta ụwa.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 3: 13-17.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
O nwebeghị onye ọbụla rịgorola n’eluigwe mbụ ma ọ bụghị nanị Nwa nke mmadụ onye si n’eluigwe rịdata. Dịka Mosis si welie agwọ elu n’ime ọzara, otu ahụ ka a ga-esi welie Nwa nke mmadụ elu.
Ka onye ọbụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebeebe. N’ihina Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe.
Chineke zitere nwa ya n’ime ụwa, Ọ bụghị ka ọ maa ya ikpe kama ka azọpụta ụwa site n’aka ya.
Igbo Mass Readings for September 14 2024, Emume Mmeri nke Obe.