Igbo Mass Readings for April 25 2024, Emume Ncheta Maak dị Asọ – Ode Oziọma.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 25 2024, Emume Ncheta Maak dị Asọ – Ode Oziọma.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:5-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pita dere

Otu ahụkwa, ụnụ ndị na-eto eto, na-eruberenụ ndị okenye isi. Yirinụ umeala ka uwe, jeerenụ ibe ụnụ ozi. N’ihina: Chineke na-emegide ndị mpako, ma ndị dị umeala n’obi ka ọ na-enye amara.

Wedatanụ onwe ụnụ n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o welite ụnụ mgbe oge ya ruru. Hapụrụnụ ya nsogbu ụnụ niile, n’ihina mkpa ụnụ niile na-emetụ ya n’obi.

Anya doo ụnụ! Na-echenụ nche! N’ihina onye iro ụnụ, bụ Ekwensu, na-awagharị dịka ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-eri. Ma kwụdosienụ ike n’okwukwe ụnụ.

Ụnụ ekwekwala ya. Ụnụ maara nke ọma na ndị ụmụnna anyị n’ime Kristi n’ebe niile n’ụwa na-ahụ ụdị ahụhụ ndị a ụnụ na-ahụ. Mgbe ụnụ hụchara ahụhụ nwa oge, Chineke nke amara niile, onye kpọrọ ụnụ n’ime Kristi ka ụnụ keta oke n’ebube ebighịebi nke ya, ga-eme ka ụnụ zuo oke.

Ọ ga-enye ụnụ ike, mekwaa ka ụnụ kwụdosie ike. Ka ike niile bụrụ nke ya ruo mgbe ebighịebi. Amen. Edeteere m ụnụ nwa nkenke akwụkwọozi a site n’inye aka nke Slivanọs nwanne anyị, onye m hụrụ na o kwesịrị ntụkwasịobi.

Ana m arịọ ụnụ, na-ekwupụtakwa na nke a bụ amara Chineke n’ezie; kwụdosienụ ike n’ime ya. Nwanne ụnụ nwaanyị ahụ bi na Babịlọn, onye Chineke họpụtara ụnụ na ya, na-ekele ụnụ. Nwa m, bụ Mak, na ekelekwa ụnụ.

Nyerịtanụ onwe ụnụ ekele nke ịhụnaanya. Udo dịrị ụnụ niile, ndị nọ n’ime Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89: 2-3, 6-7, 16-17

Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe

1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe

bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

aga m na-ekwupụta ntụkwasịobi gị

 N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,

ikwesi ntụkwasịobi gị ga-akwụdosi ike dịka igwe. Azịza.

2. Eluigwe niile na-eto ọrụ ebube gị, O Osebụrụwa

ndị nsọ niile na-etokwa ikwụdosiike gị

O nwere onye a ga-eji tụnyere gị n’eluigwe, Onyenweanyị?

O nwere Mmụọozi gị na ya ha? Azịza

3. Ngọzi ga-adịrị ndị niile ji ukwe eto gị

Ndị na-aga n’ihe nke obiọma gị, O Onyenweanyị

Ha ga-añụrị ọñụ n’aha gị ụbọchị niile,

nyekwa gị otito maka eziomume gị. Azịza

MBEKU – 1 Cor 1:23-24

Alleluia, Alleluia:

Anyị onwe anyị na-ekwusa Kristi, onye a kpọgburu n’obe; onye bụ ike na amamihe nke Chineke.

Alleluia.

OZIỌMA – 16:15-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Gaanụ nụuwa niile, kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma. Onye nke kwerenụ, e mekwaa ya mmirichukwu, ka a ga-azọpụta, ma onye nke na-ekwenyeghị ka a ga-ama ikpe.

Ihe ịrịbaama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ: ha ga-achụpụ ajọ mmụọ n’aha m; ha ga-ekwu okwu n’asụsụ dị icheiche. Ọ bụrụ na ha achịrị agwọ n’aka, mọbụ ñụọ ihe ọbụla na-eweta ọnwụ, ọ gaghị emerụ ha ahụ.

Ha ga-ebikwasakwa ndị ọrịa aka, ahụ ha adịkwa ha mma. Ya mere mgbe Dinwenụ Jesu gwachara ha okwu, ọ rịgoro n’eluigwe wee nọrọ n’aka nri nke Chukwu.

Ndị na-eso ụzọ ya pụkwara kwusaba oziọma n’ebe niile, ebe Dinwenụ sokwa ha na-arụ ọrụ. Ọ na-emekwa ka okwu ha kwụsie ike site n’ihe ịrịbaama nke na-eso ya. Amen.

Igbo Mass readings for April 26 2024, Fraịde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 25 2024, Emume Ncheta Maak dị Asọ – Ode Oziọma.

Last Update: December 9, 2022