Igbo Mass Readings for March 17 2023, Emume Ncheta Patrick dị Asọ – Nna Ukwu nke Abụọ nke Naịjiria.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 17 2023, Emume Ncheta Patrick dị Asọ – Nna Ukwu nke Abụọ nke Naịjiria.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ nke Pita dere
Ọgwụgwụ ihe niile dị nsọ. Nweenụ uche zuru oke, nwekwaanụ anya udo, ka ụnụ nwee ike ikpe ekpere. Ma nke kachanụ, hụrịtanụ ibe ụnụ n’anya nke ukwu.
N’ihina ịhụnaanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. Na-elerịtanụ ibe ụnụ ọbịa nke ọma n’atamughị ntamu. Ụnụ niile n’otu n’otu natara onyinye amara nke Chineke.
Werenụ ya jeere ibe ụnụ ozi dịka ezi ndị nlekọta nke onyinye ahụ dị icheiche nke Chineke nyere ụnụ Onye ọbụla n’ime ụnụ na-ekwu okwuchukwu, ya kwuo naanị okwu si Chineke n’ọnụ pụta.
Onye ọbụla na-eje ozi, ya were ike Chineke nyere ya jeere ya ozi. Na-emenụ otu a ka e nye Chineke otito n’ihe niile site n’aka Jesu Kristi, onye nwe otito na ike niile, mgbe ebighịebi. Amen.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 95: 1-3, 7-8, 10.
Azịza: Kwupụta Ọrụ Ịtụnaanya nke Onyenweanyị n’ebe Mmadụ niile nọ
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
Ụwa niile kweere Onyenweanyị ukwe.
Kweere Onyenweanyị ukwe, too aha ya Azịza
2. Kwupụta nzọpụta ya ụbọchị niile.
Mee ka ụwa niile mara maka otito ya
Kwupụtakwa ọrụ ịtụnaanya nke Onyenweanyị
n’ebe mmadụ niile nọ. Azịza
3. Toonụ Onyenweanyị, ezinụụlọ niile dị n’ụwa
toonụ ebube ya na ike ya
Nye Onyenweanyị otito kwesịrị aha ya. Azịza
4. Kwusachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze
Ọ kwụwasiri ụwa ike. E nweghị ike ibugharị ya
Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ma Jesu sịrị ha, “Sobenụ m, aga m eme ụnụ ndị na-akụta mmadụ.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 5:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu guzo n’ọdọmmiri Genesaret, oke igwe mmadụ zukọrọ na-adagide ya ka ha nụrụ okwu Chineke. Ọ hụrụ ụgbọmmiri abụọ n’ụsọ ọdọmmiri ahụ; ma ndị ọkụazụ esila n’ụgbọ ahụ pụọ na-asa ụgbụ ha.
Ka Jesu banyere n’ime otu ụgbọ ahụ, nke bụ nke Saịmọn, Ọ gwara ya ka o si n’ala kwọpụ ụgbọmmiri ya ntakịrị. O wee nọdụ ala, si n’ụgbọmmiri ahụ n’akụziri ndị mmadụ ihe.
Mgbe Jesu kwubiri okwu, Ọ gwara Saịmọn sị, “Nupu ụgbọ gị n’ogbummiri wụnye ụgbụ gị maka igbu azụ.” Ma Saịmọn zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị dọlịrị abalị niile n’enwetaghị ihe ọbụla, mana otu I siri kwu, aga m awụnye ụgbụ m niile.”
Mgbe ha mere nke a, ha kụtara oke igwe azụ nke mere na ọ fọdụrụ ntakịrị ka ụgbụ ha dọkaa. Nke a mere ha ji kpọọ ndị ọkụazụ ibe ha nọ n’ụgbọ mmiri nke ọzọ ka ha bịa nyere ha aka.
Ha bịara gbujuo ụgbọ abụọ ahụ azụ, nke mere na ụgbọ ha malitere imikpu. Ma mgbe Saịmọn Pita hụrụ nke a, ọ dara na ụkwụ Jesu na-ekwu sị, “Si n’ebe m nọ pụọ, n’ihina abụ m onye njọ, O Dinwenụ m.”
N’ihina o juru Pita na ndị ya na so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Otu a ka o mekwara Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi bụ ndị ha na Saịmọn ndị nnwekọ.
Jesu zara Saịmọn sị, “Ụjọ atụla gị, site ugbu a gaba, Ị ga na-akụta mmadụ. Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ ha n’elu ala, ha hapụrụ ihe niile, sobe ya.
Igbo Mass readings for March 18 2023,
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.