Igbo Mass Readings for July 25 2024, Emume Ncheta Jemis dị Asọ – Nwaazụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 25 2024, Emume Ncheta Jemis dị Asọ – Nwaazụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke a dị oke ọnụahịa dịka ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si n’aka Chineke ọ bụghị n’aka anyị. A na-akpagbu anyị n’ụzọ ọbụla ma anyị adịghị anwụru ala; mgbe ụfọdụ anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba; ọtụtụ ndịiro na-esogbu anyị mana ndị enyi adịghị akọ anyị: ha na etida anyị n’ala, mana anyị adịghị ala n’iyi.

Anyị na-ebugharị n’ahụ anyị mgbe ọbụla ọnwụ Jesu, ka ndụ nke Jesu wee pụta ihe n’ahụ anyị. Mgbe ọbụla anyị dị ndụ anyị nọ n’ọnụ ọnwụ n’ihi Jesu, ka ndụ Jesu wee pụta ihe n’ahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.

Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsi ọrụ ike n’ime anyị, mana ndụ na-arụ ọrụ n’ime ụnụ. Ebe ọ bụ n’anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ dịka onye ahụ dere sị, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo”.

Anyị onwe anyị kwere, ebe anyị matara na onye ahụ kulitere Dinwenụ anyi Jesu Kristi ga-ekulitekwa anyị na Jesu ma kpọbatakwa anyị na ụnụ n’ihu ya.

Ihe ndị a niile bụ maka ihi ụnụ ka ọ ga-abụ amara na abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otito nke Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 126: 1-2, 2-3, 4-5, 6.

Azịza: Ndị niile ji anya mmiri na-akụ mkpụrụ, ji mkpu ọñụ ugbu a aghọ mkpụrụ.

1. Mgbe Osebụrụwa gbapụtara Zayọn n’ohu,

ọ dị anyị ka nrọ.

Oge ahụ ọchị na ukwe juru anyị ọnụ. Azịza

2. Ma ha na-ekwu na onwe ha na-asị;

“Lee ọrụ ịtụnaanya Chineke rụụrụ ha.”

Lekene ọrụ ịtụnaanya Onyenweanyị rụụrụ anyị,

n’ezie anyị na-enwe añụrị. Azịza

3. Kpọghachi ndị nke anyị e ji eji azụ, O Osebụrụwa,

dịka mmiri si alaghachi na Negeb!

Ndị niile ji anya mmiri na-akụ mkpụrụ.

ji mkpu ọñụ ugbu a aghọ mkpụrụ. Azịza

4. Mgbe ha na-apụ,

ha bu mkpụrụ akụkụ na-ebe akwa,

mgbe ha na-alọta,

ha bu ukwu ọka na-ekwe ukwe añụrị. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Ahọọrọ m ụnụ, wepụtakwa ụnụ iche ka ụnụ gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ; mkpụrụ nke ga-anọgide.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 20:20-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi kpọrọ ụmụ ya ndịikom abụọ bịakwute Jesu. O sekpuuru ala rịọ Jesu arịrịọ. Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ? Ọ zara sị, “Kwe m nkwa na ụmụ m abụọ ndị a ga-anọ otu n’aka nri, nke ọzọ n’aka ekpe n’alaeze gị.”

Ma Jesu gwara ha sị, “Ụnụ amaghị ihe ụnụ na-arịọ. Ụnụ nwere ike ịñụ iko ahụhụ nke mụ onwe m ga-añụ?” Ha asị ya, “Anyị nwere ike” Jesu sịrị ha, “N’eziokwu ụnụ ga-añụ iko m ga-añụ, mana ọ bụghị m ka ọdịịrị ikwu onye ga-anọ n’aka nri m mọbụ n’aka ekpe m, kama ọ bụ ndị niile Nna m kwadooro ya.”

Mgbe ụmụazụ ya mmadụ iri ndịọzọ nụrụ nke a, ha wesaara ụmụ nne abụọ ahụ iwe nke ukwu. Jesu kpọkọtara ha sị, “Ụnụ amarala na ndị na-achị achị n’etiti ndị mba ọzọ na-eji mmegbu na-achị ha dịka ndị nwe ha.

Ndị ukwu n’etiti ha na-egosịkwa na ike dị ha n’aka. Ma ọ gaghị adị otu a n’etiti ụnụ. Kama onye ọbụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti ụnụ ga-abụ onye na-ejere ụnụ ozi.

Ọzọkwa onye ọbụla nke na-achọ ịbụ onye mbụ n’etiti ụnụ ga-abụ ohu ụnụ niile, dịka o si bụrụ na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka a gbaara ya odibo, kama ka ọ gbara ndịọzọ odibo, bịa werekwa ndụ ya nye maka mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.

Igbo Mass readings for July 26 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume MAOBU Ncheta Joachim na Ann dị Asọ

Igbo Mass Readings for July 25 2024, Emume Ncheta Jemis dị Asọ – Nwaazụ.

Last Update: December 10, 2022