Connect with us
JUMIA TECH WEEK

Igbo Feasts Readings

Igbo Mass Readings for October 18 2024, Emume Ncheta Luke dị Asọ

Published

on

Igbo Mass Readings for October 18 2024, Emume Ncheta Luke dị Asọ – Ode Oziọma.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 18 2024, Emume Ncheta Luke dị Asọ – Ode Oziọma.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:9-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara Timoti

Gbaa mbọ bịakwute m n’oge na-adịghị anya. N’ihina Demas, onye hụrụ ụwa nke a n’anya agbahapụla m, gaa Tesolọnịka. Krisens agaala Galeshịa, Taịtus agaa Dalmesịa.

Naanị Luk nọnyeere m kpọrọ Mak ka gị na ya soro bịa. N’ihina ọ ga-enye aka n’ijere m ozi. Ezigala m Tichikus n’Efesus. Mgbe Ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi nke m hapụrụ na Troas, n’aka Kapus.

Wetakwara m akwụkwọ niile ahụ, nke ka nke, akwụkwọ ndekọta niile ahụ e ji akpụkpọ anụ mee. Alegzanda, onye na-akpụ ọla mere m nnukwu ihe ọjọọ.

Advertisement

Onyenweanyị ga-akwụghachi ya dịka omume ya si dị. Kpachara anya gị n’ebe ọ nọ, n’ihina ọ kwụsiri ike n’imegide ihe niile anyị kuziri. N’oge mbụ m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m.

Ha niile gbahapụrụ m. Ka Chineke gbaghara ha. Ma Onyenweanyị nọnyeere m, nye m ike ikwusa oziọma ahụ n’uju ka ndị mba ọzọ nụ ya. Ma Chineke zọpụtara m n’ọnụ ọdụm.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 145: 10-11, 12-13, 17-18.

Azịza: Ka mmadụ niile mara ọrụ ịtụnaanya gị niile, na ebube dị elu nke alaeze gị.

1. Onyenweanyị, ihe niile I kere ga-ekele gị,

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Advertisement

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị,

ma kwupụtakwa ịdị ike gị. Azịza

2. Ka mmadụ nille mata ọrụ ịtụnaanya gị niile,

na ebube dị elu nke alaeze gị.

Alaeze gị ga-adị ebeebe,

Advertisement

ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile. Azịza

3. Onyenweanyị dị mma n’ụzọ ya niile,

ọrụ aka ya niile na-egosi ịhụnaanya.

Onyenweanyị nọ ndị nile na-akpọkụ ya nso,

ndị ji ezi obi na-akpọku ya. Azịza

Advertisement

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Ọ bụghị ụnụ họọrọ m, kama ahọọrọ m ụnụ ka ụnụ gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-anọgide.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 10: 1-9.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe nke a gachara, Dinwenụ họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ, zipụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọbụla na n’ebe ọbụla ya onwe ya gaje ịbịa.

Advertisement

O wee gwa ha sị, “Owuwe ihe ubi buru ibu, ma ndị ọrụ dị olemole. Ya mere, rịọnụ Nna ukwu nke owuwe ihe ubi, ka o zite ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” Gabanụ; lee ana m ezipụ ụnụ dịka ụmụntakịrị n’etiti agụowuru.

Ụnụ ewela akpaego, mọbụ akpa ọbụla, mọbụ akpụkpọụkwụ. Ụnụ ekelekwala onye ọbụla n’ụzọ. Ụlọ ọbụla ụnụ banyere, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a!”

Ọ bụrụ na nwa nke udo nọ ebe ahụ, udo ụnụ ga-adakwasa ya, ma ọ bụrụ na ọ nọghị, udo ụnụ ga-alọghachitara ụnụ. Nọdụnụ n’otu ụlọ ahụ, na-erinụ na-añụkwanụ ihe ọbụla ha nyere ụnụ n’ihina onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.

Ụnụ esikwala n’ụlọ fere n’ụlọ. Mgbe ụnụ banyere n’ụlọ ọbụla ha nabata ụnụ, rienụ ihe ọbụla ha chere ụnụ n’ihu: Gwọọnụ ndị ọrịa nọ n’obodo ahụ, gwanụ ndị obodo ahụ sị, “Alaeze Chineke abịaruola ụnụ nso.”

Igbo Mass readings for October 19 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Advertisement

Igbo Mass Readings for October 18 2024, Emume Ncheta Luke dị Asọ – Ode Oziọma.

Continue Reading
Advertisement

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.