Igbo Mass Readings for October 28 2024, Emume Ncheta Saịmọn na Jude dị Asọ – Ụmụazụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 28 2024, Emume Ncheta Saịmọn na Jude dị Asọ – Ụmụazụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:19-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degara ndị Efesus
Ya bụ ụnụ esorola ndị nsọ bụrụ ndị a mụrụ n’ala, n’ezinụụlọ Chineke; nke a rụkwasara n’elu ntọala nke ụmụazụ na ndị amụma, nke Jesu Kristi n’onwe ya bụ okwute ntọala ya.
Ọ bụ n’ime ya ka ihe ndị a niile jikọtara ọnụ, too, wee bụrụ ụlọ nsọ n’ime Dinwenụ. N’ime ya ka arụnyekwara ụnụ dịka ebe obibi nke Chineke n’ime mmụọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 19: 1-2, 3-4.
Azịza: Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.
1. Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke,
ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,
Ụbọchị niile na-ekwupụta ya,
Abalị ọbụla na-egosipụta amamihe nke Chineke. Azịza
2. Ha anaghị ekwu okwu
nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ,
Mana olu ha na-agazu ụwa niile.
Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 6: 12-19.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’ụbọchị ndị a Jesu rigoro n’elu ugwu ikpe ekpere n’abalị niile, Ọ nọgidere n’ikpere Chineke. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sikwa n’ime ha họpụta mmadụ iri na abụọ ndị Ọ kpọrọ ụmụazụ.
Saịmọn onye ọ kpọrọ Pita na Andru nwanne ya, na Jemis na Jọn na Filip na Batolomiu, na Matiu na Tọmọs, na Jemis nwa Alfeus, na Saịmọn onye a na-akpọ Zilọt, na Judas nwa Jemis, na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.
Jesu na ndị ụmụazụ rịdatara ga-guzoro n’ebe dị larịị ya na igwe ndị na-eso ụzọ ya, na oke igwe mmadụ ndị ọzọ ndị si n’obodo niile dị na Judia na Jerusalem, nakwa n’ụsọ oke osimiri dị n’ala Taya na Saịdọn, ndị bịara ka ha nụrụ ihe Ọ na-ekwu ma nwetakwa ọgwụgwọ ọrịa; ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu nwetakwara ọgwụgwọ.
Igwe mmadụ ahụ niile chọrọ ụzọ ka ha metu ya aka, n’ihina ike si n’ahụ ya na-apụta na-agwọ ha niile.
Igbo Mass readings for October 29 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for October 28 2024, Emume Ncheta Saịmọn na Jude dị Asọ – Ụmụazụ.