Igbo Mass Readings for July 3 2024, Emume Ncheta Tọmọs dị Asọ – Nwaazụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 3 2024, Emume Ncheta Tọmọs dị Asọ – Nwaazụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:19-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Efesus

Ya bụ ụnụ esorola ndị nsọ bụrụ ndị amụrụ n’ala, ezinụụlọ Chineke, nke a rụkwasara n’elu ntọala nke ụmụazụ na ndị amụma, nke Jesu Kristi na onwe ya bụ okwute ntọala ya.

Ọ bụ n’ime ya ka ihe ndị a niile jikọtara ọnụ, too, wee bụrụ ụlọnsọ n’ime Dinwenụ. N’ime ya ka a rụnyekwara ụnụ dịka ebe obibi nke Chineke n’ime mmụọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 117: 1, 2.

Azịza: Gaanụ n’ụwa niile kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma.

1. Toonụ Onyenweanyị, mba niile,

Toonụ ya, ndị mmadụ niile. Azịza

2. N’ihina ịhụnaanya ya siri ike,

nkwụdosiike ya na-adị ọkpụ. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Ị kwerela Tọmọs n’ihina Ị hụrụ m? Ngọzi ga-adịrị ndị na-ahụghị ma kwere.”

ALLELUIA.

OZIỌMA – 20: 24-29.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Otu onye n’ime ndị ụmụazụ Jesu iri na abụọ ahụ bụ Tọmọs, nke a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jesu bịara. Ndị na-eso ụzọ Jesu ndịọzọ gwara ya sị, “Anyị ahụla Onyenweanyị.”

Ma Ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na m ahụghị n’aka ya apa ntu, tinyekwa mkpịsịaka m n’apa ntu ahụ, tinyekwa mkpịsịaka m n’akụkụ ya, agaghị m ekwe.” Mgbe mkpụrụ ụbọchị asatọ gachara, ndị na-eso ụzọ ya nọkwa n’ime ụlọ ọzọ, Tọmọs sokwa ha nọrọ.

N’agbanyeghị na-agbachichara ụzọ niile agbachi, Jesu bịa kwụrụ n’etiti ha, sị ha, “Udo dịrị ụnụ.” Ọ sịrị Tọmọs, “Tinye mkpịsịaka gị ebe a, lekwaa aka m abụọ.

Wepụta aka gị, tinye n’akụkụ m. Arụla ụka, kama kwere.” Tọmọs etie sị, “Onyenwe m na Chineke m!” Jesu asị ya, “I kwerela n’ihina Ị hụrụ m? Ngọzi ga-adịrị ndị na-ahụghị ma kwere.”

Igbo Mass readings for July 4 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 3 2024, Emume Ncheta Tọmọs dị Asọ – Nwaazụ.

Last Update: December 10, 2022