Igbo Mass Readings for August 6 2024, Emume Nnwogha nke Onyenweanyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 6 2024, Emume Nnwogha nke Onyenweanyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:9-10, 13-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Daniel

Ka m na-ele anya ahụrụ m ka e doziri ocheeze, onye ahụ dịnụ site na mbụ weere oche ya, uwe ya na-acha ka akụmmiriigwe, ntụtụisi ya na-achakwa ka owu ọcha.

Ocheeze ya bụ ire ọkụ, ụkwụ ya bụkwa ọkụ na-enwu enwu. Nnukwu ire ọkụ si n’ebe Ọ nọ wee na-apụta, puku kwuru puku ndị mmụọozi nọ ya gburugburu imere ya ihe ọbụla Ọ chọrọ.

Otu a kwa ka nde kwuru nde mmadụ siri kwụrụ ya n’ihu, na-eche ka o kpee ha ikpe. Ọ dịghị anya e bido ikpe ikpe wee meghee akwụkwọ ikpe. Ahụkwara m na nrọ ahụ onye dịka nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’urukpu ojii.

Ọ bịara n’ebe onye ahụ dị na mbụ nọ, e duga ya n’ihu ya. E nyere ya ike ọchịchị na otito na ala eze, ka mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile wee gbaara ya odibo. Ọchịchị ya enweghị njedebe, ọ gaghị agafe agafe nke a ga-emebi ya emebi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 97: 1-2, 5-6, 9.

Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.

1. Onyenweanyị bụ eze! ka ụwa ñụrịba;

Ñụrịbanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu.

Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri;

o jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ were tọọ ntọala ocheeze ya. Azịza

2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ

n’ihu Onyenweanyị nke uwa niile.

Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya,

mba niile na-ahụkwa otito ya. Azịza

3. N’ihina ị bụ Onyenweanyị,

onye kachasị elu n’ụwa niile,

onye kachasị chi ndịọzọ elu. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:16-19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pita dere

Mgbe anyị mere ka ụnụ mata ike na ọbịbịa nke Onyenweanyị Jesu Kristi, ọ bụghị akụkọ ifo ka anyị kọọrọ ụnụ. Kama anyị jiri anya anyị hụ ịdị ukwu ya.

Anyị nọ ebe ahụ mgbe Chineke Nna kwanyeere ya ugwu, nyekwa ya otito, mgbe otu olu dakwara n’ebube, sị, “Nke a bụ Nwa m hụrụ n’anya, onye ihe ya na amasị m!”

Anyị nụrụ olu ahụ si n’eluigwe n’ihina anyị na ya nọ n’elu ugwu ahụ. O doola anyị anya na ihe ahụ ndị amụma kwuru bụ eziokwu. Gbakwaanụ mbọ na-ege ntị n’okwu ahụ dị ka ọkụ nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ n’obi ụnụ, anyanwụ ụtụtụ achawapụta na ya.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Nke a bụ Nwa m hụrụ n’anya, onye ihe ya na-amasị m, geenụ ya ntị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 17:1-9 (AFỌ NKE MBỤ)

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ka ụbọchị isii gachara Jesu kpọọrọ Pita, Jemis na Jọn nwanne ya rịgoro n’otu ugwu dị oke elu. Jesu gbanworo onwe ya n’ihu ha. Ihu ya mụkekwara dịka anyanwụ, uwe ya na-enwukwa dịka ihe.

Ozigbo ahụ ha hụrụ Mosis na Elaija ka ha na Jesu na-ekwurịta ụka. Pita gwara Jesu sị, “Dinwenụ, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a; Ọ bụrụ na Ị chọọ aga m ewu ụlọ ikwu atọ n’ebe a: otu maka gị, otu maka Mosis, nke ọzọ maka Elaija.”

Mgbe Pita ka kpụ okwu n’ọnụ, urukpu ọcha kpuchidoro ha, otu olu si na urukpu ahụ daa sị, “Nke a bụ Nwa m m hụrụ n’anya, onye ihe ya na-amasị m, geenụ ya ntị.”

Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu ahụ, ha tụrụ oke egwu, daa n’ala kpuchie ihu ha. Jesu bịara metụ ha aka sị, “Bilienụ, ụnụ atụla egwu.” Mgbe ha lelitere anya elu, ha ahụghị onye ọzọ beeresọ Jesu.

Ka ha si n’elu ugwu ahụ na-arịdata, Jesu dọsiri ha aka na ntị ike sị, “Ụnụ agwakwala onye ọbụla ihe ụnụ hụrụ ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-esi n’ọnwụ bilie.”

OZIỌMA – 9:2-10 (AFỌ NKE ABỤỌ)

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe ụbọchị isii gachara Jesu kpọọrọ Pita, Jemis na Jọn, duru ha rịgoro otu ugwu dị elu. Ha nọdụrụ iche naanị ha. Jesu nwoghara n’ihu ha. Uwe ya niile na-egbuke egbuke, na-acha oke ọcha, otu ọsaakwa ọbụla nọ na ụwa na-apụghị ime ka ha dị.

Elaija na Mosis pụtakwara n’etiti ha, ha na Jesu na-akparịta ụka. Pita sịrị Jesu, “Onye nkuzi, ọ dị mma na anyị nọ ebe a; ka anyị rụọ ụlọ ikwu atọ; otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Elaija.”

Pita kwuru nke a ebe ọ bụ na ọ maghị ihe ọ ga-ekwu na n’ihina oke egwu ji ya na ndị na-eso ụzọ Jesu mmadụ abụọ ndịọzọ. Urukpu wee kpugide ha, olu sikwa n’urukpu ahụ sị, “Onye a bụ Nwa m, m hụrụ n’anya geenụ ya ntị.”

Ozigbo ahụ ha legharịrị anya gburugburu. Ha ahụghịkwa onye ọbụla ọzọ ha na ha nọ belụsọ Jesu. Mgbe ha si n’elu ugwu na-arịdata, Jesu dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ị kọọrọ onye ọbụla ihe ha hụrụ, ruo mgbe Nwa nke mmadụ bilitechara n’ọnwụ.

Ha zobere okwu a n’etiti onwe ha, na-ajụrịkọta onwe ha ihe ọ pụtara bụ isi na ndị nwụrụ anwụ bilie.

OZIỌMA – 9:28-36 (AFỌ NKE ATỌ)

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka ihe dịka ụbọchị asatọ gachara mgbe Jesu kwuchara okwu ndị a, Ọ kpọọrọ Pita, Jemis, na Jọn wee rịgoro n’elu ugwu ikpe ekpere. Mgbe Ọ na-ekpe ekpere ihu ya enwoghaa.

Uwe ya bidoro chaba ọcha nke ukwu. Ma lee, ya na mmadụ abụọ na-akparịta ụka. Ndị ahụ bụ Mosis na Elaija. Ndị pụtara n’otito wee kwuo okwu maka nlaghachi ya nke Ọ ga-emezu na Jerusalem.

N’oge ahụ ụra ji Pita na ndị ya na ha nọ nke ukwu; ha hụrụ ebube ya tinyekwara mmadụ abụọ ya na ha guzoro. Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-ahapụ Jesu laba, Pita sịrị Jesu, “Nna anyị ukwu ọ dị mma na anyị nọrọ ebe a, ka anyị rụọ ụlọ ikwu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Elijah.”

Ma Pita amaghị ihe ọ na-ekwu. Ka ọ na-ekwu nke a, urukpu bịara kpugide ha; ha wee tụọ oke egwu ka urukpu ahụ na-ekpugide ha. Olu siri n’urukpu ahụ daa sị, “Nke a bụ Nwa m, onye m họọrọla, geenụ ya ntị!”

Mgbe olu ahụ kwuchara ha hụrụ nanị Jesu, ma ha mechiri ọnụ ha, ha akọrọghị onye ọbụla n’oge ahụ akụkọ ọbụla banyere ihe ha hụrụ.

Igbo Mass readings for August 7 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 6 2024, Emume Nnwogha nke Onyenweanyị.

Last Update: December 10, 2022