Igbo Mass Readings for Ascension of the Lord – May 9 2024, Nnukwu Emume Nrọgoro n’Eluigwe nke Dinwenụ Jesu Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Ascension of the Lord – May 9 2024, Nnukwu Emume Nrọgoro n’Eluigwe nke Dinwenụ Jesu Kristi
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-11
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Ezigbo Tiofilus, N’akwụkwọ nke mbụ edere m ihe banyere ihe niile Jesu mere na nke ọ kụziri n’oge Ọ malitere ọrụ Ya, ruo ụbọchị ọ rịgooro n’eluigwe mgbe O nyechara ụmụazụ ya iwu site n’ike nke Mmụọ Nsọ.
Mgbe ọ tachara ahụhụ nke ọnwụ o gosiri ha onwe ya na ya dị ndụ n’ụzọ dị iche-iche n’ime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke. Mgbe ha na ya nọ, o nyere ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pụọ kama ka ha chere nkwa nke Nna kwere nke ụnụ nụrụ n’ọnụ m.
Ma Jọn jiri mmiri mee ndị mmadụ mmirichukwu ma n’oge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ eme ụnụ mmirichukwu. Mgbe ha gbakọrọ ha jụrụ Jesu sị, “Onyenweanyị, Ọ bụ n’oge a ka ị ga-enyeghachi Izrel alaeze?”
Jesu azaa ha sị, “Ọ bụghị ihe dịịrị ụnụ ịma oge, ma ọ bụ ụbọchị nke Nna m debere n’ike nke aka ya. Kama ụnụ ga-anata ike mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị ụnụ.
Ụnụ ga-abụkwa ndị akaebe m, n’ime Jerusalem na n’ime Judia na Sameria niile, ruokwa ngwụcha ụwa niile. Mgbe Jesu kwuchara okwu ndị a ha nọ na-ele anya e welie Jesu elu, igwe oji wee kpuchie ya wepụ ya n’anya ha.
Ha legidere anya n’elu ka ọ na-aga, na mberede, ụmụnwoke abụọ yi uwe nruala ọcha kwụụrụ ha nso, sị ha, “Ndị Galili! Gịnị mere ụnụ ji guzoro na-ele anya n’eluigwe? Jesu a onye nke si n’etiti ụnụ rịgoro n’eluigwe ga-abịaghachikwa ọzọ dịka ụnụ siri hụ ya ka ọ na-ala n’eluigwe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 47: 2-3, 6-7, 8-9.
Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ gbagoo, Onyenweanyị ji olu opiike arịgo.
1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka ụnụ,
were mkpu ọñụ tikuo Chineke.
N’ihi na Onyeneanyị onye kacha dị elu ka anyị ga-atụrụ egwu,
ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile. Azịza
2. Chineke ji mkpu ọñụ agbago,
Onyenweanyị ji olu opiike arịgo.
Kweerenụ Chineke anyị ukwe otito,
kweerenụ ya ukwe,
kweerenụ eze anyị ukwe otito,
kweerenụ ya ukwe. Azịza
3. Chineke bụ eze nke ụwa niile,
werenụ ukwe abụọma kweere ya ukwe otito,
Chineke bụ eze na-achị mba niile,
Ọ nọ n’oche eze ya dị nsọ. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:17-23
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pọl Degaara ndị Efesus
Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, nye ụnụ mmụọ nke amamihe na nke mkpughe iji mata ya. Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ, na ihe bụ akụ nke nketa ahụ dị ebube n’etiti ndị nsọ ya; na ihe bụ ịdị ukwu na-enweghị atụ nke ike ya n’ime anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ọrụ nke ike aka ya siri dị.
Nke a bụ nke o mejupụtara n’ime Kristi mgbe o siri n’ọnwụ kulie ya, mekwaa ka ọ nọrọ n’akanri ya n’alaeze eluigwe, ka ọ nọdụ n’ebe dị elu karichaa ọchịchị niile na ike niile na ị bụ isi niile bịa dịkwa elu karịa aha ọbụla a marala, ọ bụghị naanị n’ọgbọ nke a, kama ma ọgbọ nke ga-abịanụ.
Chineke edobekwala ihe niile n’okpuru ụkwụ ya, mekwaa ya isi ihe niile maka nzukọ ya, nke bụ ahụ, ya na uju nke onye ahụ na-emezu ihe niile jupụtara ihe niile.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, a nọnyeere m ụnụ oge niile ruo na njedebe nke oge.”
ALLELUIA.
OZIỌMA – 28:16-20.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Mmadụ iri na otu bụ ndị na-eso ụzọ Jesu gara Galili n’ugwu ahụ nke ọ gwara ha. Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọọrọ ya isi ala. Ma ụfọdụ nwere obi abụọ. Jesu bịakwutere ha, gwa ha sị: “Enyela m ike niile dị n’eluigwe na ụwa.
Ya bụ, gaanụ, meenụ ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha mmirichukwu n’aha nna, na nwa na mmụọ nsọ. Kuzierenụ ha idobe ihe niile nke m nyere ụnụ n’iwu. Lee, a nọnyeere m ụnụ oge niile ruo na njedebe nke oge.”
Igbo Mass Readings for May 10 2024, Fraịde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Igbo Mass Readings for Ascension of the Lord – May 9 2024, Nnukwu Emume Nrọgoro n’Eluigwe nke Dinwenụ Jesu Kristi