Igbo Mass Readings for Sacred Heart of Jesus – June 7 2024, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Abụọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for Sacred Heart of Jesus – June 7 2024, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Abụọ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1, 3-4, 8-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Hoseya

Mgbe Izrel bụ nwata, ahụrụ m ya n’anya, e sikwa m n’ljipt kpọpụta nwa m. Ma, ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ekuuru m ha n’aka m, ma ha amaghị na ọ bụ m gwọrọ ha, na-elekọta ha anya.

Ejiri m ịhụnaanya wee duo ha. Ebupụrụ m ha ibu arọ ha bu, hulata ala nye ha nri n’ọnụ. Kedụ ka m ga-esi hapụ gị O Ifrem? Kedụ ka m ga-esi gbahapụ gị O Izrel?

Kedụ ka m ga-esi mee gị ka Adam; mọbụ kpaso gị agwa ka Zaboim? Obi agaghị ekwe m ime ya n’ihina ebere na ịhụnaanya m siri ike n’ebe ị nọ.

Agaghị m ata ụnụ ahụhụ n’oke iwe m, agaghịkwa m emebi Izrel ọzọ. N’ihina abụ m Chineke, abụghị m mmadụ, onye dị nsọ nọ n’etiti ụnụ, agaghị m abịa imebi gị ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Aịzaya 12:2-3, 4, 5-6

Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta

1. Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;

enwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m;

N’ihina Yahweh Chineke bụ ike m na ukwe m,

ọ bụ onye nzọpụta m

Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta. Azịza

2. “Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,

Meenụ ka a mata aka ọrụ ya n’ebe mba niile nọ,

kwupụtanụ na aha ya dị elu. Azịza

3. Bụọrọnụ Yahweh abụọma, n’ihina ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube;

meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile.

Tisienụ mkpu ike, kweenụ ukwe ọñụ, ụnụ ndị bi na Zayọn,

N’ihina onye nọ n’etiti ụnụ

bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:8-12, 14-19

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Efesọs

N’ebe m nọ n’agbanyeghị na m kacha dị nta n’etiti ndị nsọ niile, e nyere m ngozi nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ enweghị atụ nke juru n’ime Kristi; mekwaa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmaatụ nke ihe omimi e zoro n’ime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ.

Site na nzukọ ahụ, a ga-eme ka amamihe Chineke n’ụdị ya dị icheiche bụrụ ihe ọchịchị na ike niile nke dị n’eluigwe ga-amata. Nke a bụ n’usoro nke atụmaatụ ya dị ebeebe, nke e mezuru n’ime Jesu Kristi Dinwenụ anyị; bụ onye anyị nwere ntụkwasịobi na obi siri ike ịbịakwute site n’okwukwe anyị nwere na ya.

N’ihi nke a ka m ji gbuoro Nna ikpere m abụọ n’ala, onye ezinụụlọ niile dị n’eluigwe na nke dị n’ụwa si nweta aha. Ka o wee bụrụ na site n’ụba nke otito ya, ọ ga-eme ka ụnụ sie ike na Mmụọ ya nke dị ụnụ n’ime; ka Kristi nwee ike biri n’obi ụnụ site n’okwukwe, ka ụnụ ndị gbanyere mgbọrọgwụ kwụdosikwa ike n’ịhụnaanya, nwee ike isoro ndị nsọ niile ghọta, ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, na ịmatakwa ịhụnaanya nke Chineke nke karịrị amamihe, ka ụnụ jupụtakwa n’izu oke niile nke Chineke.

MBEKU – Matiu 11:29

Alleluia, Alleluia:

Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ, n’ihina adị m nwaayọ dịkwa obi umeala.

Alleluia

OZIỌMA – 19:31-37

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Ebe ọ bụ ụbọchị nkwado Emume oriri Ngabiga, ndị Juu rịọrọ Paịlet ka a kụjichaa ụkwụ ha buda ozu ha, ka ha ghara ikoro n’elu obe ruo Sabat, n’ihina Sabat nke a pụrụ iche.

Nke a mere ndịagha jiri bịa kụjichaa ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na Jesu. Mgbe ha rutere ebe Jesu nọ, ha hụrụ na ọ nwụọla, ha wee hapụ ịkụji ya ụkwụ.

Kama otu onye n’ime ndị agha jiri ube mapuo ya akụkụ. Otu ihu ahụ, ọbara na mmiri agbapụta. Nke a bụ akaebe nke onye jiri anya ya hụ ihe merenụ.

Akaebe ya bụkwa eziokwu. Ya makwa na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, ka ụnụ wee kwere. Ihe ndị a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị, Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.

E dekwara n’ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ sị, Ha ga-elekwasị ya anya bụ onye ha jiri ube mapuo akụkụ.

Igbo Mass Readings for June 8 2024, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ MAOBU Satọde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for Sacred Heart of Jesus – June 7 2024, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Abụọ

Last Update: December 10, 2022