Igbo Mass Readings for June 27 2025, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 27 2025, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 34:11-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Izikel
N’ihina, otu a ka Yahweh Chineke kwuru: Lee mụ onwe m ga-ajụ ajụjụ banyere atụrụ m, aga m achọgharị ha. Dịka onye ncheatụrụ si achọghari atụrụ ya mgbe ụfọdụ n’ime ha gbasara n’ebe dị anya, otu ahụ ka m ga-esi achọgharị atụrụ m, aga m azọpụta ha, site na ebe niile ha gbasara n’ụbọchị oke urukpu na oke ọchịchịrị.
Aga m esi n’igwe ndị mmadụ kpọpụta ha, si na mba dị iche-iche chịkọta ha ọnụ, na kpọbata ha n’ala nke aka ha; aga m azụ ha n’ugwu niile nke Izrel, n’akụkụ ebe niile iyi si asọpụta na n’ebe obibi niile nke ala ahụ.
Aga m eji ezi ihe oriri zụọ ha, n’elu ugwu niile dị elu nke Izrel ka ha ga-akpa nri, n’ebe ahụ ka ha ga-amakpu, n’ezi ebe ịta nri, na achara mara mma ka ha ga-azụ onwe ha nri n’ugwu niile nke Izrel.
Mụ onwe m ga-abụ onye nche nke ụmụatụrụ m, aga m eme ka ha makpuru ala, Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu. Aga m achọ ndị furu efu, aga m akpọghachi ndị gbafuru ụzọ, aga m ekekọta ndị ọkpụkpụ ha na-adịghị ike; aga m agba ndị ike adịghị ume.
Aga m elekọta ndị mara abụba na ndị dị ike anya. Aga m abụ ezigbo onye nche atụrụ na ebe ha nọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 23: 1-3, 3-4, 5, 6.
Azịza: Chineke bụ Onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ
1. Chineke bụ Onyenche m O nweghị ihe m ga-achọ
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị
Ọ na-eduga m na mmiri
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike. Azịza
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume
n’ihi aha ya
Ọbụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ
egwu ọbụla agaghị atụ m
I ji mkpara na ngu gị nọdebe m
Ọ bụ ha na-enye m agbamume. Azịza
3. Ị na-akwadoro n nri
n’ihu ndịiro m
I teela isi m mmanụ
iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu. Azịza
4. N’ezie, obiọma na ebere ga na-eso m
ụbọchị ndụ m nile
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
ebeebe ebeebe. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:5-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom
Nchekwube ahụ adịghịkwa aghọ anyị ahịa. N’ihina Chineke awụnyela ịhụnaanya ya n’ime obi anyị site na onyinye nke Mmụọ Nsọ. N’ihina mgbe anyị nọ n’enweghị ike imere onwe anyị ihe ọbụla, mgbe oge Chineke kara ruru, Kristi nwụrụ n’ihi ndị amaghị Chineke.
Ọ bụ ihe siri ike otu onye ịnwụ n’ihi otu onye eziomume. Eleghị anya, mmadụ nwere ike ịnwụrụ onye eziomume. Ma Chineke mere ka ịhụnaanya ya n’ebe anyị nọ pụta ihe.
N’ihina mgbe anyị ka bụ ndị njọ, Kristi nwụrụ maka anyị. Ya bụ, ebe agụrụla anyị na ndị eziomume ugbu a site na ọbara ya, o were anya na-aga azọpụta anyị karịa n’iwe Chineke, site n’aka ya.
Ọ bụrụ na e meziri agbata anyị na Chineke site n’ọnwụ Nwa ya, mgbe anyị ka bụ ndịiro ya, ugbu a anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya.
Ma ọ bụghị naanị nke a; anyị na-añụrịkwa ọñụ n’ime Chineke site n’Onyenweanyị Jesu Kristi, onye mere ka anyị na Chineke dị na mma ugbu a.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Abụ m ezigbo onye nche atụrụ, amaara m atụrụ m, atụrụ m marakwa m.
ALLELUIA
OZIỌMA – 15:3-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu wee jiri ụkabụilu a gwa ha okwu sị, “Olee onye n’ime ụnụ nwere otu narị atụrụ, otu n’ime ha efuo, ọ ghara ịhapụ iri itoolu na itoolu ndị ọzọ gaa ịchọ otu ahụ furu efu ruo mgbe ọ ga-achọta ya?
Ma mgbe ọ chọtara ya, ọ na-atụkwasa ya n’ubu ya n’añụrị. Mgbe ọ lọtara ụlọ, ọ na-akpọkọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha, ‘Soronụ m ñụrịa n’ihina achọtala m atụrụ furu efu.
N’otu aka ahụ, agwa m ụnụ, oke ọñụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye njọ chegharịrịnụ karịa n’isi mmadụ iri itoolu na itoolu ndị nchegharị na-adịghị mkpa.”
Igbo Mass readings for June 28 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume MAỌBỤ Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.