Igbo Mass Readings for February 22 2024, Emume Oche Pita dị Asọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 22 2024, Emume Oche Pita dị Asọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pita dere
Ana m agba ndị okenye nọ n’etiti ụnụ ume; mụ onwe m bụkwa okenye. Abụ m onye akaebe nke ahụhụ niile Kristi tara, bụrụkwa onye ga-eso keta oke n’otito ahụ a ga-ekpughe.
Ana m arịọ ụnụ: Na-azụnụ igweatụrụ nke Chineke tinyere ụnụ n’aka. Na-elekọtanụ ha anya nke ọma dịka Chineke si chọọ. Ọ bụghị na mmanye, kama dịka ndị o siri n’obi pụta.
Na-arụnụ ọrụ ụnụ, ọ bụghị naanị n’ihi ụgwọ ọ ga-akwụ ụnụ kama n’ihina ọ na-anụ ụnụ ọkụ n’obi ime ya. Ụnụ emegbula ndị nọ na okpuru ụnụ na ndị ụnụ nwe.
Kama meenụ onwe ụnụ ihe eji amaatụ nke igweatụrụ ahụ ga-eñomi. Mgbe onyeisi ọzụzụ atụrụ ahụ ga-apụta ihe ụnụ ga-anatakwa okpueze ahụ nke ebube ya na-adịgide.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 23:1-3,3-4,5,6
Azịza: Chineke bụ onye nche m, o nweghị ihe m ga-achọ.
1. Chineke bụ onyenche m,
onweghị ihe m ga-achọ,
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị.
Ọ na- eduga m na mmiri,
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike. Azịza
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume,
n’ihi aha ya,
Ọbụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ,
egwu ọbụla agaghị atụ m
i ji mkpara na ngu gị nọdebe m,
Ọ bụ ha na-enye m agbamume. Azịza
3. Ị na-akwadoro m nri,
n’ihu ndịiro m,
I teela isi m mmanụ,
iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu. Azịza
4. N’ezie obiọma na ebere ga na-eso m,
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
ebeebe ebeebe! Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ya bụ, agwa m gị, ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m, ọnụụzọ ọkụmmụọ agaghị emerinata ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 16: 13-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu bịaruru n’obodo Sizeria Filipi, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na nwa nke mmadụ bụ?” Ha sịrị ya, “Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu.
Ndịọzọ na ekwu na ọ bụ Elaịja. Ma ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Jeremaya mọbụ otu onye n’ime ndị amụma.” Ma ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ụnụ na-ekwu na m bụ?” Saịmọn Pita zara sị, “Ị bụ Kristi, nwa nke Chukwu dị ndụ.”
Jesu wee zaa ya sị, “Ị bụ onye a gọziri agọzi Saịmọn nwa Jona! N’ihina ọ bụghị mmadụ kpugheere gị eziokwu nke a, kama ọ bụ Nna m nke bi n’eluigwe.
Ya bụ, agwa m gị, ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m, ọnụụzọ ọkụmmụọ agaghị emerinata ya. Aga m achịnye gị mkpịsịgodo nke Alaeze eluigwe.
Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ n’elu ụwa, a ga-ekekwa ya n’eluigwe. Ihe ọbụla Ị ga-atọpụ agbụ n’elu ụwa, a ga-atọpụkwa ya n’eluigwe.”
Igbo Mass readings for February 23 2024, Fraịde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for February 22 2024, Emume Oche Pita dị Asọ.