Igbo Mass Readings for June 28 2024, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụka Nche Abalị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 28 2024, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụka Nche Abalị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi

Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga n’ụlọnsọ ikpe ekpere n’elekere nke atọ n’ehihie bụ oge ekpere. Ha hụrụ otu nwoke dara ngwọrọ site na nwata. Ndị nwe nwoke a na-atọgbọchi ya kwa ụbọchị n’ọnụụzọ ụlọnsọ Chineke nke a na-akpọ “Ọnụụzọ mma” ịrịọ onyinye ebere n’aka ndị na-aba n’ime ụlọnsọ Chineke.

Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ị banye n’ụlọnsọ Chineke ọ rịọrọ ha ego. Ma Pita na Jọn legidere ya anya, sị ya, “Lee anyị anya!” O lee ha anya na-atụ anya ịnata ihe n’aka ha.

Ma Pita sịrị ya, “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo kama ihe m nwere ka m ga-enye gị; n’aha Jesu Kristi onye Nazaret, bilie gaa ije!” O jidere ya n’aka nri kpụlie ya elu, ozigbo ụkwụ ya abụọ na ikpere ya sikwaa ike ọzọ.

Ọ wụliri elu, kwụrụ n’ụkwụ abụọ, jegharịa ije n’ebe ahụ. O sooro Pita na Jọn na-aga ije na-awụli elu na-etokwa Chineke. Igwe mmadụ ahụ niile hụrụ ya ka ọ na-aga ije, na-eto Chineke.

Mgbe ha matara na ọ bụ onye ahụ na-anọdụ n’ọnụụzọ mma, nke ụlọnsọ Chineke na-arịọ arịrịọ, otu ihe a si mee gbara ha gharịị, jukwa ha anya nke ukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 19: 2-3, 4-5

Azịza: Mana olu ha na agazu ụwa niile.

1. Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya

Ụbọchị niile na-ekwupụta ya

Abalị ọbụla na-egosịpụta amamihe nke Chineke. Azịza

2. Ha anaghị ekwu okwu

Nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:11-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Galeshịa

Ọ ga-amasị m ime ka ụnụ mata ụmụnna m na oziọma nke m wetara ụnụ abụghị oziọma nke mmadụ. Anataghị m ya site n’aka mmadụ. Ọ dịghịkwa onye ọbụla kuziri m ya, kama o ruru m aka site na mkpughe nke Jesu Kristi.

Ụnụ anụla maka ndụ ochie m n’usoro okpukpe ndị Juu na otu m si sogbuo nzukọ Chineke, ma gbakwaa mbọ imebi ya. Agara m n’ihu na usoro okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ ndị ọgbọ m n’etiti ndị nke m, omenaala nna anyị ha nụkwara m ọkụ n’obi karịa.

Ma mgbe ọ masịrị onye ahụ họpụtara m iche tupu a mụọ m, ọ kpọkwara m site n’amara ya. Ọ masịrị ya ikpughere m Nwa ya, ka m wee kwusaa maka ya n’etiti ndị mba ọzọ.

O nweghị onye ọbụla m jekwuuru maka ndụmọdụ, nke m na-aga Jerusalem ịgakwuru ndị buru m ụzọ bụrụ ụmụazụ kama agara m Arabịa, e mechaa m laghachi Damaskọs.

Ka afọ atọ gachara agara m Jerusalem ịhụ Pita (nke pụtara Sefas ma a sụgharịa ya) ịjụta ya ihe ụfọdụ. Anọnyekwaara m ya ụbọchị iri na ise. Ọ dịghị onye ọzọ n’ime ndị ụmụazụ m hụrụ, ma ọbụghị naanị Jemis nwanne Dinwenụ. (Ihe m na-edere ụnụ bụ eziokwu n’ihu Chineke, anaghị m atụ asị).

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Onyenwe m, Ị mazuru ihe niile, Ị makwa na m hụrụ gị n’anya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 21: 15-19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Mgbe ha richara nri ụtụtụ nke a, Jesu ajụọ Saịmọn Pita sị, “Saịmọn nwa Jọn, Ị hụrụ m n’anya karịa ndị a niile?” Pita azaa Jesu sị, “Ee, Onyenwe m, Ị ma na-ahụrụ m gị n’anya.”

Jesu asị ya, “Zụba atụrụ m nri.” Jesu jụrụ ya nke ugboro abụọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, Ị hụrụ m n’anya?” Pita azaa ya sị, “Ee Onyenwe m, Ị ma na-ahụrụ m gị n’anya.”

Jesu agwa ya sị, “Chekwaba atụrụ m.” Jesu jụkwara ya nke ugboro atọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, Ị hụrụ m n’anya?” O wutere Pita na ọ jụrụ ya nke ugboro atọ sị, “Ị hụrụ m n’anya.” Pita asị ya, “Onyenwe m, Ị mazuru ihe niile, Ị makwa na m hụrụ gị n’anya.”

Jesu asị ya, “Zụba atụrụ m nri. Ka m gwa gị eziokwu: Mgbe ị bụ nwata, Ị na-eke ajị n’ukwu, na-ejegharị ebe ọbụla Ị chọrọ. Ma mgbe Ị ghọrọ agadi, Ị ga-amatị aka gị, onye ọzọ amanye gị ụdọ, kpụrụ gị gaa ebe ị na-achọghị ị ga.

(Jesu kwuru nke a iji gosị ụdị ọnwụ Pita ga-anwụ, iji nye Chukwu otito). Mgbe o kwuchara nke a, Ọ sịrị Pita, “Sobe m.”

Igbo Mass readings for June 29 2024, Nnukwu Emume nke Pita na Pọl dị Asọ – Ụmụazụ.

Igbo Mass Readings for June 28 2024, Nnukwu Emume nke Pita na Pọl dị Asọ – Ụka Nche Abalị.

Last Update: December 10, 2022