Igbo Mass Readings for December 13 2024, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 13 2024, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 48:17-19
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Nke a ka Chineke, onye nzọpụta ụnụ na onye Nsọ nke Izrel kwuru: “Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, onye na-akụziri ụnụ ihe maka ọdị mma nke ụnụ, onye na-edu ụnụ n’ụzọ ụnụ kwesịrị isi na-aga.
N’ezie, a sị na ụnụ gere ntị n’iwu m, udo gaara na-ehuru ụnụ dịka mmiri iyi, eziomume ụnụ dịka ebili oke osimiri.
Ụmụ ụnụ gaara adị ka aja dị n’ala, ụmụụmụ ụnụ dịka mkpụrụ aja. A gaghị ehichapụ aha ha ehichapụ ma ọ bụ kpochapụ ha n’ebe m nọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 1, 1-2, 3.4.6.
Azịza: Ndị na-eso gị Onyenweanyị ga-enwe ìhè nke ndụ.
1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume
ma ọ bụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,
ma ọ bụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;
Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị
ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza.
2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,
nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,
ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Azịza.
3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ,
Mba, n’ihi na ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị
N’ihi na Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,
mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ịla n’iyi. Azịza
MBEKU
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Onyenweanyị na-abịa, ganụ zute ya ọ bụ eze nke udo.
ALLELUỊA.
OZIỌMA – 11: 16-19
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Ma gịnị ka m ga-eji atụnyere ọgbọ a? Ọ dị ka ụmụntakịrị ndị nọ n’ọma ahịa na-akpọ ibe ha oku; ‘Anyị gbuuru ụnụ ọja, ma ụnụ agbaghị egwu; anyị tiri mkpu akwa, ma ụnụ erughị ụjụ’.
Jọn bịara na-ebu ọnụ na-asọkwa mmanya, ha sị na ajọ mmụọ bi n’ime ya. Nwa nke mmadụ abịa, na-eri na-añụ, ha sị, ‘Lee onye oke oriri na onye añụmañụ, enyi ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ!’ ma amamiihe egosipụtala onwe ya site n’ezi ọrụ ya.
Igbo Mass Readings for December 14 2024, Ncheta Jọn nke Krọss dị Asọ, Ukọchukwu na Dọktọ
Igbo Mass Readings for December 13 2024, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.