Igbo Mass Readings for May 2 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 2 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:34-42

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Otu onye nzukọ Sanhedrịn ahụ bụ onye Farisii na onye nkuzi iwu Mosis, onye ndị Juu niile na- asọpụrụ, a na-akpọ Gamaliel, biliri, nye iwu ka akpọpụ ndịozi ahụ n’ezi nwaobere oge.

Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel! Kpacharanụ anya n’ihe ụnụ na-achọ ime ndị a. Chetanụ na n’oge gara aga otu nwoke a na-akpọ Teudas biliri na-egosi onwe ya ka onye dị mkpa nke mere ụfọdụ ndị mmadụ ruru narị anọ ji sobe ya.

Ma emesịrị gbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya gbasachaa, otu ya adakpọọ. Mgbe òtú Teudas dachara, otu onye Galili ana-akpọ Judas bilikwara n’oge ọgụgụ mmadụ, dubie ụfọdụ ndị Juu ka ha sobe ya.

Ya onwe ya lakwara n’iyi, ndị ụmụazụ ya gbasachaa. Ka nke a pụtakwara ugbu a, ana m agwa ụnụ, hapụnụ ha ma nyekwanụ ha efe; n’ihina ọ bụrụ na nzube nke a na ọrụ ha na-arụ bụ nke sitere na mmadụ ọ ghaghị ịda.

Ma ọ bụrụ na o si n’aka Chineke, ụnụ enweghị ike ịkwatu ya ma ọ bụ kwụsị ya. Kpacharanụ anya ụnụ ka ọ ghara ịbụ na ụnụ na-alụso Chukwu ọgụ.” Ndị nzukọ nabatara ndụmọdụ Gamaliel ma mgbe ha kpọbatara ndịozi ahụ n’ụlọ, ha pịara ha ụtarị, tiere ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n’aha Jesu ọzọ, bịa hapụ ha ka ha laa.

Ndịozi ahụ siri n’ụlọ nzukọ ahụ laa, na-añụrị na Chineke gụnyere ha na ndị kwesịrị ịnara nkparị n’ihi aha Jesu. Ma kwa ụbọchị, ha ahapụghị ịdị na-akuzi ma na-ekwusa, n’ụlọnsọ Chineke ma ọ bụ n’ụlọ ndị mmadụ, na Jesu bụ Kristi ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27:1, 4, 13-14.

Azịza: Otu ihe ka m na-achọ, ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ.

1. Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu?

Dinwenụ bụ ide nke ndụ m,

onye ga-eyi m egwu!

Azịza: Otu ihe ka m na-achọ, ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ.

2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ,

otu ihe ka m na-achọ.

Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ,

ụbọchị niile nke ndụ m,

ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ,

ka m na-ahụ ya n’ụlọnsọ ya.

Azịza: Otu ihe ka m na-achọ, ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ.

3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke  Chineke,

n’ala ndị dị ndụ.

Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike;

tụkwasị ya obi, chekwube na ya.

Azịza: Otu ihe ka m na-achọ, ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Jesu kwuru sị, “Abụ m ezigbo onye nche atụrụ, amara m atụrụ m, ha makwara m.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 6:1-15

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Mgbe nke a gachara, Jesu gara n’ofe nke ọzọ nke osimiri Galili nke bụ osimiri Tiberias. Oke igwe mmadụ sobere ya, n’ihina ha hụrụ ọrụ ebube dị iche-iche ọ rụrụ site n’ịgwọ ndị ọrịa. Jesu rịgooro n’elu ugwu, nọdụ ala n’ebe ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya.

Ugbu a Emume nke Ngabiga bụ emume nke ndị Juu adịla nso. Jesu legharịrị anya hụ na oke igwe mmadụ na-abịakwute ya. Ọ jụrụ Filip sị, “Olee otu anyị ga-esi zụta achịcha ka ndị mmadụ a nwee ike iri ihe?”

O kwuru nke a ka o wee nwalee Filip, ma ya onwe ya amaralarị ihe ọ ga-eme. Filip zara ya sị, “Narị dinarị abụọ agaghị azụtalị achịcha ga-ezu ka onye ọbụla n’ime ha nweta ntakịrị.”

Otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saịmọn Pita wee sị ya, “O nwere otu nwatakịrị nwoke nọ n’ebe a ji ogbe achịcha ise na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ n’etiti igwe mmadụ ha otu a?”

Jesu gwara ha sị, “Meenụ ka ndị mmadụ nọdụ ala.” Ahịhịa buru ibu dị n’ebe ahụ. Ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru puku ise nọdụrụ ala n’ebe ahụ. Jesu naara ogbe achịcha ise ahụ, mgbe o nyechara ekele, o kesaara ha ndị ahụ niile nọdụrụ ala.

Otu ahụkwa ka o si kesaa azụ ahụ. Onye ọbụla riri otu o si chọọ. Mgbe ha rijuchara afọ, Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpokọtanụ iberibe achịcha fọdụrụnụ ka ihe ọbụla ghara ịla n’iyi.

“Ha kpokọtara ha ọnụ, kpojuo nkata iri na abụọ site n’iberibe fọdụrụ n’ogbe achịcha ise ahụ ndị mmadụ rifọrọ. Mgbe ndị mmadụ nọ n’ebe ahụ hụrụ ihe ịrịbaama nke Jesu rụrụ, ha sịrị, “N’ezie onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa n’ụwa!”

Mgbe Jesu matara na ha na-achọ ịbịa dọkpụrụ ya n’ike mee ya eze, o wezugara onwe ya ọzọ, gaa n’ugwu nọdụ naanị ya.

Igbo Mass Readings for May 3 2025, Emume Ncheta Filip na Jemis dị Asọ – Ụmụazụ.

Igbo Mass Readings for May 2 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.