Igbo Mass Readings for January 20 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 20 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:6-13
lhe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Ma otu ọ dị Kristi natara ọrụ onye nchụaja nke dị elu karịa nke ochie dịka ọgbụgbandụ ọhụrụ ahụ nke o dobere dịka onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ si kara mma, n’ihina e dobere ya na nkwa ahụ kacha mma.
Ọ bụrụ na ọgbụgbandụ nke mbụ enweghị ntụpọ, a gaghịrị enwe ohere maka nke abụọ. Ma Chineke tara ndị nke ya ụta mgbe o kwuru sị, “Lee, ụbọchị ndị ahụ ga-abịa, Yahweh na-ekwu, mgbe mụ na ezinụụlọ Izrel na Juda ga-abịa n’ọgbụgbandụ ọhụrụ.
Ọ gaghị adị ka ọgbụgbandụ nke mụ na nna ha gbara mgbe m kpọọrọ ha n’aka si n’ala Ijipt dupụta ha. Ha anọgideghị n’ọgbụgbandụ nke mụ na ha gbara. Mụ onwe m wee leghara ha anya, ọ bụ Yahweh na-ekwu.
Nke a bụ ọgbụgbandụ nke mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gachara dịka Yahweh si kwuo. Aga m etinye iwu m n’obi ha, aga m abụ Chineke ha, ha abụrụkwa ndị nke m.
Mgbe ahụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-akuziri ibe ya, mọbụ onye ga-akụziri nwanne ya sị, ‘Mara Onyenweanyị; n’ihina ha niile ga-amata m site n’onye nta ruo n’onye ukwu. Aga m emere ha ebere na njọ ha niile, a gaghị echetakwa njọ ha ọzọ”.
Mgbe ọ na-ekwu maka ọgbụgbandụ ọhụrụ ahụ, ọ na-ewe ọgbụgbandụ ochie ahụ ka ihe na-abaghị uru. Ihe ọbụla nke na-abaghị uru, nke na-akakwa nka na-esi n’anya apụ ngwangwa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:7, 9, 10-11, 12-13.
Azịza: Irubeisi ga-esi n’ala pulite, eziomume ga-esi n’elu ledata anya.
1. Gosi anyị ịhụnaanya gị dị ọkpụ O Onyenweanyị
nyekwa anyị nzọpụta gị.
N’ezie, nzọpụta ya dị nso maka ndị na-atụrụ ya egwu,
ka ebube ya wee nọgide n’ala anyị. Azịza
2. Ịhụnaanya na okwukwe amakụọla,
eziomume na udo ebiela ọma,
Irubeisi ga-esi n’ala pulite,
eziomume ga-esi n’elu ledata anya. Azịza
3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganiihu,
ala anyị ga-amịta mkpụrụ bawanye.
Eziomume ga-aga n’ihu ya,
udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya. Azịza.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Anaghị m akpọkwa ụnụ ndịodibo ọzọ, n’ihina odibo anaghị ama ihe Nna ya ukwu na-eme. Kama ana m akpọzi ụnụ ndị enyi, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:13-19
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu rịgooro n’elu ugwu, bịa kpọọ ndị ọ chọrọ ka ha bịakwute ya; ha wee bịakwute ya. Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ, ndị ọ kpọrọ ndịozi; ka ha na ya nọrọ, ya na ka o zipụkwa ha ịgbasa oziọma, ma nwekwa ike ịchụ ajọmmụọ: Ha bụ Saịmọn, onye ọ kpọrọ Pita; Jemis na nwanne ya Jọn, ụmụ Zebedi, ndị ọ kpọrọ Boanajis, nke pụtara, ụmụ egbe eluigwe; Andru na Filip, Batolomiu, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfeus, Tadius, Saịmọn onye Kana, na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.