Igbo Mass Readings for January 19 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 19 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:3-21

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel

Sọl wee chịrị puku ndịagha atọ ndị kachasị ike n’usuu ndị agha Izrel niile jee n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe a na-akpọ ‘Nkume Ewuọhịa,’ ịchọ Devid na ndịagha ya. Ọ bịaruru n’otu ọgba, nke dị nso n’ogige igweatụrụ dị n’akụkụ ụzọ, banye ebe ahụ izuru ike.

Ma ọ maghị na Devid na ndịagha ya zoro n’ime ime ọgba ahụ. Ndịagha Devid gwara ya sị, “Nke a bụụrụ gị ohere! Yahweh gwara gị na ya ga etinye onyeiro gị n’aka gị, ka I mere ya otu ọ masịrị gị,” Devid wee gbere egbere, jiri nzuzo bepụ ọnụ uwe mwụda Sọl, ma Sọl amataghị.

E mechaa, obi Devid bidoro tawa ya ụta. Ọ gwara ndịagha ya, sị, “Chukwu ekwela ka m setịa aka mee nna m ukwu ihe ọjọọ, bụ onye o tere mmanụ ịbụ eze! Agaghị m emerụ ya ahụ ma ọlị, n’ihina Yahweh họpụtara ya ịbụ eze!”.

Site n’ụzọ dị otu a, Devid gbochiri ndịagha ya imerụ Sọl ahụ. Sọl wee bilie, hapụ ọgba ahụ, malitekwa ije ya. Devid biliri, sochie Sọl azụ, kpọọ ya oku, sị, “Onyenwe m eze! Sọl tụgharịrị, Devid akpọọrọ ya isi ala na nsọpụrụ.

Devid gwara ya, “Gịnị mere I ji ekwere asị ndị mmadụ na-atụrụ gị na m chọrọ igbu gị? Lee, taa, i jila anya gị hụ otu Chukwu siri tinye gị n’aka m n’ime ọgba ebe a. Ụfọdụ ndịagha m sịrị m gbuo gị.

Ma emeere m gị ebere dịka nna m ukwu, achọghịkwa m imerụ gị ahụ ma ọlị, n’ihina ị bụ onye Yahweh tere mmanụ ịbụ eze. Lee, nna m! Ị hụla uwe mwụda gị n’aka m?

Na m bepụrụ ọnụ uwe gị, hapụ igbu gị, ga-egosi gị na achọghị m ime gị ihe ọjọọ ọbụla, mọbụ inupụisi n’ọchịchị gị. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere gị, ma gị onwe gị na-achụ m iwepụ ndụ m. Chineke jiri aka ya kpee ikpe n’etiti mụ na gị mara onye mejọrọ ibe ya.

Ya bọtara m ọbọ n’ahụ gị n’ihi ihe ọjọọ i na-eme m. Ma agaghị m esetị aka m imegide gị ma ọlị. Gị onwe gị amarala ilu ochie ahụ, ‘site n’ime ndị obi ọjọọ ka ihe ọjọọ si apụta. Ma agaghị m esetị aka m imegide gị.

Lee obere nwa eze Izrel na-achọ igbu! Lee nwatakịrị ị na-achụgharị! Ihe ọ na-achụgharị bụ naanị nwa nkịta nwụrụ anwụ, na nwa igwu! Yahweh ga-abụ onye ọkaikpe n’etiti mụ na gị, mara onye mejọrọ ibe ya.

Ka o lebaa anya n’ihe a, chekwaba, ma zọpụta m n’aka gị” Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu ndị a, Sọl sịrị ya, “Onye a, ọ bụ gị n’ezie, nwa m Devid?’ Sọl wee kwaa akwa.

Ọ sịrị Devid, “Ị bụ onye eziomume karịa m, n’ihina gị onwe gị emeerela m ọtụtụ ezi ihe. Ma mụ onwe m ewerela ihe ọjọọ kwụghachi gị ụgwọ. Taa, I gosịla ka obi gị sịrị dị ọcha n’ebe m nọ, n’ihina I gbughị m na-agbanyeghị na Yahweh tinyere m n’aka gị.

Ọ dịghị mfe mmadụ ijide onyeiro ya hapụ ya, ghara imerụ ya ahụ! Chukwu gozie gị n’ihi ihe I meere m taa! Ugbu a, o weela m anya na ị ga-abụrịrị eze Izrel, na alaeze Izrel ga-eguzosikwa ike n’aka gị. Ya mere, were aha Yahweh ñụọrọ m iyi na ị ga-edobe ndị agbụrụ m, ka a ghara ichezọ aha m na nke ezinụụlọ nna m.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 57: 2, 3-4, 6, 11.

Azịza: Meere m ebere Chineke, meere m ebere

1. Meere m ebere Chineke, meere m ebere

Na gị ka mkpụrụobi m na-ezere ndụ

Ana m ezere ndụ n’okpuru nku gị

Ruo mgbe oke ikuku mmebi fechara. Azịza

2. Akpọrọ m Chineke kacha elu

Chineke onye meerela m ihe niile

Ka O si n’eluigwe zitere m nzọpụta

Ka O gbochie ndị na-achọ ịzọgbu m

Ka Chineke zite ikwesị ntụkwasịobi ya na ịhụnanya ya. Azịza

3. Gosipụta ike gị n’eligwe, O Chineke

Ka ebube gị dịrị n’elu ụwa

Ihụnanya gị dị elu dịka eluigwe

Nkwụdosiike gị dị elu dịka urukpu. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Anaghị m akpọkwa ụnụ ndịodibo ọzọ, n’ihina odibo anaghị ama ihe Nna ya ukwu na-eme. Kama ana m akpọzi ụnụ ndị enyi, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.

Alleluia.

OZIỌMA – 3:13-19

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu rịgooro n’elu ugwu, bịa kpọọ ndị ọ chọrọ ka ha bịakwute ya; ha wee bịakwute ya. Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ, ndị ọ kpọrọ ndịozi; ka ha na ya nọrọ, ya na ka o zipụkwa ha ịgbasa oziọma, ma nwekwa ike ịchụ ajọmmụọ: Ha bụ Saịmọn, onye ọ kpọrọ Pita; Jemis na nwanne ya Jọn, ụmụ Zebedi, ndị ọ kpọrọ Boanajis, nke pụtara, ụmụ egbe eluigwe; Andru na Filip, Batolomiu, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfeus, Tadius, Saịmọn onye Kana, na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.

Igbo Mass Readings for January 20 2024, Emume Ncheta Cyprian Michael Iwene Tansi Dị Ngọzi

Igbo Mass Readings for January 19 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 6, 2022