Igbo Mass Readings for May 17 2024, Fraịde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 17 2024, Fraịde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 25:13-21

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Mgbe ụbọchị olemaole gachara, Agrịpa, bụ eze obodo, na Benaịsi nwunye ya, bịara ịnabata Festus. Mgbe ha nọrọ ebe ahụ, ọtụtụ ụbọchị, Festus tọgbọrọ okwu banyere Pọl n’ihu ha sị: “Otu nwoke nọ ebe a, onye Feliks hapụrụ n’ụlọ mkpọrọ.

Mgbe ahụ m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu boro ya ebubo, rịọkwa ka m ma ya ikpe. Ma agwara m ha na ọ bụghị omenaala ọchịchị ndị Rom iwere maka ihu ọma were onye ọbụla a na-ebo ebubo nye ma ọ bụrụ na ndị na-ebo ya ebubo ebughị ụzọ kpekọọ ikpe ihu na ihu, ma ọ bụrụkwa na e bughị ụzọ nye ya ohere, ka o kpee ọnụ ya.

N’ihi nke a, mgbe ha bịara n’ebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama n’ụbọchị nke ọzọ, anọdụrụ m n’oche ikpe, inye ikikere ka a kpọbata nwoke ahụ. Ndị na-ebo ya ebubo biliri, ma ọ dịghị otu n’ime ụrụ ndị m chere ha ga-akpọ aha, nke ha gụpụtara na o mere; ihe ha nwere megide ya bụ naanị mgbagha okwu ụfọdụ ya na ha nwere banyere okpukpe ha, na otu nwoke a na-akpọ Jesu, nke nwụrụ anwụ, onye Pọl na-ekwusi ike na ọ dị ndụ.

E mechara m nwee obi abụọ otu m ga-esi achọpụta eziokwu, na otu a ga-esi ebi ya bụ ikpe. N’ihi ha, ajụrụ m Pọl ma ọ ga-ekwe ịga Jerusalem, ka a nọrọ ebe ahụ dozie ikpe ya.

Pọl jụrụ ajụ. Ọ rịọrọ ka m dobe ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza Ọgọstus, eze Rom n’onwe ya ga-ekpebi ikpe ya. N’ihi nke a ka m ji nye iwu ka edobe ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe m ga-enwe ike izigara ya Siza.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103: 1-2, 11- 12.19-20.

Azịza: Onyenweanyị edotala ocheeze ya n’eluigwe.

1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!

Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

echezọkwala obi ebere ya niile. Azịza

2. Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị,

otu ahụ ka ihụnaanya ya siri dị ukwuu

n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ.

Ọ na-ewepụ njọ anyị n’ebe anyị nọ

karịa otu ọwụwaanyanwụ si dị anya n’ọdịda ya. Azịza

3. Onyenweanyị edotela ocheeze ya n’eluigwe,

ọ na-achị ihe niile.

Gọzienụ Onyenweanyị, ndị mmụọọma ya nile,

ụnụ ndị dị ike ịhụ na e dobere okwu ya. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Gaanụ, meenụ ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, anọnyere m ụnụ oge niile ruo na njedebe nke oge.”

ALLELUIA.

OZIỌMA – 21: 15-19.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Mgbe ha richara nri ụtụtụ nke a, Jesu ajụọ Saịmọn Pita sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m n’anya karịa ndị a niile?” Pita azaa Jesu sị, “Ee, Onyenwe m, ị ma na-ahụrụ m gị n’anya.”

Jesu asị ya, “Zụba atụrụ m nri,” Jesu jụrụ ya nke ugboro abụọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m n’anya?” Pita azaa ya sị, “Ee, Onyenwe m, ị ma na-ahụrụ m gị n’anya.”

Jesu agwa ya sị, “Chekwaba atụrụ m.” Jesu jụkwara ya nke ugboro atọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m n’anya?” O wutere Pita na ọ jụrụ ya nke ugboro atọ sị, “Ị hụrụ m n’anya.”

Pita asị ya, “Onyenwe m Ị mazuru ihe niile, ị makwa na m hụrụ gị n’anya.” Jesu asị ya, “Zụba atụrụ m nri. Ka m gwa gị eziokwu: Mgbe ị bụ nwata, ị na-eke ajị n’ukwu, na-ejegharị ebe ọbụla ị chọrọ.

Ma mgbe ị ghọrọ agadi, Ị ga-amatị aka gị, onye ọzọ amanye gị ụdọ, kpụrụ gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” (Jesu kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ Pita ga- anwụ, iji nye Chukwu otito). Mgbe o kwuchara nke a ọ sịrị Pita, “Sobe m.”

Igbo Mass readings for May 18 2024, Satọde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 17 2024, Fraịde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 16, 2022