Igbo Mass Readings for February 28 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 28 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:5-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Olu ọma na-eme ka ndị enyi bawanye. Ire ụtọ na-eme ka azịza dị mma bawanye. Mee ka ndị enyi gị hie nne, ka ndị gị na ha dị na mma dị ọtụtụ, ka ndị ndụmọdụ gị bụrụ sọ otu onye n’ime puku mmadụ.

Ị chọọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, buru ụzọ nwalee ya. Agakwala ngwa ngwa ịtụkwasị ya obi. Maka o nwere onye na-abụ enyi sọ mgbe ihe dịịrị gị mma, mana ọ gaghị akwuụsi ike n’ebe ị nọ n’oge nsogbu.

O nwere ụdị enyi na-agbanwo bụrụ onyeiro kọọrọ ọhaneeze okwu dịịrị gị na ya iji menye gị ihere. O nwekwara ụdị bụ enyi sọọsọ n’oge oriri, ma na ọ gaghị anọnyere gị na nsogbu.

Mgbe ihe na-agara gị n’ihu, gị na ya ga abụ otu, ọ ga-enwe ike n’ebe ụmụodibo gị nọ, mana oge ọdịda gị, ọ tụgharịa ghọọ onyeiro. Oge ahụ ka ọ ga-anọ gị ote aka.

Anọdebekwala ndịiro gị nso, ma kpachara anya n’ebe ndị enyi gị nọ. Enyi kwesịrị ntụkwasịobi bụ ebe nchedo e ji aka. Onye nwetara enyi dị otu a, nwetara akụ dị oke ọnụ.

Enyi kwesịrị ntụkwasịobi karịrị ọnụ ahịa ọbụla. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere ya. Enyi kwesịrị ntụkwasịobi bụ ezigbo ọgwụ na-enye ahụ ike.

Ndị na-atụrụ Yahweh egwu ga-enweta ya. Onye ọbụla na-atụrụ Yahweh egwu na-eme ezigbo enyi, maka otu onye dị, ka enyi ya na-adị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:12, 16, 18, 27, 34, 35.

Azịza: Dube m n’ụzọ iwu gị, n’ihina ọ bụ ihe na-atọ obi m ụtọ.

1. Ngọzi dịrị gị O Onyenweanyị.

kụziere m iso ụzọ gị. Azịza

2. Ana m enwe añụrị n’iwu gị,

anaghị m echezọ okwu gị. Azịza

3. Meghee anya m, ka m wee hụ

ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị. Azịza

4. Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara,

ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m. Azịza

5. Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị,

wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị. Azịza

6. Dube m n’ụzọ iwu gị,               

n’ihina ọ bụ ihe na-atọ obi m ụtọ. Azịza

MBEKU – 1 Pita 1:25

Alleluia, Alleluia:

Ma okwu nke Onyenweanyị ga-adịgide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.

Alleluia.                             

OZIỌMA – 10:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu si n’ebe ahụ bilie, garuo ala Judia; sikwa n’ebe ahụ ruo ala dị n’ofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Oke igwe mmadụ zukọrọ n’ebe ọ nọ. Ọ malitere ọzọ ịkụziri ha ihe, dịka o si eme.

Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya, iji nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi n’iwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” Jesu zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere ụnụ n’iwu?”

Ha zara sị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya, wee chụlaa ya”. Ma Jesu gwara ha sị, “Ọ bụ n’ihi ekweghị ekwe ụnụ ka Mosis ji deere ụnụ iwu dị otu a.

Ma site na mbido okike, Chineke mere ha nwoke na nwaanyị. N’ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya gakwuru nwunye ya, ha abụọ abụrụ otu.

Ya bụ ha abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ kama otu. Ihe Chineke jikọrọ ọnụ mmadụ ọbụla ekewakwala ya”. N’ime ụlọ, ndị na eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.

Ma ọ zara ha sị, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m lụrụ nwaanyị ọzọ na-akwa iko megide ya. Ma ọ bụrụkwa na nwaanyị agbaa dị ya alụkwaghị m lụrụ di ọzọ ọ na-akwakwa iko.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 28 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.