Igbo Mass Readings for May 29 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 29 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Mbụ

Ọgwụgwụ ihe niile dị nsọ. Nweenụ uche zuru oke nwekwaanụ anya udo ka ụnụ nwee ike ikpe ekpere. Ma nke kachanụ hụrịtanụ ibe ụnụ n’anya nke ukwu, n’ihina ịhụnaanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.

Na elerịtanụ ibe ụnụ ọbịa nke ọma n’atamughị ntamu. Ụnụ niile n’otu n’otu natara onyinye amara nke Chineke.

Werenụ ya jeere ibe ụnụ ozi dịka ezi ndị nlekọta nke onyinye ahụ dị icheiche nke Chineke nyere ụnụ. Onye ọbụla n’ime ụnụ na-ekwu okwuchukwu ya kwuo naanị okwu si Chineke n’ọnụ pụta.

Onye ọbụla na-eje ozi ya were ike Chineke nyere ya jeere ya ozi. Na-emenụ otu a ka e nye Chineke otito n’ihe niile site n’aka Jesu Kristi onye nwe otito na ike niile mgbe ebighịebi. Amen.

Ndị m hụrụ n’anya, ya agbala ụnụ gharịị na e ji oke ahụhụ dị otu a anya ụnụ dị ka a ga-asị na ihe na-adakwasị ụnụ bụ ụdị ihe ụnụ na-ahụbeghị mbụ.

Kama ñụrịanụ ọñụ na ụnụ so keta oke n’ahụhụ Kristi ka ụnụ jupụta n’ọñụ mgbe a ga-ekpughe ebube Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96: 10, 11-12, 12-13

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

1. Kwụsachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyi bụ eze,

ọ kwụwasiri ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. Azịza

2. Eluigwe ñụrịba, ụwa goribe,

Oke osimiri na ihe niile dị n’ime ya tienụ mkpu.

Ala-ubi niile na ihe niile dị n’ime ya ñụrịbanụ. Azịza

3. Ka osisi niile dị n’oke ọhịa kwebe ukwe añụrị,

N’ihu nke Onyenweanyị n’ihi ọ na-abịa

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe

ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ na eziokwu

were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị, okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 11:11-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe Jesu banyere na Jerusalem, ọ gara n’ime ụlọnsọ legharịa anya otu ihe niile dị. Ma ebe ọ bụ na chi ejibela, ya na ndị ụmụazụ ya iri na abụọ pụrụ gaba Betani.

N’echi ya, mgbe ha si na Betani na-alaghachi na Jerusalem agụụ jikwa Jesu. Ka ọ nọ ebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke jupụtara n’akwụkwọ ndụ. Ọ gara ileta ma o nwere mkpụrụ ọ ga-ahụ n’elu ya.

Ma mgbe o ruru ya nso, ọ hụghị mkpụrụ ọbụla n’elu ya karịa akwụkwọ ndụ, n’ihina ọ bụghị oge osisi fiig ji amị mkpụrụ. Jesu bụrụ osisi ahụ ọnụ sị “Ka onye ọbụla ghara irikwa mkpụrụ gị ọzọ”

Ndị na-eso ụzọ ya nụkwara nke a. Mgbe ha bịaruru Jerusalem, ọ banyere n’ụlọnsọ, bido chụpụba ndị na-ere na ndị na-azụ ahịa na ya.

O kpudoro okpokoro ndị na-agbanwo ego na oche ndị na-ere nduru ihu n’ala. O kweghịkwa ka onye ọbụla buru ihe site n’ụlọnsọ gafee. Ọ kụziri ha sị, “Ọ bụ na e deghị ya n’Akwụkwọ Nsọ: A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mba niile?

Ma ụnụ emeela ya ọgbakọ ndị ohi”. Mgbe ndịisi nchụaja na ndị odeakwụkwọ nụrụ nke a, ha chọrọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ma ụjọ na-atụ ha, n’ihina nkụzi ya tụrụ igwe mmadụ ahụ n’anya.

Mgbe uhuruchi bịara ha siri n’obodo ahụ pụọ. N’ụtụtụ ya, mgbe ha na-aga n’ụzọ; ha hụrụ na osisi fiig ahụ Jesu bụrụ ọnụ akpọnwụọla ruo na mgbọrọgwu ya.

Pita chetere ihe merenụ, wee sị Jesu, “Onyenkuzi, lee osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla”. Jesu zara ha sị, “Nweenụ okwukwe na Chineke.

N’ịgwa ụnụ eziokwu, onye ọbụla nke ga-asị ugwu a, ‘Si ebe a pụọ, danye n’ime osimiri na enweghị obi abụọ, kwesịkwaa ike na ihe o kwuru ga-eme, a ga emezuru ya ọchịchọ ya.

N’ihina agwa m ụnụ, ihe ọbụla ụnụ rịọrọ n’ekpere, ma kwere na ụnụ enwetala ya, ọ ga-abụ nke ụnụ. Mgbe ọbụla ụnụ kwụ na-ekpe ekpere, gbagharanụ onye ọbụla mehiere ụnụ, ka Nna ụnụ nke bi n’eluigwe werekwa gbaghara ụnụ mmehie ụnụ niile.

Ma ọ bụrụ na ụnụ agbagharaghị mmadụ ibe ụnụ, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe agaghịkwa agbaghara ụnụ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for May 29 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022