Igbo Mass Readings for Friday of 3rd Week of Easter

FRIDAY:IZU UKA NKE ATO N’OGE MBILITE N’ONWU KRISTI.

EKPERE MMEGHE
Nna, site n’ihunaanya nke Mmuo Gi, mee ka anyi bu ndi hurula amara nke mbilite n’onwu nke Dinwenu anyi Jesu Kristi, jiri onu gbagoo na ndu ohuru. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu 9:1-20
Ihe ogugu ewetara n’Oru Ndiozi
Ugbu a, Sol ka no na-aba mba na o ga-egbu ndi na-eso uzo Onyenweanyi. O gakwuuru onye isi nchuaja rio ya ka o denye ya akwukwo maka ulo nzuko ndi Juu no na Damaskos, ka o wee nwee ike ikpuru umunwoke na umunwaanyi niile o ga ahu na-eso uzo ahu, kpuga Jerusalem. Ka o na abjaru Damaskos nso, oke amuma gburu, ihè di egwu achakwasi ya. O dara n’ala, nu otu olu ka o na-asi ya, “Sol! Sol! Gini mere iji ebuso m agha?” Sol ajuo si, “Onye ka i bu Onyenweanyi?” O zaghachiri si, “Abu m Jesu, onye I na ebuso agha! Bilie banye n’ime obodo ebe a ga-agwa gi ihe i ga eme.” Ihe a riri ndi ha na Sol so aga onu. Ha nuru olu ahu ma ha ahughi onye kwuru ya. Sol si n’ala bilie, saghee anya ya, o nweghikwa ike ihu ihe obula. N’ihi nke a, ha sekpuuru ya n’aka dubata ya na Damaskos. O hughi uzo ubochi ato. O righi ihe obula nke o na añu ihe onuñu. E nwere otu onye na-eso uzo Jesu bi na Damaskos na-akpo Ananiyas. a Onyenweanyi kporo ya oku n’ohu SI, “Ananiyas!” Ọ zaa ya si, “Lee m, Onyenwe m!” Onyenweanyi siri ya, “Bilie gaa n’ama ahu a na akpo ‘Uzo kwu oto’. I garuo juo n’ulo nwoke a na-akpo Judas, maka otu nwoke onye Tasos, aha ya bu Sol. O no ebe ahu ugbu a na-ekpe ekpere, o huru ohu ebe otu nwoke a na-akpo Ananiyas batara, bikwasa ya aka n’isi ka o hubakwa uzo.” Ananiyas zara si, “Onyenweanyi, otutu mmadu akoorola m otutu ihe maka nwoke a banyere ihe ojoo na aruruala o ruru n’ebe ndi nso gi na Jerusalem no. Ugbu a, o natara ike n’aka ndiisi nchuaja iji jide ndi niile na-akpoku aha gi.” Onyenweanyi zara ya si, “Gaba! N’ihi na ahoputala ya ka o buru ngwaoru m, onye ga-ebugara mba ndi amaghi Chineke, ndi eze na umu Izrel aha m. Aga m egosi ya na o ga-atariri ahuhu n’ihi aha m. Ananiyas gabara banye n’ulo ahu, bikwasa Sol aka n’isi si, “Sol, nwanne m! Onyenweanyi Jesu onye mere ka i hu ya anya n’uzo i si bia, zitere m ka m mee ka i hukwa uzo ozo, juputakwa na Mmuo Nso.” Ozigbo ahu ihe dika mkpekere azu siri ya n’anya dapu. O hubakwa uzo ozo, o bilizie mee ya mmirichukwu. O rie nri, nwetakwa ume. Sol noyere ndi na-eso uzo Jesu ubochi olemaole na Damaskos. N’atufughi oge, o gaghariri n’ulo nzuko niile nke ndi Juu na-ekwusa maka Jesu, na-asi, “O bu Nwa nke Chineke.”

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 117:1, 2.
Aziza: Gaanu na mba niile, kwusabanu ozioma.

  1. Toonu Onyenweanyi, mba niile,
    Toonu ya, ndi mmadu niile. Az./
  2. N’ihi na ihunaanya ya siri ike,
    nkwudosiike ya na-adi okpu. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Kristi ebiliela ma chakwasikwa anyi, ndi oji o bara ya wee gbaputa.
ALLELUIA.

OZIOMA: 6:52-59.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:
Ndi Juu malitere irurita uka n’etiti onwe ha na asi: “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyi ahu ya ka anyi rie?” Jesu wee si ha, “O buru na unu erighi ahu nwa nke mmadu, O burukwa na unu anughi obara ya, unu agaghi enwe ndu n’ime unu. Onye na eri ahu, m na anukwa obara m nwere ndu ebeebe. Aga m akpolite ya n’onwu n’ubochi ikpe azu. N’ihi na ahu m bu nri n’ezie, obara m bukwa ihe onunu n’ezie. Onye obula nke na-eri ahu m, nke na-anukwa obara m, na-anogide n’ime m, mu onwe m n’ime ya. Dika Nna ahu di ndu siri zite m, m site na ya na-adi ndu, otu ahu ka onye na-eri m ga-esite na m na-adi ndu. Nke a bu nri ahu nke si n’eluigwe ridata. O bughi udi nri ahu nke nna unu ha riri ma nwuo. Kama onye na-eri nri a ga adi ndu ruo mgbe ebighjebi.” Jesu kwuru ihe ndi a n’ulo nzuko mgbe o na-akuzi ihe na Kapanaum.

EKPERE NHUNYE
Chineke Onye ebere, mee ka onyinye ndi a di nso; ka aja nke mmuo anyj na-achunyere Gi mee ka anyi buru onyinye di ebighi ebi nye Gį. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenu, mee ka Eucharistia nke a anyj natara na ncheta nke Nwa Gi nyere anyi aka ka anyi na-eto n’ihunaanya. Anyi na-ario Gi ihe ndja site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?