Igbo Mass Readings for January 27 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 27 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:32-39
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Chetakwanụ na n’ụbọchị ndị gara aga, mgbe a kuzichaara ụnụ, ụnụ diri oke mkpagbu na ahụhụ. Mgbe ụfọdụ ụnụ anata mkparị na mkpagbu n’ihu ọha, mgbe ọzọkwa, ụnụ esoro n’otu ndị e mere otu ihe ahụ.
Ụnụ nwere obi ebere n’ebe ndị mkpọrọ nọ. Mgbe ha pụnaara ụnụ ihe ụnụ nwere, ụnụ ji obi añụrị natakwa ya, n’ihina ụnụ maara na ụnụ onwe ụnụ nwere oke ka mma, nke na-anọgidenụ.
Ya bụ, ụnụ atụfukwala ntụkwasịobi ụnụ nwere nke nwere nnukwu ụgwọ. N’ihina ụnụ chọrọ ndidi ka ụnụ wee mee uche Chineke ma natakwa ihe e kwere na nkwa. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Nwantịntị oge, onye ahụ ga-abịanụ ga-abịa mgbe na-adịghị anya.
Ma onye eziomume ga-esite n’okwukwe dị ndụ. Ọ bụrụ na ọ laghachị azu, ihe ya agaghị amasị m”. Kama anyị esoghị na ndị na-alaghachị azụ ma laa n’iyi. Anyị bụ ndị nwere okwukwe ma na-echetakwa mkpụrụobi ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37:3-4, 5-6, 23-24, 39-40.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
1. Tụkwasịobi gị n’Onyenweanyị
ka I wee biri n’ala ebe obibi gị ma nwee udo.
Nwebe añụrị n’ime Onyenweanyị
ka o wee nye gị ihe obi gị na-achị. Azịza
2. Were ndụ gị nye Onyenweanyị n’aka,
tụkwasa obi na ya, ka O nyere gị aka.
Ọ ga-eme ka eziomume gị na-amụkesị dịka ihe,
meekwa ka eziokwu gị na-acha dịka ehihie. Azịza
3. Onyenweanyị na-eduzi onye eziomume ụzọ,
meekwa ka ọ kwụsie ike na-enwe ọganihu
Onwere ike ịda ada ma ọ gaghị emerụ ahụ.
n’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ya. Azịza
4. Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa,
Ọ na-echekwaba ha n’oge nsogbu;
Onyenweanyị na-enyere ha aka, na azọpụtakwa ha,
Ọ na-azọpụta ha n’ihina ọ bụ onye nchedo ha. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
N’ihe ọbụla ụnụ na-eme, mọbụ okwu, mọbụ omume, meenụ ha niile n’aha nke Dinwenụ Jesu. Na-enyekwanụ Chukwu Nna ekele site na ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 4:26-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu gwara oke igwe mmadụ ahụ gbara ya gburugburu sị, “Alaeze Chineke dịka mkpụrụ nke mmadụ ghara n’ubi, wee rahụ ụra tetekwa, abalị na ehihie, mkpụrụ ahụ na-epupụta, tolitekwa, ma ọ maghị otu o siri mee.
Ala n’onwe ya na-eme ka mkpụrụakụkụ bu ụzọ pupụta ome, e mechaa o nwee ogbe, mkpụrụ kara aka esi n’ogbe ya pụta. Mgbe mkpụrụ ha kachara, onye nwe ubi na-ebido owuwe ihe ubi n’ihina oge owuwe ihe ubi eruola”. Jesu jụkwara sị, “Kedụ ihe anyị ga-eji atụnyere Alaeze Chineke?
Olee ụdị ụkabụilu anyị ga-eji akọwa ya? Ọ dịka mkpụrụ osisi a na-akpọ mọstad, nke dị ntakịrị karịa mkpụrụ osisi niile, mgbe a kụrụ ya n’ala.
Ma mgbe a kụchara ya, ọ na-eto karịa mkpụrụ osisi niile a na-akụ n’ubi. Ọ na-awapụta alaka buru ibu, nke mere ụmụnnụnụ ji enwe ike ịrụ akwụ na ya”.
Jesu jikwa ọtụtụ ụkabụilu gwa ndị mmadụ okwu Chukwu, otu ha ga-enwe ike ịghọta; ọ gwaghị ha okwu ọbụla n’ejighi ụkabụilu. Ma mgbe naanị ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ na-akọwara ha ihe niile.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.