Igbo Mass Readings for September 5 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 5 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:15-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi
Kristi bụ onyinyo nke Chineke a dịghị ahụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ n’ihe niile e kere eke. N’ihina n’ime ya ka e kere ihe niile, ma ndị dị n’eluigwe ma ndị dị n’ụwa, ndị a na-ahụ anya na ndị a naghị ahụ anya; ma ocheeze niile, ike niile, ike nke mmụọ niile na ike ọchịchị niile.
Ọ bụ maka ya na site na ya ka e jiri kee ihe niile. Ya onwe ya nọkwa tupu ekee ihe niile. Ọ bụkwa n’ime ya ka ihe niile na-ejikọta n’otu. Ọ bụ ya bụ isi nzukọ bụ ahụ ya.
Ọ bụkwa isi mbido na onye mbụ si na ndị nwụrụ anwụ pụta, ka o wee bụrụ onye isi n’ihe niile. N’ihina ọ bụ n’ime ya ka ọ masịrị ozuzuoke nke Chineke ibiri.
Ọ bụkwa site na ya ka Chineke si kpeziere onwe ya na ihe niile e kere eke, ma n’elu ụwa ma n’eluigwe. O sitekwara n’ọbara nke ọ gbara n’elu obe na-eme udo.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100: 1, 2, 3, 4, 5
Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị
1. Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ
Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya.
Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị
2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke,
Ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,
Anyị bụ ndị nke ya; anyị bụkwa igwe atụrụ ya.
Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị
3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọ ama ya niile,
Werenụ otito baa n’ogige ya niile;
Kelenụ ya, gọziekwanụ aha ya.
Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị
4..N’ihina Onyenweanyị dị mma,
Ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,
Ntụkwasịobi ya na-adịgide
bido na-ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị
MBEKU – Ps. 130:5
Alleluia, Alleluia:
Ana m eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:33-39
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ụfọdụ mmadụ sịrị Jesu, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ ọtụtụ mgbe na-ekpe ekpere, otu a ka ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-emekwa, ma ndị nke gị nọ na-eri na-añụ.”
Jesu zara ha sị, “Ụnụ nwere ike ime ka ndị a kpọrọ n’oriri ọlụlụ nwunye bụọ ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ?
Oge na-abịa mgbe a ga-anapụ ha onye na-alụ nwunye ọhụrụ, mgbe ahụ ka ha ga-ebube ọnụ.” Jesu tụkwaara ha ilu sị, “Onweghị onye na-adọkara iberibe akwa ọhụrụ dụkwasa ya na nke ochie; e mee nke a, a ga-adọka nke ọhụrụ, iberibe akwa ọhụrụ ahụ agaghị amakọ n’akwa ochie.
O nweghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime udu akpụkpọ ochie, o mee otu a, mmanya ahụ ga-agbawa udu akpụkpọ ahụ, ha abụọ alaa n’iyi. Kama a ga-etinye mmanya ọhụrụ n’ime udu ọhụrụ.
O nweghị onye ọbụla ñụchara mmanya ochie na-enwe mmasị ịñụ nke ọhụrụ n’ihina ọ na-asị, Nke ochie dị mma.”
Igbo Mass Readings for September 5 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.