Igbo Mass Readings for September 22 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 22 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:2-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti
Ka ndị ohu ndị nwere nnaukwu ndị kwere ekwe, ghara ileli ha anya, n’ihina ha bụ ụmụnna. Kama, ha ga-agbara ha odibo nke ọma, n’ihina ndị na-erita uru n’ọrụ ọma ha bụ ndị kwere ekwe na ndị a hụrụ n’anya.
Jisie ike na-akụzi ihe ndị a, na-adụkwa ndị mmadụ ọdụ banyere ha. Onye ọbụla nke na-akụzi nkuzi dị iche nke na-adabanyeghị n’eziokwu ahụ, nke Onyenweanyị Jesu Kristi kụziri na nke na-adabanyeghị n’okpukpe ịsọpụrụ Chineke dị na ya, mpako ya afụliela ya elu, o nweghị ihe ọ maara.
Ihe na-arịa onye dị otu a bụ agụụ ịjụ oke ajụjụ, na ịrụ ụka, na isiagụgọ efu n’okwu, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkwulu na ajọ inyo mmadụ nnyo abụọ.
Ha na-anọ n’ịrụ ụka ọtụtụ mgbe. Ma ịrụ ụka ha bụ nke ndị uche ha gbagọrọ agbagọ, ndị eziokwu ọbụla na-anọghị n’ọnụ. Ha na-eche na okpukpe bụ ụzọ e si enweta akụnụụba.
N’eziokwu ọtụtụ uru dị n’okpukpe Chukwu, ma ọ bụrụ na ihe mmadụ nwere eju ya afọ. Anyị gbara aka bịa n’ụwa, anyị ga-agbakwa aka laa. Ọ bụrụ na anyị nwere ihe oriri na uwe, ka anyị nwee afọ ojuju.
Ndị na-achọ ka ha bụrụ ọgaranya na-adaba n’ime ọnwụnwa, ịma n’ọnya n’ọchịchọ na-enweghị isi nke na-emerụ mmadụ, nke na-edubakwa mmadụ na mbibi na ịla n’iyi.
Ịhụ ego n’anya bụ isi ihe ọjọọ nile. Ụfọdụ esitela n’ịchọ ego dapụ n’okwukwe ha. Ha ewerela oke nchegbu na oke iru ụjụ dụwaa obi ha.
Ma gị onwe gị, onye nke Chineke, gbanarị ihe ndị a, kama na-agbaso eziomume, ibi ndụ yiri onye nke Chineke, okwukwe, ịhụnaanya, ntachiobi na ịdị nwayọọ.
Lụsie ọgụ nke okwukwe ahụ ike, jide ndụ ebighịebi aka, nke Chineke kpọrọ gị ka ị nata n’oge ahụ i kwupụtara ezi okwukwe gị n’ihu ọtụtụ ndị akaebe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 49:6-7, 8-10, 17-18, 19-20
Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.
1. Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’oge nsogbu?
Mgbe omume ọjọọ nke ndịiro gbara m gburugburu
Ndị tụkwasaraobi ha n’akụnụụba
Ma werekwa nnukwu akụnụụba ha na-anya isi. Azịza
2. Ma o nweghị onye nwere ike ịgbapụta onwe ya
mọbụ jiri ego kwụọ Chineke ụgwọ ndụ ya,
n’ihi ụgwọ ndụ mmadụ dị oke ọnụ ahịa ọ karịrị ya ịkwụ
Ya mere O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịnwụ,
ka ọ ghara ịla mmụọ. Azịza
3. Ya bụ egwu atụla gị mgbe akụnụụba mmadụ na-abawanye,
Mgbe otito nke ụlọ ya na-abawanye
N’ihina oge ọ nwụrụ ọ gaghị eji ihe ọbụla laa n’ala mmụọ
Akụnụụba ya agaghị esokwa ya wee laa. Azịza
4. mee ka mkpụrụobi ya nwee nnukwu añụrị oge ọ dị ndụ,
O wee kwuo sị, “Leta onwe gị anya ka ndị mmadụ too gị
N’ikpeazụ ọ ga-anwụ soro ndị nnanna ya
Ha bụ ndị na-agaghị ahụkwa ihe ọzọ. Azịza
MBEKU – Ps. 119:27
Alleluia, Alleluia:
Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.
Alleluia
OZIỌMA – 8:1-3
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka o mechara ntakịrị, Jesu gagharịrị n’obodo ukwu na ọnụmara dị icheiche, na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke.
Mmadụ iri na abụọ ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya, na ụmụnwaanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ime ha, na ndị Ọ gwọrọ nrịanrịa ha sokwa ya.
Meri nke a kpọrọ Magdalini, onye mmụọ ọjọọ asaa si n’ime ya pụọ, na Joana nwunye Chuza, onye na-elekọta ihe dị n’ụlọ Herọd na Susana na ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ, ndị sitere n’ihe ha nwere na-enyere Jesu na ndị na-eso ụzọ ya aka.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.