Igbo Mass Readings for September 12 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 12 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-2, 12-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti
Pọl, onyeozi nke Jesu Kristi site n’iwu nke Chineke onye Nzọpụta anyi na Jesu Kristi, bụ nchekwube anyị, na-edegara Timoti bụ ezigbo nwa m n’ime okwukwe anyị, akwụkwọ ozi, ka amara na ebere na udo nke si n’aka Chineke Nna na Onyenweanyị anyị Jesu Kristi dịịrị gị.
Ana m ekele Onyenweanyị Jesu Kristi onye nyere m ike ịrụ ọrụ, n’ihina ọ gụrụ m n’onye kwesịrị ntụkwasịobi, họpụta m ijere ya ozi.
Ọ bụ ezie na abụ m onye na-ekwutọ Chineke na mbụ, onye na-akpagbu ndịozi na onye na-emenye Chineke na ndị nke ya ihere n’ihu.
Ma Chineke meere m ebere n’ihina emere m ihe ndị a n’amaghị ama mgbe m na ekwerebeghị na Kristi. Onyenweanyị wụkwasara m amara ya n’ụba, ya na okwukwe ịhụnaanya nke dị n’ime Jesu Kristi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16: 1-2, 5, 7-8, 11
Azịza: Onyenweanyị Gị bụ akụ m ga-eketa
1. Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m
Agwara m Onyenweanyị sị, Gịnwa bụ Chineke m
Iheọma niile m si n’aka Gị bịa.
Sọ gị Onyenwanyị bụ ihe m nwere. Azịza
2. Ana m eto Onyenweanyị bụ onye na-agbaziri m
N’ime abalị, mmụọ m na-enye m ndụmọdụ
Ana m eche echiche banyere ya
N’ebe Ọ nọ n’aka nri m, egwu agaghị atụ m. Azịza
3. Ị ga-akụziri m ụzọ nke ndụ
Ị ga-enye m añụrị na-enweghị ube n’ihu gị,
N’aka nri gị, aga m enwe añụrị dị ebeebe. Azịza
MBEKU – Ps. 119:135
Alleluia, Alleluia:
Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.
Alleluia
OZIỌMA – 6: 39-42
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu tụkwaara ha ilu sị, “Onyeisi o nwere ike idu onye isi? Ọ bụ na ha mmadụ abụọ agaghị adaba n’olulu? Nwaazụ anaghị aka onyenkuzi ya, ma onye ọbụla a kụziri ihe nke ọma ga-adị ka onyenkuzi ya.
Ma gịnị mere i ji hụ irighiri ahịhịa dị n’anya nwanne gị ma ị hụpụtaghị ibe osisi dị n’anya nke gị? Mọbụ olee otu i si nwe ọnụ ịsị nwanne gị, nwanne m ka m tụchapụ gị irighiri ahịhịa dị gị n’anya, mgbe gị onwe gị na-achọpụtaghị ibe osisi dị n’anya gị?
Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ tụchapụ ibe osisi dị n’anya gị, mgbe ahụ, ị ga-ahụcha ụzọ nke ọma ịtụchapụ irighiri dị n’anya nwanne gị.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.