Igbo Mass Readings for September 13 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 13 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:16-19, 22-27

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Anaghị m anya isi n’ihina ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m n’iwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.

Ọ bụrụ na ọ bụ ọrụ m họọrọ n’onwe m, aga m enwe ụgwọ ọrụ; mana ọ bụrụ n’osighị n’uche aka m, ụnụ amara na-ahanyere m ya n’aka. Gịnị bụzi ụgwọ ọrụ m?

Ọ bụ naanị nke a: Na nkuzi m, ana m ezi ndị mmadụ oziọma ahụ n’efu, n’ejighị ike niile m nwere n’ọrụ m, na-anara ndị mmadụ ihe.

Ọ bụ eziokwu na m nwe onwe m, ma ana m eme onwe m ohu onye ọbụla ka m wee tọghatara Kristi ọtụtụ mmadụ.

N’ebe ndị adịghị ike n’okwukwe nọ, ana m eme onwe m onye adịghị ike ka m wee tọghata ndị adịghị ike n’okwukwe. Aghọọla m ihe niile n’ebe mmadụ niile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọbụla zọpụta ụfọdụ n’ime ha.

Ma ana m eme ihe ndị a niile n’oziọma ahụ, ka m wee keta oke n’ọtụtụ ngọzi nke dị n’ime ya. Ụnụ ma nke ọma na n’ebe a na-agba ọsọ, ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ otu mgbe, ma naanị otu onye na-enweta ihe nrite nke mbụ.

Ya mere gbasienụ ọsọ ike otu a, ka ụnụ wee nweta ihe nrite nke mbụ. Onye ọsọ ọbụla na-enye onwe ya ọzụzụ siri ike. Nke a bụ maka iji nweta okpu mmeri pụrụ imebi emebi.

Ma anyị onwe anyị na-eme nke a iji nweta okpu mmeri apụghị imebi emebi. N’ihi ya, adịghị m agba ọsọ n’enweghị olileanya na m ga-agbata ọsọ.

Dịka onye na-eti ọkpọ anaghị m eti ọkpọ n’ikuku. Ana m ata anụahụ ahụhụ, na-eme ka o rubere m isi, ka ọ ghara ịbụ m zichaara ndịọzọ oziọma, abụrụ m onye a jụrụ ajụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 84:3, 4, 5-6, 8, 12

Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.

1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ

ka m bata n’ogige Osebụrụwa,

Ka mkpụrụobi m na anụahụ m

na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ. Azịza

2. ka o si dị nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi

nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ ebe ọ ga-edote ụmụ ya

n’akụkụ ebe ịchụaja gị, Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile

Onye bụ eze m na Chineke m. Azịza

3. Ha bụ ndị a gọziri agọzi ndị bi n’ụlọ gị

na-ekwere gị ukwe otito oge niile

Ndị ike ha si na gị bụ ndị agọziri agọzi,

ka ha na-aga ike ha na-abawanye. Azịza

4. N’ihi Osebụrụwa Chineke bụ anyanwụ na onye nchekwa anyị;

Ọ na-enye anyị iheọma na nsọpụrụ

Chineke anaghị egbochi iheọma ọbụla

n’ebe ndị na-eso ya nọ. Azịza

MBEKU – Ps. 119:135

Alleluia, Alleluia:

Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.

Alleluia

OZIỌMA – 6: 39-42

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu tụkwaara ha ilu sị, “Onyeisi o nwere ike idu onye isi? Ọ bụ na ha mmadụ abụọ agaghị adaba n’olulu? Nwaazụ anaghị aka onyenkuzi ya, ma onye ọbụla a kụziri ihe nke ọma ga-adị ka onyenkuzi ya.

Ma gịnị mere i ji hụ irighiri ahịhịa dị n’anya nwanne gị ma ị hụpụtaghị ibe osisi dị n’anya nke gị? Mọbụ olee otu i si nwe ọnụ ịsị nwanne gị, nwanne m ka m tụchapụ gị irighiri ahịhịa dị gị n’anya, mgbe gị onwe gị na-achọpụtaghị ibe osisi dị n’anya gị?

Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ tụchapụ ibe osisi dị n’anya gị, mgbe ahụ, ị ga-ahụcha ụzọ nke ọma ịtụchapụ irighiri dị n’anya nwanne gị.”

Igbo Mass Readings for September 14 2024, Emume Mmeri nke Obe

Igbo Mass Readings for September 13 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 12, 2022