Igbo Mass Readings for September 26 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 26 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hagaị
N’afọ nke abụọ nke onyeeze Darius, n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa asaa, okwu nke Yahweh si n’ọnụ onye amụma Hagaị kwuru sị, “Ugbu a gwa Zerubabel nwa Shialtiel onyeisi ọchịchị nke Juda, gwakwa Jọshụa nwa Jehozadak onyeisi ụkọchukwu nakwa ndị niile fọdụrụnụ okwu sị, O nwere onye fọdụrụ n’ime ụnụ hụrụ ụlọnsọ a oge ọ nọ n’ebube ya mbu?
Kedụ ka I si ahụ ya ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị ka ihe efu n’ihu ụnụ? Ma ugbu a obi sie gị ike Zerubabel! Ọ bụ Yahweh na ekwu. Obi sie gị ike Jọshụa nwa Jehozadak onyeisi ụkọchukwu; obi sie ụnụ ike mmadụ niile nọ n’obodo ahụ!, Ọ bụ Yahweh na-ekwu; rụọnụ ọrụ n’ihina anọnyeere m ụnụ, ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na ekwu.
Mmụọ m nọ n’etiti ụnụ, egwu atụla ụnụ! N’ihina Yahweh nke igwe ndịagha kwuru nke a: oge na-adịghị anya, aga m akwagharị eluigwe na ala, osimiri na ala kpọrọ nkụ.
Aga m akwagharị mba niile, akụ ha ga-abịa jupụta ụlọnsọ a. Aga m eme ụlọnsọ a ka o jupụta n’ebube, ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu. Ọlaọcha bụ nke m, ọlaedo bụkwa nke m. Ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu.
Ebube nke ụlọnsọ ọhụrụ a ga-akarị nke ochie. Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu; n’ebe a ka m ga-enwe ọganiihu, ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 43:1, 2, 3, 4
Azịza: Nwee nchekwube na Chineke, aga m etokwa ya ọzọ, onye nzọpụta m na Chineke m
1. Chekwaba m Chineke, gbuoro m ọgụ
N’aka ndị na-enweghị obi ebere
Zọpụta m n’aka ndị nrafu na ndị aghụghọ, O Chineke. Azịza
2. Ọ bụ gị Chineke bụ ebe mgbaba m
gịnị mere i ji hapụ m?
Gịnị mere m ji na-agagharị na-eru uju,
ndịiro m were na-emegide m? Azịza
3. Zipụta ihe gị na eziokwu gị ka ha na-edu m,
Ka ha dubata m n’ugwu gị dị nsọ
ebe i jiri mere ebe obibi. Azịza
4. Mgbe ahụ aga m aga n’ebe nchụaja nke Chineke,
Chineke nke bụ añụrị m
Aga m eji añụrị were ụbọ too gị
Onyenweanyị, Chineke m. Azịza
MBEKU – 1 Thess. 2:13
Alleluịa, Alleluịa:
Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe Ọ bụ n’onwe ya okwu nke Chineke.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:18-22
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
O ruo mgbe Jesu nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Jesu jụọ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na m bụ?”
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu. Ụfọdụ na-asị na ị bụ Elaịja, ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwukwa na out n’ime ndị amụma mgbe ochie esila n’ọnwụ bilie.”
O wee jụọ ha sị, “Ma onye ka ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nke Chukwu.”
Ma Jesu dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị, nyesie ha iwu ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe a, sị, “Nwa nke mmadụ ahụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ.
Ndị okenye ndị Juu, na ndịisi nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya. A ga-egbukwa ya, na n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.