Igbo Mass Readings for September 27 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for September 27 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 27 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-11

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ecclesiastes

Ihe ọbụla n’okpuru eluigwe nwere oge, e nwere oge maka ọrụ ọbụla. Oge ọmụmụ nwa na oge onwụ; oge ọkụkụ ihe ubi na oge owuwe ya; Oge igbu egbu na oge ọgwụgwọ, oge ntikpọ na oge mwulite.

Oge ibe akwa na oge ịchị ọchị; oge iru ụjụ na oge ịgba egwu; Oge ịtụfụ okwute ntụtụkọta okwute; mgbe e ji obiọma na mgbe e jịghị obiọma.

Mgbe e ji achọ ihe na e ji atụfụ, oge ndozi na oge ntufu. Oge ndọkwa na oge ndụkọta; oge ịgba nkịtị na oge ikwu okwu.

Oge ịhụnanya na oge ịkpọasị; oge ọgụ na oge udo. Kedụ uru onyeọrụ nwere na ndọlị ya? Ahụla m ọrụ nke Chineke nyere ụmụmmadụ ka ha na-arụ.

O meela ihe ọbụla ka ọ dị mma n’oge ya. Nke ọzọ, o meela ka mmadụ mata ihe bụ ebighịebi ma nke a emeghị ka mmadụ chọpụta ihe Chineke megorori site na mbido ruo na ngwụcha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 114:1-2, 3-4.

 Azịza: Ngọzị dịrị Osebụrụwa, nkume m.

1. Ngọzị dịrị Osebụrụwa nkume m

ọ bụ ya bụ ịhụnanya m na onye nkwado m

ụlọ mgbaba m na onye nzọpụta m

ọ  bụ na ya ka m na-ezo onwe m ekpeke m. Azịza.

2. Osebụrụwa gịnị ka mmadụ bụ I ji na-eleta ya anya?

Nwa nke mmadụ nke I ji na-elekọta ya anya?

Ndụ mmadụ dịka otu nkume

ụbọchị ndụ ya niile dịkwa ka onyinyo. Azịza.

MBEKU – 1 Thess. 2:13

Alleluịa, Alleluịa:

Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe Ọ bụ n’onwe ya okwu nke Chineke.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:18-22

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

O ruo mgbe Jesu nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Jesu jụọ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na m bụ?”

Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu. Ụfọdụ na-asị na ị bụ Elaịja, ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwukwa na out n’ime ndị amụma mgbe ochie esila n’ọnwụ bilie.”

O wee jụọ ha sị, “Ma onye ka ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nke Chukwu.”

Ma Jesu dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị, nyesie ha iwu ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe a, sị, “Nwa nke mmadụ ahụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ.

Ndị okenye ndị Juu, na ndịisi nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya. A ga-egbukwa ya, na n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 27 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Lector

Catholic Lector is the founder of Catholic Lectionary. He is a passionate Writer, a Web Developer, a Computer expert and a part-time Blogger who loves to write a lot of contents on Catholicism in his free time. He is also the co-founder of the price review website: https://jumiaprice.com; where he shares a lot of product price contents.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Catholic Lectionary
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.
Shopping cart