Igbo Mass Readings for October 24 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 24 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:18-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Ama m na e nweghị ihe dị mma bi n’ime m, ya bụ, n’ime anụahụ m. Enwere m ike iche echiche ime iheọma ma anaghị m emeli ya. Ezi ihe nke na-agụ m agụụ ime, ka m anaghị eme.

Ọ bụrụ na ihe m achọghị ime ka m na-eme, o gosiri na ọ bụghị m na-eme ha n’ime m. Kama njọ nke dị n’ime m na-arụpụta ha. N’eziokwu, nke a dịzi ka ọ bụ iwu: Na mgbe ọbụla m chọrọ ime ezi ihe, ihe ọjọ na-akara m mfe.

N’ime obi m, ana m enwe mmasị n’iwu Chineke, ma ana m ahụ n’anụahụ m na-eso iwu ọzọ dị iche, nke na-alụ ọgụ megide iwu nke ime obi m. Ọ bụ nke a mere ka m bụrụ ohu nke njọ bi n’anụahụ m.

Ah! Onye hụjurula anya ka m bụ, onye ga-azọpụta m n’anụahụ m nke a na-eduba n’ọnwụ? Ekele dịrị Chineke site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi! Otu ọ dị, ana m efe iwu nke Chukwu n’ime mmụọ m, ma anụahụ m na-efe iwu nke njọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 119: 66, 68, 76, 77, 93, 94

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

1. Kụziere m ikpe ziri ezi na amamihe

maka na m kwere n’iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

2. Ị dị mma na-emekwa ihe dị mma

kụziere m iso ụzọ gị.

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

3. ka ịhụnaanya gị kwụdosiri ike dị njikere ịtasị m obi,

dịka nkwa I kwere nwodibo gị siri dị.

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

4. Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ,

n’ihina iwu gị na-atọ m ụtọ.

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

5. Agaghị m echezọnata iwu gị,

n’ihina ọ bụ site na ya ka i si enye m ndụ.

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

6. Abụ m nke gị, zọpụta m,

Maka ana m edobe iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị

MBEKU – Ps. 27:11

Alleluịa, Alleluịa:

Kụziere m ụzọ gị O Dinwenụ. Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:54-59

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe ọbụla ụnụ hụrụ urukpu ka o si n’ọdịda anyanwụ na-arịgo, ụnụ na-ekwu ozigbo sị, ‘Mmiri ozuzo na-abịa’; ọ na-emekwa otu ahụ ụnụ siri kwuo.

Mgbe ụnụ hụkwara ikuku si na ndịda ugwu ka ọ na-eku, ụnụ na-asị, ‘Oke ekpomọkụ ga-adị’; ọ na-emekwa otu ahụ. Ụnụ ndị abụọ!

Ụnụ maara out e si akọwa ihu ụwa na ihu igwe, gịnị mere na ụnụ amaghị otu e si akọwa ihe na-eme n’oge a? Gịnị mere na ụnụ anaghị ekpebiri n’onwe ụnụ ihe dị mma?

Ka gị na onye gbara gị akwụkwọ na-aga n’ụlọikpe, gbaa mbọ ka gị nay a kpezie n’ụzọ tupu okwu eruo na ntị onye ọkaikpe,

ka ọ ghara ịdọkpụrụ gị nye onye ọkaikpe, onye ọkaikpe arara gị nye onye nlekọta ụlọ mkpọrọ, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ akwaba gị n’ụlọ mkpọrọ.

Agwa m gị, ị gaghị esi n’ebe ahụ pụta ruo mgbe ị ga-akwụghachi, ọ bụladị ego nta ikpeazụ I ji n’ụgwọ.”

Igbo Mass Readings for October 25 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 24 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.