Ñụrịanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri
O jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ were tọọ ntọala ocheeze ya.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume
2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ n’ihu Onyenweanyị
N’ihu Dinwenụ nke ụwa niile
Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya
mba niile na-ahụkwa otito ya.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume
3. Onyenweanyị na-ahụ ndị niile kpọrọ ihe ọjọọ asị n’anya,
ọ na-echekwaba ndị niile kwere na ya,
ọ na-azọpụtakwa ha n’aka ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume
4. Ihe na-achakwasị ndị na-akwụba aka ha ọtọ,
Añụrị na-adịrị ndị obi ha dị ọcha.
Ñụrịanụ n’Onyenwanyị ụnụ bụ ndị eziomume,
tookwanụ aha ya dị nsọ.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume
Alleluia, Alleluia:
Okwu gị bụ mpanaka na edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.
Alleluia.
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Alaeze eluigwe dịka ụmụagbọghọ iri ndị buuru iteọkụ ha gaba izute nwoke na-agba akwụkwọ. Ise n’ime ha bụ ndị nzuzu ma ise ndị ọzọ nwere uche.
Ndị nzuzu ahụ buuru iteọkụ ha n’ejighị mmanụọkụ. Ma ndị ahụ maara ihe buuru iteọkụ na mmanụọkụ ha. Mgbe onye na-agba akwụkwụ apụtaghị ngwangwa, ụra tụbara ha, ha wee rahụ.
N’etiti abalị, mkpu dara sị, ‘Leenụ onye na-agba akwụkwọ pụtanụ ka ụnụ zute ya! Mgbe ahụ ụmụagbọghọ ndị ahụ niile biliri wee gbalie ọkụ ha.
Ndị nzuzu ahụ gwara ndị nwere uche sị, ‘Biko, nyetụnụ anyị mmanụ ụnụ n’ihina ọkụ anyị na-anyụ anyụ.’ Ma ndị ahụ nwere uche zara sị, ‘Eleghị anya, mmanụ anyị ji agaghị ezuru anyị na ụnụ.
Kama gaanụ zụrụ nke ụnụ n’aka ndị na-ere ya.’ Onye na-agba akwụkwọ batara mgbe ha jere ịzụta mmanụ. Ndị dị njikere soro ya banye n’oriri agbamakwụkwọ e wee mechie ụzọ.
E mechaa ụmụagbọghọ ise ndị ọzọ ahụ abịaruo na-arịọ sị, ‘Onyenweanyị, Onyenweanyị, megheere anyị ụzọ!
Ma ọ zara ha sị, ‘Ana m agwa ụnụ eziokwu, amaghị m ndị ụnụ bụ.’ Ya bụ na-echenụ nche n’ihina ụnụ amaghị ụbọchị mọbụ oge ọ ga-abụ.”
Igbo Mass Readings for August 29 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.