Igbo Mass Readings for August 30 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 30 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:17-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

N’ihina Kristi eziteghị m ime ndị mmadụ baptiizim, kama o zitere m ka m kwusaa oziọma. Ọ bụghị site n’oke amamihe na asụsụ dara ụda nke ụwa a, nke apụghị ịkọwapụta obe Kristi.

N’ihina okwu maka ọnwụ Kristi n’elu obe bụ akụkọ nzuzu n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ. Ma ọ bụụrụ anyị, bụ ndị nọ n’ụzọ nzọpụta, ike nke Chineke.

N’ihina e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ sị, “Aga m ala amamihe nke ndị maara ihe n’iyi, aga m emekwa nghọta nke ndị nwere nghọta ka ọ ghara ịba uru.” Olee ebe ndị oke amamihe nọ?

Olee ebe ndị odeakwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Ụnụ ahụla ka Chineke si gosipụta na amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu!

Ọ bụrụ na ọ bụ uche Chineke ka ndị mmadụ ghara isi n’amamihe nke mmadụ mata Chineke, Ọ bụ ka e site n’oziọma ahụ nke ndị mmadụ na-ewe ka ihe nzuzu zọpụta ndị kwere ekwe.

Ndị Juu na-achọ ihe ọrụebube dị icheiche ha ga-ahụ kwere, ndị Grik na-achọ amamihe. Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kristi, onye a kpọgburu n’obe, onye bụ ihe mgbochi n’ebe ndị Juu nọ, bụrụkwa ihe nzuzu n’anya ndị mba ọzọ,

ma n’ebe ndị niile Chineke kpọrọ nọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, Kristi bụ ike na amamihe nke Chineke. N’ihina nzuzu nke Chineke karịrị amamihe nke mmadụ, adịghị ike nke Chineke karịkwara ịdị ike nke mmadụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:1-2, 4-5, 10-11

Azịza: Ịhụnaanyị nke Onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

1. Tierenụ Chineke mkpu ọñụ ndị eziomume,

n’ihina otito kwesịrị ndị obi ha kwụ ọtọ

Werenụ ụbọ akwara too Chineke;

werenụ une kụọrọ ya egwu. Azịza

2. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu

Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.

Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,

ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa. Azịza

3. Ọ na-emebi atụmaatụ mba niile

Ọ na-eme ka echiche ha laa n’iyi.

Mana atụmaatuụ Chineke ga-adị ọkpụ

Echiche obi ya niile ga-adị ebeebe. Azịza

MBEKU – Ps 119:105

Alleluia, Alleluia:

Okwu gị bụ mpanaka na edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluia.

OZIỌMA – 25:1-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Alaeze eluigwe dịka ụmụagbọghọ iri ndị buuru iteọkụ ha gaba izute nwoke na-agba akwụkwọ. Ise n’ime ha bụ ndị nzuzu ma ise ndị ọzọ nwere uche.

Ndị nzuzu ahụ buuru iteọkụ ha n’ejighị mmanụọkụ. Ma ndị ahụ maara ihe buuru iteọkụ na mmanụọkụ ha. Mgbe onye na-agba akwụkwụ apụtaghị ngwangwa, ụra tụbara ha, ha wee rahụ.

N’etiti abalị, mkpu dara sị, ‘Leenụ onye na-agba akwụkwọ pụtanụ ka ụnụ zute ya! Mgbe ahụ ụmụagbọghọ ndị ahụ niile biliri wee gbalie ọkụ ha.

Ndị nzuzu ahụ gwara ndị nwere uche sị, ‘Biko, nyetụnụ anyị mmanụ ụnụ n’ihina ọkụ anyị na-anyụ anyụ.’ Ma ndị ahụ nwere uche zara sị, ‘Eleghị anya, mmanụ anyị ji agaghị ezuru anyị na ụnụ.

Kama gaanụ zụrụ nke ụnụ n’aka ndị na-ere ya.’ Onye na-agba akwụkwọ batara mgbe ha jere ịzụta mmanụ. Ndị dị njikere soro ya banye n’oriri agbamakwụkwọ e wee mechie ụzọ.

E mechaa ụmụagbọghọ ise ndị ọzọ ahụ abịaruo na-arịọ sị, ‘Onyenweanyị, Onyenweanyị, megheere anyị ụzọ!

Ma ọ zara ha sị, ‘Ana m agwa ụnụ eziokwu, amaghị m ndị ụnụ bụ.’ Ya bụ na-echenụ nche n’ihina ụnụ amaghị ụbọchị mọbụ oge ọ ga-abụ.”

Igbo Mass Readings for August 31 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 30 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume

Last Update: September 11, 2022