Igbo Mass Readings for August 25 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 25 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1, 3-6, 14-16,22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwo Rut

O ruru otu mgbe, n’oge Ndịikpe, oke ụnwụ dara n’ala Izrel. Ya mere otu nwoke onye Betlehem nke Juda kpọọrọ nwunye ya na ụmụ ya nwoke abụọ jee biri n’ala Moab.

Aha nwoke ahụ bụ Elimelek, aha nwunye ya bụ Naomi; aha ụmụ ya abụọ Maalọn na Chịliọn. Ha bụ ndị ọnụmara Efrat dị na Betlehem nke Juda.

Elimelek mechara nwụọ, hapụ nwunye ya bụ Naomi na ụmụ ya nwoke abụọ. Ụmụ ya nwoke abụọ ahụ lụrụ ụmụagbọghọ ndị Moab, ndị aha ha bụ Ọpa na Rut.

Ha biri n’ebe ahụ afọ iri. E mechaa Maalọn na Chịliọn nwụkwuo, hapụ nne ha bụ Naomi. Nwaanyị ahụ wee gbara aka dị na aka ụmụ. Mgbe nwa oge gachara, Naomi nụrụ na Yahweh agọziela ndị be ha nye ha nri.

O wee jikere ya na ndị nwunye ụmụ ya abụọ ịlaghachi ala Juda. Ha wee bilie ije, ịlọta n’ala Juda. Ma mgbe ha nọ n’ụzọ, ọ gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ sị, “Laghachinụ n’ụlọ nne ụnụ.

Yahweh gosịkwa ụnụ afọọma dịka ụnụ siri gosi mụ na ụmụ m abụọ nwụrụ anwụ. Yahweh mekwaa ka ụmụ chọta di, birikwa n’ezinụụlọ nke aka ụnụ n’udo!”

Naomi wee susuo ha ọnụ, sị ha gaa nke ọma. Ma ha bere akwa nke ukwu wee sị ya, “Anyị agaghị ala anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị be ụnụ.”

Ma Naomi gwara ha sị, “Ụmụ m ụnụ ga-ala! N’ihi gịnị ka ụnụ ga-eji eso m laa? Ụnụ chere na aga m amụtalị ụmụnwoke ọzọ, ndị ga-alụ ụnụ? Ya mere laanụ ụmụ m!

Aghọọla m agadi. Agafekwaala m oge ịlụ di. A sịgodu na enwere m olileanya; ọ bụrụkwa na nwoke alụọ m n’abalị taa, mụ mụta ụmụ, ụnụ ga-echegide ruo mgbe ha tolitere?

Ụnụ ga-ekwo n’ihi ha hapụ ịlụrụ di ọzọ? Mba, ụmụ m! Ọ na-egbu m mgbu n’obi nke ukwu n’ihi ụnụ karịa ka ọ na-egbu ụnụ, n’ihina ọ masịla Yahweh inye m ahụhụ.”

Ha bekwara akwa nke ukwu ọzọ. Ọpa wee susuo nne di ya ọnụ sị ya laa nke ọma, wee laghachikwuru ndị be ha. Ma Rut makụsiri nne di ya ike.

Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, Ọpa, bụ nwunye di gị, alaghachikwurula ndị be ha, na chi ha. Ya mere, soro ya lawa. Rut wee sị ya, “Arịọla m ka m hapụ gị!

Arịọla m ka m si n’iso gị laghachi azụ, n’ihina aga m eso gị ebe ọbụla ị na-eje. Ebe ọbụla I bi ka m ga-ebikwa. Ndị nke gị ga abụ ndị nke m. Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.

Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ. Ebe e liri gị ka a ga-elikwa m. Ka Chineke gbuo m ma ọ bụrụ na m kwenye ka ihe ọbụla ọzọ na-abụghị ọnwụ kewapụ m n’ebe ị nọ!

Otu a ka Naomi si lọta njem o jere na Moab ya na nwunye nwa ya bụ Rut onye Moab. O bụkwa n’oge mmalite owuwe ihe ubi ka ha lọtara na Betlehem.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 146:5-6, 7, 8-9, 9-10

Azịza: Mkpụrụobi m too Dinwenụ         

1. Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb

dịka onye enyemaka ya;

Onye kere eluigwe na ala

nakwa oke osimiri na ihe niile bi n’ime ya. Azịza

2. Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi ebeebe.

Ọ na-enye ndị a na-emegbu emegbu ikpe nkwụmọtọ.

Ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri

Ọ na-emekwa ka ndị eji eji nwere onwe ha. Azịza

3. Onyenweanyị na-eme ka ndịisi hụ ụzọ

Ọ na-ebulite ndị ibu arọ nyịdara n’ala

Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa

Ọ na-echekwaba ndị na-enweghị nne na nna na ndị ajadu. Azịza

4. Onyenweanyị hụrụ ndị eziomume n’anya

Onyenweanyị na-eme ka ihe siere ndị obi ọjọọ ike

Onyenweanyị ga-achị eze ebeebe

Chineke gị, O Zayọn,

ga-achị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. Azịza

MBEKU – 1 Sam 3:9; Jọn 6:69

Alleluia, Alleluia:

Kwuwe onyenwe m nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 22:34-40

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ndị Farisii nụrụ na Jesu emechiele ndị Sadusii ọnụ, ha gbakọtara otu ebe. Otu onye n’ime ha bụ onye ọkaiwu jụrụ ya ajụjụ iji nwalee ya sị, “Onye nkuzi, olee iwu kachasị iwu niile?

Jesu zara ya sị, “Ị ga-eji obi gị niile mmụọ gị niile na uche gị niile hụ Chineke gị n’anya. Nke a bụ nke mbụ na nke kachasị n’iwu niile.

Nke abụọ dịkwa ka ya, ị ga ahụ onye agbataobi gị n’anya dịka I siri hụ onwe gị. N’iwu abụọ ndị a ka iwu niile na amụma niile gbakwasịrị ụkwụ.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for August 25 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022