Igbo Mass Readings for August 23 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 23 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 37:1-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

Aka nke Dinwenụ bagidere m, o wee dupụta m n’ike, mmụọ nke Yahweh duruo m n’etiti ndagwurugwu, nke jupụtara n’ọkpụkpụ, O duru m jegharịa ha gburugburu.

Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ nke dị ọtụtụ n’ọnụọgụgụ ka ha gbasara n’ime ndagwurugwu. O wee jụọ m sị, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha nwere ike ịdị ndụ?”

M zaghachiri, “Dinwenụ, ọ bụ naanị gị maara.” Ọzọ, ọ sịrị m “Buoro ọkpụkpụ ndị a amụma sị ha, ‘ụnụ ọkpụkpụ kpọrọ nkụ nụrụnụ okwu nke Dinwenụ.””

Otu a ka Yahweh Chineke gwara ọkpụkpụ ndị a: ‘Lee aga m eme ka ume ndụ banye n’ime ụnụ, ụnụ ga-adịkwa ndụ.

Aga m emekwa ka anụ ahụ bịakwasị ụnụ, aga m ejikwa akpụkpọ ahụ yikwasa ụnụ, mee ka ume ndụ dị n’ime ụnụ, ụnụ ga-adịkwa ndụ, ụnụ ga-amara na m bụ Dinwenụ.’

N’ihi ya eburu m amụma dịka e si nye m n’iwu, ka m na-ebu amụma, ụzụ dara, mkpọtụ dakwara ka ọkpụkpụ ndị a na-ejikọta onwe ha ọnụ.

Ka m na-ele anya ahụrụ m akwara na anụ ahụ bịakwasịrị ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara ha ma o nweghị ume ndụ dị n’ime ha.

O wee gwa m sị, ‘Buoro ikuku amụma, nwa nke mmadụ, ma gwa ya sị otu a ka Yahweh Chineke kwuru: si n’akụkụ anọ nke ụwa, gị ume ndụ kukwasa ndị a e gburu egbu ka ha dị ndụ ọzọ.’

N’ihi ya, eburu m amụma dịka o nyere m n’iwu, ume ndụ banyere n’ime ha, ha dịkwara ndụ ọzọ, guzoro n’ụkwụ ha wee bụrụ oke igwe ndịagha.

Mgbe ahụ ọ gwara m sị, “Nwa nke mmadụ ọkpụkpụ ndị a bụ ezinụụlọ Izrel. Lee, ha na-ekwu na-asị, ọkpụkpụ anyị akpọọla nkụ, ntụkwasịobi anyị alaala n’iyi, e gbupụla anyị n’ezie.

N’ihi ya, buo amụma ma gwa ha sị, “otu a ka Yahweh Chineke kwuru: ‘Lee ana m aga imepe ili ụnụ ma site n’ime ya kpọpụta ụnụ, ụnụ ndị nke m, aga m edula ụnụ n’ala nke Izrel.

Ụnụ ga-amatakwa na m bụ Dinwenụ mgbe m mepere ili ụnụ ma kpọpụta ụnụ site n’ime ya, ụnụ ndị nke m.

Aga m etinye mmụọ m n’ime ụnụ, ụnụ ga-adịkwa ndụ, a ga edote ụnụ n’ala nke aka ụnụ, mgbe ahụ ụnụ ga-amata na m bụ Dinwenụ ekwuola ma meekwa nke a,”” ọ bụ Dinwenụ na-ekwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 107:2-3, 4-5, 6-7, 8-9

Azịza: Alleluia! Nye Onyenweanyị ekele, ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

1. Ka ihe ndị a bụrụ okwu nke ndị Onyenweanyị gbapụtara,

Ndị ọ zọpụtara site n’aka nke ndị na-emegide ha.

Site n’isi n’obodo ndịọzọ kpọlata ha ụloọ,

bido n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ,

bido na mgbago ruo na ndịda. Azịza

2. Ụfọdụ agahiela ụzọ ha n’ime oke ọhịa na ọzara,

ha amaghịkwa otu ha ga-esi rute obodo ndị mmadụ bi na ya.

Agụụ gụrụ ha, akpịrị mmiri kpọsikwara ha nkụ ike.

Obi bidoro daba ha mba. Azịza

3. Mgbe ahụ ha kpọkuru Yahweh na nsogbu ha,

ọ zọpụtara ha n’ahụhụ ha niile,

na-edu ha site n’okporoụzọ gabara ozigbo

n’obodo ndị mmadụ bi na ya. Azịza

4. Ka ndị a kelee Onyenweanyị n’ihi ịhụnaanya ya,

n’ihi ọrụ ịtụnaanya ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ,

Ọ na-enyeju ndị agụụ na-agụ afọ,

Were iheọma nyejuo ndị nọ na mkpa afọ. Azịza

MBEKU – 1 Sam 3:9; Jọn 6:69

Alleluia, Alleluia:

Kwuwe onyenwe m nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 22:34-40

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ndị Farisii nụrụ na Jesu emechiele ndị Sadusii ọnụ, ha gbakọtara otu ebe. Otu onye n’ime ha bụ onye ọkaiwu jụrụ ya ajụjụ iji nwalee ya sị, “Onye nkuzi, olee iwu kachasị iwu niile?

Jesu zara ya sị, “Ị ga-eji obi gị niile mmụọ gị niile na uche gị niile hụ Chineke gị n’anya. Nke a bụ nke mbụ na nke kachasị n’iwu niile.

Nke abụọ dịkwa ka ya, ị ga ahụ onye agbataobi gị n’anya dịka I siri hụ onwe gị. N’iwu abụọ ndị a ka iwu niile na amụma niile gbakwasịrị ụkwụ.”

Igbo Mass Readings for August 24 2024, Emume Ncheta Bartholomew dị Asọ – Nwaazụ

Igbo Mass Readings for August 23 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022