Igbo Mass Readings for December 1 2023, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 1 2023, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:2-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel

Daniel hụrụ ọhụ n’abalị wee hụ ka oke ikuku anọ nke eluigwe na-ebugharị nnukwu osimmiri. Mgbe ahụ, ahụrụ m anụọhịa anọ buru ibu dịkwa icheiche ka ha si n’ime osimiri ahụ wee pụta. Nke mbụ dị ka ọdụm, nweekwa nku ugo.

Mgbe m nọ na-ele anya, a nyakapụrụ nku ya, kwụwa ya n’elu ala, mee ka ọ kwụrụ n’ụkwụ abụọ ka mmadụ. E nyekwara ya mmụọ nke mmadụ. Anụ ọhịa nke abụọ dị ka nkịta ọhịa.

E welitere ya elu n’otu akụkụ, ọ kpụ mkpịsị ngụgụ atọ n’ọnụ ya n’etiti eze ya. A gwara ya sị, ‘Kulie rie ọtụtụ anụ. Ka nke a gachara, elere m anya hụkwa anụọhịa ọzọ yiri agụ.

O nwere nku anọ n’azụ ya, nweekwa isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. Ka nke a gachara, ahụkwara m, ime nrọ ahụ, anụọhịa nke anọ ka o si n’ime oke osimiri ahụ na apụta.

Anụọhịa nke a na-eyi egwu, na-emenyekwa ụjọ; o sikwara nnukwu ike, nweekwa nnukwu eze igwe. Ọ dọriri ihe ọbụla o jidere, rie ya ma zọpịachaakwa nke fọdụrụ.

Ọ bụ anụọhị a pụrụ iche n’ebe anụ ndịọzọ nọ. O nwekwara mpi iri. Mgbe m nọ na-ele mpi iri a dị n’isi ya anya, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwara n’etiti ha pupụta.

Mgbe mpi a na-apụta, ahụrụ m ka o fopụrụ mpi atọ n’ime mpi iri ahụ buru ụzọ dịrị, iji mee ka mpi ntakịrị a nweta ohere ebe ọ ga-esi pụta. Mpi a nwere anya dịka anya mmadụ, na ọnụ jupụtara na nganga.

Ka m na-ele anya, ahụrụ m ka e doziri ocheeze, onye ahụ dịnụ site na mbụ weere oche ya, uwe ya na-acha ka akụmmiriigwe, ntụtụisi ya na-achakwa ka owu ọcha.

Ocheeze ya bụ ire ọkụ, ụkwụ ya bụkwa ọkụ na-enwu enwu. Nnukwu ire ọkụ si n’ebe ọ nọ wee na-apụta, puku kwuru puku ndị mmụọozi nọ ya gburugburu imere ya ihe ọbụla ọ chọrọ.

Otu a kwa ka nde kwuru nde mmadụ siri kwụrụ ya n’ihu, na-eche ka o kpee ha ikpe. Ọ dịghị anya, e bido ikpe ikpe, wee meghee akwụkwọ ikpe. Elegharịrị m anya n’ihi mkpọtụ nke mpi ahụ na-eme ngala na-eme.

Ka m na-ele anya, ahụrụ m ka e gburu anụọhịa ahụ, gburichaa ahụ ya, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. Gbasaara ụmụ anụọhịa atọ ndịọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa n’ihu nwa ntakịrị oge.

Ahụkwara m na nrọ ahụ, onye dịka nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’urukpu ojii. Ọ bịara n’ebe onye ahụ dị na mbụ nọ, e duga ya n’ihu ya. E nyere ya ike ọchịchị na otito na alaeze, ka mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile wee gbaara ya odibo. Ọchịchị ya enweghị njedebe, ọ gaghị agafe agafe nke a ga-emebi ya emebi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3:75, 76, 77, 78, 79, 80, 81

Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.

1. Ugwu ukwu na ugwu nta niile gọzienụ Yahweh,

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

2. Ihe niile na-eto eto n’ụwa gọzienụ Yahweh

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza.

3. Mmiri niile si n’okwute agbapụta gọzienụ Yahweh.

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

4. Mmiri ukwu na mmiri nta niile gọzienụ Yahweh

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

5. Anụ mmiri na ihe niile bi na mmiri gọzienụ Yahweh.

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

6. Nnụnụ niile bi n’igwe gọzienụ Yahweh

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

7. Anụ niile bi n’ọhịa na ndị bi n’ụlọ gọzienụ Yahweh

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

MBEKU – Matiu 24:42, 44.

Alleluịa, Alleluịa:

Na-echenụ nche, dịrị kwanụ njikere n’ihina ụnụ amaghị oge nwa nke mmadụ ga-abịa.

Alleluịa.

OZIỌMA – 21:29-33.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu tụkwaara ha ilu a: “Leenụ osisi fiig na osisi ndịọzọ, mgbe ọbụla ụnụ hụrụ ka ha na-epupụta akwụkwọ ndụ ọhụrụ maranụ na udummiri adịla nso.

Otu aka ahụ, mgbe ọbụla ụnụ hụrụ ka ihe ndị a na-emezu maranụ na Alaeze Chineke dị nso.

N’eziokwu agwa m ụnụ, ọgbọ a agaghị agabiga maọlị, ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu. Eluigwe na ụwa ga-agabigakwa, ma okwu m niile agaghị agabiga ma ọlị.

Igbo Mass Readings for December 2 2023

Last Update: October 16, 2022